Drone Technology: 'Agaghị m ụlọakwụkwọ were mụta etu e si arụ 'drone' - Agbo Samson
Nwokoroọbịa Agbo Samson na-arụ igwe na-efe n'elu nke bekee kpọrọ Drone akọọla njem etu o siri bido na-agbanyeghị na ọ gaghị akwụkwọ maka ya.
O kwuru na ọ bụ na J.s.s 3 ka ọ malitere rụwa ya bụ drone.
Agbo kwuru na o nweghị ego mana o bidoro rụwazie nke ukwu na ngwụcha 2020.
O kwuru na uru drone ya ga-enyere na-ebugara ndị mmadụ ihe dịka kpachị kpachị na-enye nsogwu n'akụkụ Naịjirịa dị iche iche.
O kwuru na ọ bụ na intanet ka ọ na-azụta ụfọ̄dụ ngwaọrụ ya.