Ọgba mbọ: Ọtụtụ ndị ekwenyeghi na nwaanyị dịka m ga-arụnwu 'gear box' ụgbọala - Chidera Ohiaeri

Aha onyonyo, Ọgbambọ: Ọtụtụ ndị ekwenyeghi na nwaanyị dịka m ga-arụnwụ 'gear box' ụgbọala - Chidera Ohi
Ọgba mbọ: Ọtụtụ ndị ekwenyeghi na nwaanyị dịka m ga-arụnwu 'gear box' ụgbọala - Chidera Ohiaeri
    • Onye dere ya, Ikechukwu Kalu na Amaka Bassey
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist & Video Journalist
    • Ebeg o si, Lagos, Nigeria

Nwada Chidera Nnabuihe Ohiaeri na-arụzi 'gear box' ụgbọala akọwaala etu o siri mwee mmasị n'ịrụ ọrụ mekanik.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Chidera kwuru na mmasị ya a, malitere mgbe ọ na-aga n'ụlọahịa ebe nne na nna na-ere akụrụngwa ụgbọala (spare parts) dị n'Aba.

O kwuru na ọ bụ nke ahụ mere o ji gaa na mahadum ma mụọ ihe banyere ụgbọala na ngalaba 'Mechanical Engineering'.

Chidera kwuru na o mere ọzụzụ 'Industrial Training (IT) na emume iji otu afọ efe ala nna (NYSC) ya n'ụlọọrụ ebe a na-arụ ọrụ mekalik.

"Mgbe m mechara NYSC, nne na nna jụrụ kedụ ọrụ m chọro ịrụ? Agwara m ha na ọ bụ mekanik ka m chọrọ ịrụ.

"Ha kpọgara m ka m gaa mụọ etu e si arụzị 'gear box'' bụ nke m mụrụ afọ, atọ malite na 2019 ruo 2022."

Ugbua Chidera na-arụziri ọtụtụ ndị mmadụ 'gear box' ụgbọala n'ụlọọrụ ya dị n'Aba.

Chidera alụọla di ma mụta ụmụ mana nke a anaghị egbochi ya itinye uchu n'ọrụ dịka o kwuru na di ya bụ onye o zutere mgbe ha na-amụ ọrụ na-enyekwara ya aka.

O kwuru na ihe na-ara ya ahụ n'ọrụ a bụ ọrụ ikike dị na ya ma kwuo na di ya na-enyere aka n'ịrụ ọrụ ndị ikike ahụ.

Ọ gara n'ihu kwuo na ọtụtụ ndị mmadụ kọrọ ya ọnụ oge ọ na-amụ ọrụ mekanik mana nke ahụ egbochighi ya maka na ọ maara ihe ọ na-achọ.

Chidera gwara ụmụnwaanyị ndị chọrọ ịrụ ụdịrị ọrụ ya ka ha bịa na ọ ga-anabata ma kụziere ha ọrụ.

O kwuru na ọ na-atụ anya imepe nnukwu ụlọọrụ mekanik bụ ebe ọ ga na-akụziri ọkachasị ụmụnwaanyị ọrụ.

Kirie ihe o kwuru n'uju;