Ipob asaala George Obiozor nke Ohanaeze Ndigbo maka okwu ọ gwara Nnamdi Kanu

Kanu na Obiozor

Ebe foto si, BBC Sport

Ndị ọkaiwu Ipob gụnyere Aloy Ejimakor na Paul Achalla asaala onyeisi Ohanaeze Ndigbo bụ George Obiozor n'okwu ọ gwara Nnamdi Kanu bụ onye ndu Ipob.

Obiozor mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'Enugwu sị na "Okwu Biafra karịrị Nnamdi Kanu ikpebi".

Na nzaghachị ndị ọkaiwu Ipob katọọrọ ihe Obiozor kwuru mgbe ha na BBC Igbo nwere mkparịtaụka n'ekwentị.

Aloy Ejimakor sị na ọ tụghị anya na Obiozor ga-ekwu ụdị okwu a maka na Nnamdi Kanu abụghị obere nwa, na ọ karịala afọ iri ise.

Ihe o kwuru maka Nnamdi Kanu-

Ọ sị na okwu Biafra abụghị ihe gbasara Ohanaeze Ndigbo maka na ha abụghị otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị kama na ọ bụ otu omenala na-ahụ maka ọ dị mma ndị Igbo.

Ọ gara n'ihu kwuo na o nweghi ihe Ipob nwere megide onyeisi ọhụrụ Ohanaeze Ndigbo kama na ha ekwesighị ị na-akpụ Ipob na Kanu n'ọnụ mgbe niile.

N'okwu nke ya, Paul Achalla sị na Obiozor hapụrụ ihe o kwesịrị ikwu metụtara mmegbu ndị Igbo, mwakpo ndị Fulani na-achị ehi nakwa nchekwa n'ala Igbo ma kwuwe maka Biafra na Ipob.

Achalla kwukwara na Nnamdi akwụghị naanị na mbọ inwete Biafra na ọtụtụ ndị Igbo nwere agba so ya n'azụ.

Ọ gara n'ihu kwuo na Ohanaeze bụ ọgbakọ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị si ala Igbo ji ala ezumike nka na ha na anaghị eme ihe ga-abara ndị Igbo uru.

Achalla nyere Obiozor ndụmọdụ ka ọ hapụ ịgbaso ụzọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma lekwasị anya maka ọ dị mma ndị ntoroọbịa, ndị nne nakwa Igbo gbaa gburugburu.

Ihe ndị ọzọ Obiozor kwuru:

George Obiozor, Onyeisi Ohanaeze Ndigbo
  • Nnamdị Kanu bụ onye nke anyị, o kwesịrị ige anyi ntị.
  • Ndị Igbo na Naijirịa anaghị alu ọgụ ọbụla.
  • Oge eruola ịchọta ihe ahụ jikọrọ anyị dịka ndị Igbo.
  • Anyị dịka ndi Igbo kwesiri itinye uchu n'ihe ga-akpọkọta anyị ọnụ karịa ihe ga-ebute esemokwu.
  • Okwu maka Biafra karịrị Nnamdi Kanu ikpebi ihe ga-eme.
  • Okwu maka Biafra metụtara anyị niile
  • Ihe kachasị ndị Igbo mkpa ugbua bụ nchekwa ndụ na akụnaụba ha na Naịjirịa nakwa mba ofesi.
  • Anyị ga-eji atụmatụ 'Alaigbo Stabilization Fund' wulite ma mepee mpaghara ala Igbo niile.