Esi m n'ire nri n'okporoụzọ malite ụlọ oriri Ntachi Osa a na-anụ aha ya ugbua - Igwe Uche

Aha onyonyo, Esi m n'ire nri n'okporoụzọ malite ụlọ oriri Ntachi Osa a na-anụ aha ya ugbua - Igwe Uche
Esi m n'ire nri n'okporoụzọ malite ụlọ oriri Ntachi Osa a na-anụ aha ya ugbua - Igwe Uche

Igwe Uche, onye nwee ụlọ oriri a ma ama n'Enugwu bụ Ntachi Osa akọwaala etu o siri malite n'ire nri okporoụzọ a kpọro 'mama put' rute n'ogogo ọ nọ ugbua.

Na mkparịtaụka pụrụiche ya na BBC Igbo nwere, Uche kwuru na njem ya n'isi nakwa ire nri malitere ego ọ nọ na mahadum Enugu State University of Technology (ESUT).

O kwuru na o bidoro n'ire nri kwam kwam a kpọro 'noodles' n'ihu ụlọahịa mmadụ ma ọ gbasaa akwụkwọ na mgbede.

Uche kwuru na o mechara tinyezie nri ndị dịka osikapa, garri na ofe, na ihe ndị ọzo.

O kwuru na ọ nọgidere n'okporoụzọ ahụ ruo mgbe o nwetere ohere ịbanye n'ime ụlọahịa ma sizie ebe ahụ na-amụba.

O kọwaara na aha ụlọ oriri ya bụ 'Ntachi Osa' si n'okwu ndị mmadụ na-ekwukaarị mgbe ọbụla agụụ na-agụ ha.

Uche kwuru na ha nwere ụlọ oriri atọ ugbua n'Enugwu ma nwee olileanya ịmụbawanye.

O kwuru na oge ụfọdụ na ọ ka na-abanye n'usekwu ma sie nri na-agbanyeghi na o nwere ọtụtụ ndị na-arụrụ ya ọrụ.

O nyere ndị ntoroọbịa ndụmọdụ ka ha emela ụwa n'ike kama ka ha malite n'obere dịka o siri malite. Kirie ihe o kwuru n'uju;