Ụfọdụ nri e ji mara mpaghara dị iche iche n'ala Ịgbo

Ebe foto si, Screenshot
- Onye dere ya, Uzoamaka Ewuzie
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5
Na mba Naijirịa, ala Igbo so na ndị nwere ọtụtụ ihe oriri ndị mmadụ si n'agbụrụ dị iche iche nabatara ma na-erikwa n'ọgbakọ dị iche iche.
Ngwa soro anyị ka ị mata ọtụtụ nri e ji mara obodo dị iche iche n'ala Igbo.

Ofe olugbu
Ofe olugbu bụ ofe a ma ama n'ala Igbo. Ọtụtụ obodo dị iche iche na-eri ya, mana e ji ya mara ndị Anambra Steeti. Ndị Imo na-esi olugbo na achị ebe ndị Anambra na-esi onugbu na ede.
Ofe achara
Ofe achara bụ ofe a na-eji achara akaghị aka esi. Ndị Ụmụahịa na ndị Ngwa dị n'Abia Steeti na-erikarị ofe a.

Ofe akwụ
Ofe akwụ bụ ofe eji mara ndị Anambra na ndị Delta Steeti.
Ndị Anambra na-eji ofe akwụ eri osikapa ebe ndị Delta Steeti na-eji ya elo nri olulu. Ọ bụ kpụrụ akwụ bụ oke ihe eji si ya bụ ofe.
Akpụrụakpụ egusi na ọkazị
Akpụrụakpụ egusi na ọkazị bụ nri ọzọ e ji mara ndị Igbo. Ọ bụ ofe eji mara ndị Ụmụahịa isi obodo Abịa steeti.
Ofe ọkazị
Ọkazị bụ ofe eji mara ndị Owerri, ndị Mbaise n'Imo Steeti na ndị Abịa steeti. E ji akwụkwọ ọkazi esi ofe a, ụfọdụ na-eji egụsi nwere esi ya ebe ndị ọzọ na-ejị achị.
Akparata
Akparata bụ ofe eji mara ndị Ebonyi Steeti. A na-eji mkpụrụ Akparata n'akwụkwọ ụzụza ma ọ bụ ọha nwere esi ofe a.
Ofe egburuegbu
Ofe egburuegbu bụ nri eji mara ndị 'Edda' na ndị Afikpo n'Ebonyi Steeti.
Ihe eje esi ofe a bụ akwụkwọ ụgụ eji akanwụ nwee sie.

Ụgba na okporoko
Ụgba bụ nri e si na mkpụrụ ụgba eberebe. Ọtụtụ ndị mmadụ dị iche iche n'ala Igbo na-eri ụgba mana ọ bụ nri e ji mara ndị Imo na Abịa ọ kachasị ndị Owere na Mbaise.
Ndị Anambra na-etinye ụgba n'ime abacha mana ndị Owerri na Mbaise, na-eji okporoko ahazi ụgba ha.
Ofe ahụekere
Ofe ahụakere bụ nri e ji mara ndị dị iche iche n'obodo Naịjirịa mana e ji ofe a mara ndị Ebonyi steeti. Ihe e ji esi ya bụ ahụekere, ụgụ, ụtụrụkpa, ọha maọbụ olugbo.
Ofe Ụgbọghọrọ
Ofe a bụ nri amama n'Abia steeti. E ji ya mara ndị Abịrịba. Ọ bụ ọkụrụ ka esi ya ma jiri 'Asụsụ' nwee rie ya.
Asụsụ
Nke a bụ nri e ji mara ndị Abịrịba n'Abịa Steeti. O bụ ọka a gwọrọ agwọ tinye ya nnu na ose ma were akwụkwọ nri kee ya.

Ọkpa
Nke bụ eziokwu bụ na ọkpa bụ nri a ma ama n'ala Igbo niile mana ọ bụ nri e ji mara ndị Enugwu steeti. E ji mkpụrụ osisi a na-akpọ ọkpa esi ya.
Abacha
Abacha bụ nri ọzọ a ma ama n'ala Igbo. Ọ bụ akpụ e bere ebe. Ọ bụ nri e ji mara ndị Enugwu ọ kachasị ndị Nsukka ya na ndị Okigwe n'Imo steeti.
Ndị Nkanụ, Eziagụ, Udi n'Enugwu bụ ndị e ji esi abacha na akịdị mara.
Agbugbu na Achịcha
Nke a bụ nri e ji fịọ fịọ na ede e si. Ọ bụ nri ọzọ e ji mara ndị Enugwu steeti.
Ofe Nsala
Nke a bụ ofe ọzọ amama n'ala Igbo. Ọ bụ ndị Anambra na Delta steeti ka eji ya bụ ofe nwere mara.

Ofe ọha
Ofe ọha bụ ofe e ji mara ndị Igbo niile. Ndị Anambra na Enugwu na-eji ede esi ọha mana ndị Imo steeti na-eji achị esi ya ebe ndị Ebonyi na-eji akparata maọbụ ahụekere esi ya.
Ofe ụgbọgụrụ
Ofe ụgbọgụrụ bụ nri a ma ama n'Abịa steeti. Ọ bụ akwụkwọ ụgbọgụrụ bụ ihe e ji esi ya bụ ofe.
Nkwọbi
Nkwọbi bụ nri amama n'ala Igbo mana bụ karịrị ndị Anambra ka eji ya nwee mara. A na-ejikarị anụ ewu, ọkpa ehi ma ọ bụ anụ ndị ọzọ dị iche iche nwere esi ya.

Ebe foto si, ms_ofe akwu/Instagram
Ụkwa
Ụkwa bụ nri e ji mara ndị Anambra na ụfọdu ndị Imo steeti.
Isi ewu
Dịka aha ya siri dị, isi ewu bụ nri eji isi ewu na mmanụ nri na ihe dị ọzọ agwọ. O bụ nri a ma ama n'ala Igbo niile mana ndị Anambra na-eri karị ya.
Ụtara ede
Ụtara ede bụ nri e ji mara ndị Nnewi n'Anambra steeti. Ọ bụ akpụ na ede ka e ji esi ya.

Ebe foto si, Adline Okere
Ofe Owere
Ofe Owere bụ ofe e ji mara ndị Owere n'Imo steeti. Ọ bụ ọkazị na ọtụtụ anụ dị iche iche ka e ji esi ya. Ofe Owere bụ ofe ndị nere ego n'ala Igbo na-eri.
Maị maị ọka/Epiti
Maị maị ọka maọbụ Epiti bụ nrị e ji mara obodo dị iche iche n'ala Igbo. Ọ bụ ọka a kwọrọ akwọ ka e ji esi ya. Ọtụtụ obodo n'ala Igbo na-eri ya mana ọ bụ ndị Imo na Abịa ka e ji ya wee mara.









