Fr Ebube Muonso: Gọọmentị kwesịrị iji 'sit-at-home' Nnamdi Kanu tinyere wee mụrụ akọ

Nnamdi Kanu na Fada Ebube Muonso

Emmanuel Obimma, ụkọchukwu ụka Katọlik e ji Ebube Muọnsọ mara, ekwuola na ihe mere n'ụbọdchị Mọnde n'ihi atụmatụ 'sit-at-home' Nnamdi Kanu tinyere, ekwesịla ịkuziri gọọmentị etiti ihe.

Ebube Mụọnsọ kwuru nke a n'ọgbakọ ekpere pụrụ iche o nwere n'ụbọchị Mọnde iji kpee ekpere maka ọgbaaghara na-ada n'elu n'ala na Naịjirịa.

N'ihe onyonyo ekpere a nke Fada Ebube Mụọnsọ tinyere na soshal midia ya, o kwuru na Nnamdi Kanu bụ nnukwu mmadụ nke a na-ahụbeghị ụdị ya n'ụwa a.

O kwuru sị: "Gọọmentị etiti ma ihe ha kwesịrị ime ka ọgbaaghara ndị a kwụsị, mana ha ma ụma na-eme ka ha amaghị."

"Ọ bụrụ na nghọta adịghị, udo agaghị adị."

"Achọrọ m ịgwa ụwa niile na Nnamdi Kanu bu nnukwu mmadụ. Ndị dịka ya ebughị ibu n'ụwa a."

"Naanị otu mkpụrụ iwu o nyere sị onye ọbụla nọrọ n'ụlọ, onye ọbụla edere duu."

Aha onyonyo, ' Ọ bụrụ na Naịjiria dị mma echeghi m na a ga-enwe IPOB' - Fr. Ebube Mmụọnsọ

"I lee anya, ọtụtụ ndị otu anyị anọghị ebe a ... n'ihi iwu Nnamdi Kanu nyere sị onye ọbụla 'sit at home'."

"Ihe m chọrọ ịgwa ndị mmadụ bụ na enwere mmụọ na-akwado okwu nnwereonwe Biafra a."

"Ya mere m ji arịọ gọọmentị etiti ka ha na ya nwee mkparịtaụka ugbua tupu ihe akawanye njọ."

Ebube Muonso

Ebe foto si, Ebube Muonso

Nkọwa foto, Ebube Mụọ nsọ

"Ọ bụghị oge niile ka ekwesịrị iji aka ike iji nweta udo."

"Gọọmentị etiti kwesịrị ịghọta nke a ma kpọghachi Nnamdi Kanu azụ iji nwee mkparịtaụka."

"Ọtụtụ mmadụ ejirila ndụ ha chụọ aja maka ndọrọndọrọ a, ya mere ọ gaghị adị mfe ịkwụsị."

"Ọtụtụ ka dịkwa njikere iji ndụ ha ghọrọ mgbọ iji chekwaa Nnamdi Kanu."

"Ike agwụla ndị mmadụ. Ọtụtụ enweghị ọrụ. Ọtụtụ ndị ntorobịa enweghizi olileanya."

Fada Ebube Mụọnsọ kwuru na ọ bụ otu a ka mba ụwa si gbachi Hitler nkịtị ruo oge o gburu ndị Juu karịrị nde isii.

Ọ gara n'ihu kwuo na ya na-ekpe ekpere ka udo na ịhụnanya chịa na Naịjirịa.

Ihe Ohaneze ndị Igbo kwuru maka 'sit-at-home' e mere n'ala Igbo ụnyahụ

Ndị Eze Igbo
Nkọwa foto, Ndị Eze Igbo

Onyeisi ọhaneze ndị Igbo bụ George Obiozor site n'ọnụ okwu okwu otu ahụ bụ Alex Ogbonna ekwuola na sit-at-home unyahụ gosiri na obi adịghị ndị Igbo mma maka mmegbu gọọmenti etiti na-emegbu ha.

Ogbonna kwuru na etu ndị Igbo si rube isi maka iwu onye nọrọ n'ụlọ ụnyahụ(May 31, 2021) gosiri na ndị Igbo ga-ejinwu otu obi mepụta ihe.

O kwukwara na ndị Igbo ji ohere ahụ wee chetekwa nwanne ha nwụrụnụ n'agha Biafra mere na 1967 ruo 1970.

Ogbonna kwuru na ndị Igbo enupughị ndị gọvanọ ọwụwa anyanwu isi site n'ime atụmaatụ 'sit-at-home' ndị Indigenous People wepụtara kamana ndị Igbo chọrọ ka ndị gọvanọ ha wegara Abuja ozi ha na obi adịghị ndị Igbo niile mma.

O kwuru na o kweteghị na ọ bụ ụjọ mere ka ndị mmadụ dowe iwu "sit-at-home" makana ndị mmadụ pụtara taa bụ June 1,2021 bụ ụtụtụ fotere abalị May 31st.

Etu o si metụta ndị na-azụ ahịa n'ala Igbo

Innocent Chukwuma e ji Innoson mara bụ oji ego achụ ego Chukwuma kwuru na iwu nọrọ n'ụlọ nke May 31st metụtara ụlọ mmepụta akụrụngwa ụgbọala ya makana o mere ka ha kwụsị igwe ha na-emepụta akụrụ ngwa ụgbọala n'ike nke mefuru ha ọtụtụ ego.

Chukwuma kwuru na ọ ga-adịmma ka ndị Igbo niile nọkọta ọnụ kpaa akpa ka ewepụta otu ụbọchị n'ime afọ ọbụla iji na-edowe iwu nnọrọ n'ụlọ maka ncheta Biafra.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Ipob 'sit at home'