Nnamdi Kanu: Peter Obi, Abaribe, Victor Umeh bịara nkwanyeugwu na nke Eze Kanu
Ọtụtụ ndị nwere agba n'ala Igbo gara Afaraukwu ịkwanyere Eze Kanu na nwunye ya ugwu ikpeazụ.
Ụfọdụ ndị mere ya bụ njem bụ Peter Obi onye bụbu gọvanọ Anambra steeti ma zọọkwa dịka osote onyeisiala na pati PDP, Victor Umeh, onye bụbu Sinetọ Anambra Central na pati APGA na Sinetọ Abaribe nakwa ọtụtụ ndị ọzọ nwere agba n'ala Igbo.

Dịka ọ dị ugbua, ọ kpọtụwala n'Afaraukwu Ibeku dị n'Umuahia Abia Steeti ebe a na-eli nne na nna Nnamdi Kanu.
Ofufe nro maka olili ha na-aga n'ihu ugbua n'ụlọụka St. Andrews Anglican Church di n'Ibeku Afaraukwu.
Ọ bụ n'afọ 2019 ka Eze na Ugoeze Isreal Okwu Kanu nwụrụ mana ọ bu ugbua ka e yiri olili ha.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post, 2
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post, 4
Dịka omenala Igbo siri kwụrụ, Nnamdi Kanu bụ ọkpara nne na nna ya, kwesiri ili ha mana ọ pụrụ na Naijirịa kemgbe afọ 2017 dịka gọọmentị Naịjirịa na-ekpe ya ikpe.

Ha sị na ọ na-agba mgba okpuru megide ọchịchị gọọmenti Naịjirịa bụ nke Kanu sị na aka ya dị ọcha.
A na-ekwubu na Kanu nwereike ịlọta maka akwamozu a mana ahụbeghị ya anya .

Ọnu okwu ya na mgbasa ozi izipuru ụnyaahụ egosịghị na ọ ga-alọta.

Ebe foto si, Screen capture
Dịka ọ nọghị, nwanne ya nwoke bụ Emmanuel Kanu na ndi ụmụnna bụ ndị na-ahazi ya bụ akwamozu.
Ihe onyonyo no na soshal midi na-egoz ọtụtu ndi egwu na igwe mmadụ nọ n'ogigi Eze Kanu maka akwamozu a.
Mmọnwụ sokwa nọdụ ebe ahụ dika ụgbọala ndi uweojii na-agbagharị na mpaghara Afaraukwu.
Kemgbe izu a ka ndị mmadụ malitere na-abata Afaraukwu n'uju maka akwamozu a.










