Lee ihe i kwesiri ịma maka ndị na-azọ ọkwa onyeisi Ohanaeze Ndigbo

Ndị na-azọkwa onyeisi Ohanaeze Ndigbo

Ebe foto si, Coalition of Igbo Organisations Worldwide

Igbo sị na "Eze pụọ Eze anọchie" etu a ka ọ dị n'ọkwa onyeisi Ohanaeze Ndigbo ka ha na-akwado ịhọpụta onyeisi ọhụrụ.

Ọkwa onyeisi Ohanaeze Ndigbo bụ ọkwa oge ya bụ afọ anọ n'ime otu ọnụ ọchịchị.

Onye ọbụla meriri ntuliaka a ga-abụ onyeisi Ohanaeze nke ugboro iri ga-edu ha ruo afọ anọ ọzọ.

Kedụ ndị na-azọ ọkwa a?

Ndị okenye ise ndị nwere agba n'Imo Steetị nakwa ala Igbo niile ga-achịpụ ya n'ịzọ ọkwa onyeisi Ohanaeze nke afọ a.

Lee ha:

1: Chidi Osuagwu

Chidi Osuagwu

Ebe foto si, Chidi Osuagwu

Ọ bụ nwafọ Imo Steetị .

Ọ gụrụ akwụkwọ na mahadum Indiana (1975), mahadum Youngstown State (1978), mahadum Texas (1978 ruo 1979), mahadum Pọtakọt (1993).

O nwetere ọzụzụ na ngalaba Biochemistry, Chemistry, Medical Chemistry `.

Ọ na-akuzi na mahadum FUTO dị n'Owere, Imo Steettị, ọ kụziela n'ọtụtụ mahadum kamgbe afọ 1978.

Ọ bụbu onyeisi Ohanaeze Ndigbo nke Imo Steetị site n'afọ 2007 ruo 2009.

2: Chris Asoluka

Chris Asoluka

Ebe foto si, Chris Asoluka/Facebook

Chris Asoluka bụ nwafọ Imo Steetị.

Ọ gụrụ akwụkwọ na Mahadum Naịjirịa dị n'Ibadan nakwa Mahadum Lọndọn na ngalaba ndọrọ ọchịchị na ọkaiwu.

Ọ rụrụ ọrụ dịka onye omeiwu nta n'afọ 1992 ruo 1993.

Ọ rụrụ ọrụ dịka kọmishọna na-ahụ maka ego na mmepe akụnaụba n'Imo Steetị site n'afọ 1994 ruo 1996.

Ọ ji ọkwa onyeisi ụlọọrụ "Onne oil and Gas Free Zone Authority" kamgbe afọ 2013 rute ugbua.

3: Goddy Uwazuruike

Goddy Uwazuruike
Nkọwa foto, Goddy Uwazuruike bụbụ onyeisi otu Aka-Ikenga

Goddy Uwazuruike bụ nwafọ Mbano dị n'Imo Steetị.

Ọ gụrụ akwụkwọ sekọndịrị na 'Immaculate Conception Seminary Ahiaeke Umuahia' afọ 1971 ruo 1975.

Gụọ mahadum na mahadum Imo Steetị ma banyezie mahadum Naịjirịa dị n'Enugwu ebe o nwetere ọzụzụ dịka ọkaiwu site na 1985 ruo 1988.

Ọ bụ onyeisi ọkaiwu n'ụlọọrụ mkpechite ọnụ bụ Uwazuruike and Associates.

Ọ rụọla ọrụ n'ọtụtụ ebe dị iche iche nke gụnyere SKARPUT Nig Ltd, Kaygee Communications, Multitrust Services dgz.

Uwazuruike ji ọkwa odeakụkwọ ukwu Aka-Ikenga site n'afọ 2002.

4: Joe Nwaorgu

Joe Nwaorgu

Ebe foto si, Joe Nwaorgu

Joe Nwaorgu bụ nwafọ Ngor Okpala dị n'Imo Steetị.

Ọ gụrụ akwụkwọ na mahadum Naịjirịa na mahadum Cambridge dị na Lọndọn ebe o nwere ọzụzụ 'Estate Management'.

Ọ kụziri nkuzi na mahadum Naịjirịa afọ iri site na 1974 ruo 1984.

Ọ rụrụ ọrụ bekee n'ụlọọrụ gọọmentị etiti ruo afọ 1988 ọ lara ezumike nka.

Ọ bụ onyeisi ụlọọrụ 'Joe Nwaorgu and Associates, Estate Surveyors and Valuers' n'afọ 1994 ruo 1996.

Ọ rụrụ ọrụ dịka kọmishọna na-ahụ maka ọrụ, ụlọ na njem ụgbọala nke Imo Steetị, nye aka na nrụchapụ ọdọụgbọelu Imo Steetị n'afọ 1994.

Nwaorgu ejiela ọkwa osote odeakwụkwọ ukwu Ohanaeze Ndigbo n'afọ 2000 ruo 2004 ma bụrụ odeakwụkwọ ukwu ha n'afọ 2003 ruo 2017.

5: George Obiozor

George Obiozor

Ebe foto si, George Obiozor

George Obiozor bụ nwafọ Awo-Omamma dị n'Imo Steetị.

Ọ gụrụ akwụkwọ sekọndịrị n'ụlọakwụkwọ Awo-Omamma Comprehensive n'afọ 1959 ruo 1963.

Gụọ akwụkwọ dị elu na 'Institute of African Studies Switzerland (1967), mahadum South Tacoma USA (1967), mahadum Columbia (1968).

Ọ nwere ọzụzụ na ngalaba dịka ọkaiwu mbaụwa, ndọrọ ndọrọ ọchịchị na mmekọrịta mba na ibe ya.

Ọ kuziri nkuzi n'ụlọakwụkwọ Awo-Omamma, Mahadum Columbia.

Ọ rụkwara ọrụ dịka onye na-anọchịteanya Naịjirịa na mba dịka Amerịka (2004 ruo 2008), Izrel (1999 ruo 2003), Cyprus. Ma rụọkwa dịka onyeisi ụlọọrụ 'Nigerian Institute of International Affairs'.

O dere akwụkwọ di iche iche banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị na mmekọrịta mba na ibe ya.