Ohaneze Ndigbo: Ndị ọjọọ agaghị etinyenwu ọgbaaghara n'etiti ndị Igbo na ndị Yoruba - George Obiozor

George Obiozor na Babajide Sanwo-Olu

Ebe foto si, Babajide Sanwo-Olu/Twitter

Nkọwa foto, George Obiozor na Babajide Sanwo-Olu

Otu Ohaneze Ndigbo agwala Gọvanọ Legọs steeti Babajide Sanwo-Olu ka ọ wepu uche n'akụkọ na-ekwu na ndị otu IPOB na-akpa nkata Ịwakpo steeti ahụ.

Onyeisi Ohaneze bụ George Obiozor kwuru nke a oge ọ gara njem nleta n'obi gọọmentị Legọs n'ụbọchị Tọzde.

Obiozor kwuru na akụkọ ahụ bụ akụkọ ụgha nke ndị obi ọjọọ chọrọ iji tinye ọgbaaghara nakwa tigbuo zọgbuo na steeti ahụ.

"Ọgbaghara daa na Legọs, ọ ga-emetụta anyị niile bụ ndị Igbo," Obiozor kwuru.

"Ndị Igbo agaghị eme ihe ọbụla ga-emebi ọdịmma anyị na ndị Yoruba, ọ kachasị na Legọs ebe ọtụtụ ndị Igbo bi."

Joe Igbokwe, Babajide Sanwo-Olu, na George Obiozor

Ebe foto si, Babajide Sanwo-Olu/Twitter

Nkọwa foto, Joe Igbokwe, Babajide Sanwo-Olu, na George Obiozor

"Anyị chere na-akụkọ asị a bụ iji megharịa gọọmentị Legọs anya na mbọ ha na-agba ime ka ndụ dịrị ndị mmadụ mfe."

"Ndị Igbo bụ ndị e ji mwulite obodo mara, ọ bụghị ndị na-emebi emebi. Ihe ndị Igbo mepụtagoro na Legọs doro ewu na ọkụkọ anya.

"Obi tọkwara anyị ụtọ mgbe ndị otu IPOB n'onwe ha pụtakwara kwuo na ya bụ akụkọ abụghị eziokwu."

Aha onyonyo, George Obiozor: Nnamdi Kanu bụ nwa anyị, okwu Biafra abụghị okwu ụmụntakịrị

Obiozor gara n'ihu kwuo na Ohaneze Ndigbo ga-enye ọchịchị Sanwo-Olu nkwado niile ọ chọrọ n'aka ha iji hụ na ọchịchị ya mịtara mkpụrụ.

N'aka nke ya, Sanwo Olu kelere ndị Ohaneze ma kwuo na ọchịchị ya ga na-agba mbọ maka ọdị mma mmadụ niile.

George Obiozor, Babajide Sanwo-Olu na Pascal Dozie

Ebe foto si, Babajide Sanwo-Olu/Twitter

Cheta na ọ bụ onyeisi ndị uweojii steeti Legọs, Hakeem Odumosu, kwuru na nnyocha ha mere gosiri na ndị otu IPOB na-akpa nkata ịwakpo Legọs.

Mana Nnamdị Kanu, onyeisi ndị IPOB, kwuru na akụkọ ahụ abụghị eziokwu.

Ọ bụ nke a kpatara ndị isi Ohaneze Ndigbo jiri gaa na nke Sanwo-Olu iji gwa ya n'ezie na ndị Igbo agaghị achọ imebi ihe na Legọs.