Eastern Security Network bụ atụmatụ ndị gọvanọ Ọwụwa-Anyanwụ Nnamdi Kanu na Ipob zuuru-

Ebe foto si, Hope Uzodinma/Facebook
Gọvanọ Hope Uzodinma nke Imo steeti eboola onye ndu otu Ipob bụ Nnamdi Kanu ebubo izuru atụmatụ ndị gọvanọ mpaghara Ọwụwa-Anyanwụ na-ahazi maka nchekwa ala Igbo.
Uzodinma , onye kwuru nke n'abalị Fraide dịka ya na ndị ntaakụkọ na-akparịta ụka n'Owere kwuru na ndị gọvanọ ekwekọrịtala ma na-ahazi etu ha ga-esi mee ya bụ otu maka nchekwa Ọwụwa Anyanwụ, tupu Kanu weghara aha "Eastern Security Network."
Ọ gara n'ihu boo otu Ipob ebubo iji otu Eastern Security Network ebute ọgbaghara n'Alaigbo.
" Ndị gọvanọ Ọwụwa-Anyanwụ gbaliri ihiwe, "Eastern Security Network" site na njikọ aka otu Ohaneze Ndigbo."
"Ndị Ọkaiwu steeti dị na steeti ewepụtara akwụkwọ maka atụmatụa, tupu anyị mara ihe na-eme, Ipob zuru aha ahụ ma were ya bido na-eme mpụ."
Uzodinma gara n'ihu kwuo na ha ka na-elebanye anya n' iwepụta otu nchekwa ga-atọ atọ dịka ndị gọvanọ ga-ezuko n'Owere n'izu ole na ole na-abịa ịtụ alo maka nchekwa obodo n'Ọwụwa Anyanwụ.
A kpọrọ ya ESN maọbụ Amọtekun, ha niile bụ maka nchekwa onwe - Enyinnaya Abaribe

Sịnetọ Enyinnaya Abaribe na-anọchiteanya Abia South n'ụlọomeiwu ukwu nke Naịjirịa etinyela ọnụ n'okwu banyere nhiwe Eastern Security Network.
Abaribe tinyere ọnụ ya mgbe ọ na-aza ajụjụ n'emume Focus nke ụlọ ntaakụkọ AIT n'ụbọchị Mọnde.
N'okwu ya "Ọ bụ naanị osisi ga-akwụrụ ka mmadụ were mma bịa gbuo ya".
Ọ sị iwu mbụ ị dịrị mmadụ n'ụwa bụ iwu ichekwa onwe ya, na a agaghị ewepụ ya ewepụ.
Ọ sị na ị agaghị achọ ịnwụ ebe ị na-eche ka otu nchekwa iwu kwadoro dịka uweojii, ndịagha bịara bịa zọpụta.
"Ndị mmadụ nwere ikike ichekwa onwe ha dịka iwu nchekwa onwe siri kwuo, ọ bụrụ n'aha AMOTEKUN maọbụ ESN".
"Iwu Naịjirịa sị na i nwere ikike ịdị ndụ, o nweghi onye ga-anara gị ya ebe ị na-eche ka ndị nchekwa na-anaghị arụ ọrụ ha bịa chekwaa gị."
Ọ gara n'ihu sị na ọ ga-ajụta ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ ma ha ọ ga-akwado Eastern Security Network n'ụzọ iwu.
Ihe ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ sara Elliot Uko maka ESN Nnamdi Kanu hibere

Ụfọdụ ndị gọvanọ ọwụwa anyanwu ekwuola na o nweghị ihe ha ga-asa onye chọpụtara Igbo Youth Movement, Elliot Ugochukwu-Uko maka ụta o buyere ha gbasara Nnamdi kanu hibere Eastern Security Network.
Don Adinuba bụ kọmịshọna mgbasozi gọọmenti Anambra steeti ugbua kwuru na o nweghị ihe ọ ga-asa ndị na-eme nkọgherị.
Kọmịshọna mgbasaozi nke Imo na Ebonyi steeti azaghị ekwenti ha maọbụ ozi anyị zigara ha ruo ugbua.
Anyị ka na-agba mbọ ịnụta n'ọnụ gọọmenti Enugu na Abia steeti.
Ihe ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ kwurụla maka nchekwa n'ala Igbo
N'afọ 2019, ka ndị gọvanọ ọwụwa anyanwu kwekọrịtara ihibe kọmiti ga-elebe anya n'ọrụ nchekwa iji ihibe otu ndị nche ọrụ ha bụ ilekọta ndị nche n'ime ọhịa na ụzọ niile dị n'ọwụwa-anyawụ gbaa gburugburu.
Ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ machịkwara ịchị ehi agagharị na mpaghara ha n'otu afọ ahụ(2019)
Chetakwa na otu jikọrọ ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ mechara hibe otu nche a n'abalị 28 nke ọnwa Julaị afọ 2019.
- Ha hibekwara kọmiti ga-ahazi otu ndị nche ahụ n'abalị 31 nke Ọgọst 2019.
- Kọmiti ahụ kwuru na ha ga-agba mbọ ịhụ na ụlọomeiwu niile dị n'ọwụwa anyanwụ ga-emepụta iwu ọhụrụ ga-akwado otu nche ọhụrụ ahụ.
- Otu nche ọhụrụ a enwebeghị aha; kọmiti ahụ ga-ecehpụta aha a ga-akpọ ya.
- Ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ degara gọọmentị etiti akwụkwọ iji kọọrọ ha maka atụmatụ nche ọhụrụ a.
- Ha kwuru na ha ga-akpọkwa gọọmentị etiti ka ha bịa were anya ha hụ ya ma ọ malite nke ọma.
Mana emechara ụfọdụ ndị nọ na kọmịtị ahụ, onye dịka ọkammụta Uzoma Nwali gbara arụkwaghịm ma kwuo na ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ anaghị ege ụmụ Igbo ntị kama ha na-eme ihe dị ha mma.
Onye ma ma ọ ihe niile a mere ndị mmadụ ji hibee otu nchekwa nke ha?
Onyeisi otu IYM bụ Elliot Ugochukwu Ukoh kwuburu na ọ bụ ndị Gọvanọ mere ka otu dị ka Eastern Security Network selite isi.
O kwuru na ọ bụrụ na ndị Gọvanọ gere ntị na ndụmọdụ ya ịkpọkete ndị ntorobịa nso, ihe agaghị eru etu a.
Cheta na onyeisi otu IPOB bụ Nnamdi Kanu hibere otu ọ kpọrọ Eastern Security Network maka nchekwa mpaghara ala Igbo.
"Anyị akwadoghi mba ọgụ Nnamdi Kanu na-abara ndị gọvanọ"

Ebe foto si, Getty/Ipob
Ụfọdụ otu si Ọwụwanyanwụ ejikọtala aka ọnụ katọọ mba ọgụ onye ndu otu Ipob bụ Nnamdi Kanu bara ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ maka ịjụ inye otu 'Eastern Security Network' nkwado.
Ha kwuru na Kanu ịnọ na mba ofesi na-achịkọta otu ahụ gosiri na o nwere ihe ọzọ o bu n'obi na abụghị ọdịmma ha.
Otu Ipob nna-ebo ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwu ebubo ịlakanyere ha ndị agha Naijiria n'ihi nhiwe onye ndu ha bụ Kanu hiwere otu nche 'Eastern Security Network' n'Ọwụwa Anyanwụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
N'ozi ha wepụtara nke ndị isi ha gụnyere: Ọkaiwu Uche Ude(Ndigbo Progressive Youth Vanguard), Andy Okoro(South East Youth Network) na Deaconess Grace Ejike(South East Market Women Vanguard) binyere aka, ha kwuru na "Nnamdi Kanu agaghị ekwuru ndị Igbo na Naijiria maọbụ ebe ọbụla n'ihi na ọ bụghị onye ndị mmadụ họpụtara ya ịnọchite ha dịka iwu Naijiria si kwuo.
"Ya lọta bịa mee ntuliaka ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ikwuru ndị Ọwụwa Anyanwụ dịka iwu Naijiria si dị. E wepụ nke a , o nweghịkwa ihe ọzọ."
Ha jara ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ ike maka iji iwu achịkọta obodo ma kpokuo ndị ntorobia ka ha wepụ aka n'agwa ọbụla ga-esosi ndị Ọwụwa Anyanwụ dịka ndị chọrọ ikposaa Naijiria, ọkachasị ugbua mpaghara dị iche iche na-akpọ oku ka enye ndị Igbo ohere ọkwa onyeisiala n'afọ 2023.
Na nkọwa ha, nkwado ndị mpaghara ndọị ọzọ dị mkpa maka Ọwụwa Anyanwụ inweta ọkwa ahụ.
Eastern Security Network pụtara maka na ndị gọvanọ dara n'ọrụ nchekwa ha - Charly Boy

Ndị ọnụ na-eru n'okwu gbakọrọ kwuo maka Eastern Security Network nke Nnamdị Kanu hibere.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
Ndị a gunyere Charly Boy, Ozioma Izuora onye ọka iwu, Fredrick Nwabufo onye ntaakụkọ.

Ebe foto si, Ebonyi Government/ Ipob
Ndị gọvanọ Ọwụwa-Anyanwụ akatọọla nhiwe Nnamdi Kanu bụ onye ndu otu Ipob hiwere otu nche 'Eastern Security Network'.
Onyeisi otu jikoro ndịị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ bụ Dave Umahi gwara ndị ntaakụkọ n'Abakaliki, isiobodo Ebonyi steeti ụbọchị Fraide na mpaghara Ọwuwa Anyanwụ bụ ebe kachasị nwe udo, na enweghị nsogbu nchekwa.
Ụmahi sịrị, " Achọrọ m ịgba ndị be anyị ume na mgpaghara anyị bụ ebe udo kachasị achị, o nweghị onye ga-agbagha nke a."
"Ya mere mgbe nwanne anyị nwoke si na ya ewetala otu nche n'Ọwụwa Anyanwụ, ọ bụ ihe ịkpa ọchị nke ekwesịị ịgba nkịtị kpamkpam."
Ọ gara n'ihu too ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ maka "mbọ ha na-echekwa mmadụ na akụnaụba na mpaghara ahụ na-agbanyeghị nkatọ a na-akatọ ha."
Umahi kpọkwara oku ka a ghara ịchụ ndị isi ọchịagha Naijiria ka nsogbu ghara isi na ya dapụta.
Etu nhibe Eastern Security Network na Amotekun siri dị iche

Dịka akụkọ nakwa ihe onyonyo pụtara na soshal midia si gosi, otu nchekwa a kpọrọ 'Eastern Security Network' dị ka ha amalitela ọrụ n'uju na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ.
Otu a nke onye hibere ya bụ Mazi Nnamdi Kanu, onyeisi otu 'Indigenous People of Biafra', bụzị okwu a kpụ n'ọnụ n'ala Igbo ugbua.
Imirikiti ndị welitere isi n'ala Igbo kwadoro otu ESN, mana ụfọdụ na-ekwu na ọ dabaghị.
Ndị kwadoro ya kwuru na ọ yitere otu nchekwa nke dị na mpaghara Ọdịda Anyanwụ a kpọrọ Amotekun, maọbụ otu nchekwa nke a kpọrọ Hisbah, na mpaghara Ugwu Naịjirịa..

Otu n'ime ndị a bụ onye otiegwu a ma ama bụ Charles Oputa (Charly Boy)
Kedụ myiri dị na Amotekun na ESN?

- Ọrụ otu abụọ a bụ nchekwa otu mpaghara - Eastern Security Network sị na ha na-echekwa mpaghara Ọwụwa Anyanwụ, ebe Amotekun nwere ikike ichekwa mpaghara Ọdịda Anyanwụ.
- Ebumnobi otu abụọ ma esoro okwu ekwuru n'ihibe ha, bụ nchekwa ndụ na akụnụba ndị bi na mpaghara ha
- Okwu ndị hibere ha sị na ihe kpatara e ji hibe otu abụọ bụ n'ihi oke ogbugbu nakwa mpụ dị n'obodo, ọ kachasị mwakpo ndị ọchịehi
- Ha abụọ na-ebu egbe ma nwekwaa akwa pụrụ iche e ji mara ha.
Ndịiche dị na Amotekun na ESN

Ebe foto si, Ondo State govt
- Ọ bụ otu onye (Nnamdi Kanu) hibere ESN, mana Amotekun bụ ndị ọchịchị steeti isii dị na mpaghara Ọdịda Anyanwụ bịakọtara ọnụ ma kpebie ihibe ya
- Ụlọomeiwu steeti ndị dị n'Ọdịda Anyanwụ wepụtara iwu nke kwadoro ihibe otu Amotekun, mana ọ dịghị otu a maka ESN
- Otu Amotekun na ndị uweojii Naịjiria na-arụkọ ọrụ iji weta nchekwa, mana otu ESN ekwubeghị ma ha na ndị uweojii a ga-arụkọ
- Gọọmentị steeti isii mebere mpaghara Ọdịda Anyanwu tụkọtara ego zụta ngwaọrụ na ngwaagha nke ndị Amotekun ji arụ ọrụ, mana o nwebeghị gọọmentị Ọwụwa Anyanwụ ọbụla kwadoro ESN
- Amotekun nwere usoro doro anya ha si ewe ndị ọrụ ọhụrụ. N'aka nke ọzọ, o dochaghị anya etu otu ESN si ahọrọ ndịọrụ ha, mana ụfọdụ kwuru na ọ bụ onye chọọ o jiri aka ya banye
- Gọọmentị Naịjirịa kwuburu na ha akwadoghi Amotekun, mana Osote Onyeisiala bụ Yemi Osinbajo na ndị gọvanọ Ọdịda Anyanwụ mechara nwee ọgba ma kwuo etu Amotekun ga-esi arụ ọrụ. N'okwu nke ESN, gọọmentị etiti ekwubeghi ihe ọbụla, mana ọ dịchaghị ka ha a ga-akwado ya n'ihi na ndị Gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ akwadoghị ya.
Eastern Security Network agbasoghị iwu Naịjirịa - Ndị ọkaiwu
Dịka okwu gbasara atụmatụ 'Eastern Security Network' na-ebiri ọkụ, ndị ọkaiwu abụọ etinyela ọnụ n'okwu ahụ.
Otu n'ime ha bụ Anthony Okah gwara BBC Igbo n'ekwentị na atụmatụ ahụ megidere iwu nchekwa Naịjirịa.
Okah sị, "Iwu Naịjirịa megidere mmadụ ịbu egbe n'enweghi ikike ibu ya."
O kwukwara na ebe Ipob bụ otu gọọmentị etiti machiri amachi, ọ ga-eso na ọgbakọ na atụmatụ niile ha tụrụ bụ nke a machiri amachi.
Onye ọzọ bụ Uche Maduemesi kwụnyeere ibe ya bụ Anthony Okah n'ikwu na ọ dara iwu.
N'ọnụ ya "ha kwesiri ị nata ikike n'ihi na ọ bụghi onye nọkata bilie ọ sị na ọ na-echekwa obodo".
"A na-ede akwụkwọ, gọọmentị enye ha ikike tupu ha amalite ọrụ".
Maduemesi kwukwara na ọ dị mma na Kanu hibere ya bụ otu mana o kwesiri ekwesi ka ha denye aha ma nata ikike n'aka gọọmentị.
Etu 'Eastern Security Network' ga-esi rụ ọrụ

Ebe foto si, Alloy Ejimakor
Ọkaiwu Aloy Ejimakor bụ onye ọkaiwu otu IPOB nakwa Nnamdi Kanu kọwara na akụkụ 59 n'iwu Naịjirịa akpọrọ 'Penal Code' metụtara nhibe otu nchekwa ahụ.
Ejimakor kọwara na otu ahụ ga na-arụ ọrụ dịka ndị ọrụ nche nke ime obodo a kpọrọ 'Vigilante' na Bekee.
Ọ sị, "Ha abụghị 'Biafra Army', ha anaghị emegide gọọmentị Naịjirịa. Ha bụ maka nchekwa mpaghara ala Igbo".
N'ọnụ ya 'Ha anaghị egbu mmadụ, ihe ha na-agwa Igbo bụ "keenụ nkwụcha na nkwụcha abụghị ụjọ"'.
'Anyị kwadoro atụmatụ Eastern Security Network maọbụrụ na...' - Ohaneze Ndịgbo

Emeka Attama bụ ọnụ na-ekwuchitere Nnia Nwodo bụ onyeisi Ohaneze Ndigbo ekwuola na ha kwụnyere Nnamdi Kanu maka atụmatụ nchekwa o weputara.
Ọ gwara BBC nke a na mkparịtaụka ekwentị ebe o kwuru na Eastern Security Network dị mkpa maka ịnye ndị Igbo olileanya na nchekwa dịịrị ha.
O kwuru na o nweghi ihe dị njọ ma ndị Igbo nwee nke ha ebe mpaghara ndị ọzọ nwere nke ha.
"Anyị ga na-akwado ya bụ atụmatụ maọbụrụ na ejighi ya megbuo ndị ọzọ, ọ kachasị ndị abụghị ndị Igbo" ka o kwuru.
Mana o kwukwara na ihe wutere ha bụ na Nnamdi Kanu agwaghị ha tupu o hibe ụdịrị ihe dị etu ahụ.
Nnamdi Kanu na-etinye ndụ ụmụntoroọbịa so na 'Eastern Security Network' na nnukwu nsogbu- Ralph Uwazuruike
Onyeisi otu aha ya bụ Movement for the Actualisation of the Soverign State of Biafra, MASSOB bụ Ralph Uwazuruike ekwuola na Nnamdi Kanu na-etinye ndụ ụmụntoroọbịa ọ hụpụtara maka Eastern Security Network na nnukwu nsogbu.
O kwuru na onweghị ebe ya bụ otu nchekwa ji azụ eje maọbụrụ na aka ndị gọvanọ ọwụwaanyanwụ adịghị ya.
Uwazuruike kwuru na onye ọbụla kwesiri ịkatọ atụmaatụ a Kanu ji pụta ugbua.
Lee ihe ndị o kwuru n'uju ebe a.
Ihe ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ kwuru maka otu ndị nchekwa Nnamdi Kanu si na o hibere

Ebe foto si, Screengrab of Kanu and Facebook page of Obiano
Ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ etinyela ọnụ n'okwu Nnamdi Kanu kwuputere na o hibela otu nchekwa ọhụrụ n'ọwụwa anyanwụ.
Kọmishọna mgbasaozi gọvanọ Anambra steeti bụ Don Adinuba kwuru na Anambra bụ steeti kachasị nwe ezi nchekwa.
Ma na-ekwu na ndị mmadụ kwesiri ịbịa mụta ka esi echekwa obodo n'aka ha.
N'okwu ya, "Anyị ga-akụziri ndị mmadụ ka esi echekwa obodo ọbụghị ndị mmadụ ga-akụziri anyị"
Kọmishọna mgbasaozi nke gọvanọ Abia steeti bụ John Okiyi Kalu kwuru na ha agaghị etinye ọnụ n'okwu ahụ.
Ebe ndị nke Imo, Ebonyi, Enugu azabeghị anyị.
Nnamdi Kanu sị na o hibela otu ndị nchekwa n'Ọwụwa Anyanwụ

Nnamdi Kanu bụ onyendu otu na-achọ nnwereonwe Biafra a kpọrọ Indigenous People of Biafra (Ipob), ekwuola na ya ehiwela otu nchekwa a kpọrọ Eastern Security Network (ESN), bụ nke ọ sị ga-egbochi mkpamkpa ndị ọchị ehi.
O kwuru na e hibere otu a n'ihi na ndị gọvanọ ọwụwa-anyanwụ bụ ndị ụjọ, na ha enweghi ike ime ụdịrị ihe ndị na-achị mpaghara ndịda Naịjiria mere dịka ha hibere otu nchekwa nke ha a kpọrọ Amotekun.
Kanu kwuru na nhibe a dị mkpa n'ihi na ụmụnwaanyị na ụmụagbọghọ anaghị aganwuzi ugbo n'ala Igbo n'ihi ụjọ mwakpo, ma kwuo na ebe ọbụla e gburu ndị Biafra, na ndị gọvanọ na ndị kọmishọna uweojii ga-eji isi buru ya.
O kwuru sị "Ụfọdụ ndị nwereike ikwu na Amotekun nwere iwu na-achị ha, mana achọrọ m ime ka o doo onye ọbụla anya na agwọ nọ n'akịrịka n'ala anyị, nke bụ na anyị agaghị esi ụzọ ahụ."
"Aga m ewepụta ihe onyonyo ka ị hụ na ọ bụghị egwu ka anyị na-egwu."
Ọ gara n'ihu kwuo "anyị ekpebiela na anyị agaghị ekpesara onye ọbụla ọzọ".
N'ihe gbasara ogbugbu ndị mmadụ n'Oyigbo dị na Rivas steeti n'ọnwa Ọktoba, Kanu kwuru sị na ndị ọbụla aka ha dị na ya bụ ogbugbu agaghị alafere.
O kwukwara na ọ dịka ụlọikpe mbaụwa bụ International Criminal Court (ICC) na ndị ọzọ agbachiri nkịtị "ka a na-egbufusi ndị na-enweghi ihe ha mere", ma kwuo "anyị agaghị ekwe ka a na-egbufusi ndị mmadụ etu ọ masịrị ndị ọchịchị steeti. Ana m eme ka ngalaba United Nations mara ugbua a na o mee ọzọ, anyị ga-emegwara."
O kwuru sị "wepụtanụ ihe niile m na-ekwu ma zigara ya ndị ICC. Achọrọ m ịga ụlọikpe ahụ..."
'Ndị mmadụ ga-apụta mee ngagharịiwe'
Kanu kwukwara na n'ime izu ole na ole na-abịa, ndị mmadụ ga-apụta ime ngagharịiwe, ọ sị na ndị ESN ga-apụta ichekwa ha.
O boro ndị agha ebubo na ha gburu nne na nna ya, ma kwuo na "ha (ndị nkwado ya) apụtala ịnwụ maka nkwenye ha".
"Ndị be anyị adịla njikere ịlụ ọgụ, ọ bụghị ọgụ nnwereonwe n'aka Naịjiria - anyị ga-esi n'aka 'referendum' nweta nke ahụ - mana ọ bụ ọgụ ichekwa obodo anyị. Anyị chọrọ ka ndị nne anyị gaa ọrụ ugbo na-atụghị ụjọ mwakpo n'ike."
Gịnị bụ 'Eastern Security Network'?
Kanu kwuru na Eastern Security Network abụghị ndị agha Biafra, na ha bụ ndị nchekwa.
"Eastern Security Network abụghị ndị agha Biafra. Ọ dị ka Amotekun. Mgbe oge ruru anyị ga-egosi ụwa ndị agha Biafra."
"Anyị anaghị abanye agha ọbụla."
Mara na gọọmenti Naịjirịa gụnyere Ipob n'ime otu ndị na-eyi ndụ egwu na mba ahụ. Ha sikwa na ha bụ ndị enweghị ikike ịgbakọ.
Ọ bụ ndị omeiwu steeti na ndị gọvanọ nwere ikike ihibe ndị ọrụ nchekwa na steeti dị iche iche na Naijiria.
Akụkọ ndị ga-amasị gị:













