Enwere m olileanya na ụgbọelu m rụrụ ga-efeli otu ụbọchị - Kenneth Akobundu
Kenneth Akobundu bụ nwaafọ Ehime Mbano.
Nrọ ya kwa ụbọchị bụ ka o nwee ike ịrụpụta ụgbọelu ga-efe nke ọma iji nyere ndị ọrụ ahụike aka n'oge gbatagbata.
Na mkparịtaụka ya na BBC, Kenneth Akobundu kwuru na ọ ga-amasị ya ịga mba ofesi ga mụọ ka e si arụpụta ụgbọelu, mana o nwebeghị enyemaka ọbụla.
Akobundu arụọla ma ụgbọala na-agba agba, ma ọgbatumtum nke o ji akpagharị n'obodo ya.

O nweghi onye ọbụla kuziere ya ihe ndị a, kama o ji aka ya mụta ha.
Akobundu kwuru na oge ụfọdụ, a na-egosi ya ihe ndị a na nrọ.

Lee ihe nkiri a dị n'elu n'uju.
Ndị mere akụkọ a bụ Chukwunaeme Obiejesi, Vining Ogu,na Chiemela Mgbeahuru.



