Bishop Kukah: Gịnị na-esere Nnamdi Kanu na Fr Abiagom?

Ebe foto si, Getty/Fr Augustine Abiagom
Otu ụkọchukwu Katolik bụ Fada Augustine Abiagom adọtaala okwu na soshal midia dịka ọ gwara onye ndu otu nnweereonwe Biafra bụ Indigenous People of Biafra(Ipob) bụ Nnamdi Kanu uche ya maka ikwugide Bishọp ụka Katọlik bụ Bishop Mathew Kukah.
Fada Abiagom katọrọ Nnamdi Kanu maka imaja Bishop Katolik si na ya ga-abụ ya ọnụ n'ọha ma ọ bụrụ na ọ kwụsịghị ikwu ọ kpọrọ "okwu ga-ewe Chineke Iwe".
Aga m abụ Kukah ọnụ ma ọ bụrụ na... - Nnamdị Kanu
N'ozi ahụ nke ọ gbasara n'intanet na mbido izu a, Kanu gwara ndị ụka Katolik n' ụwa niile sị, "Dọọnụ Bishop Kukah aka na ntị, ka ọ kwụsị okwu na-ewe Chineke Kachasị, iwe. E meghị etu a, aga m abụ ya ọnụ n'ọha."

Aka Kanu rụrụ Kukah n'ihu na-abịa dịka Kukah bụ Bishop Sokoto Dayọsisi kwuru ụbọchịụka na " O nweghị ihe onye ọbụla ga-erite ma ọ bụrụ na Naijiria ekewaa."
O nweghị uru dịrị onye ọbụla ma Naijiria Kewaa- Kukah
Kukah gakwara n'ihu ozi ahụ nke ụlọakụkọ Vanguard wepụtara sị, "Echeghị m na onye Naijiria ọbụla iji uche ya ga-ameme ka na ọ nweghị ihe jikọrọ anyị ọnụ."
Okwu ndị a bụ ihe ụfọdụ na-ekwu kpasuru Nnamdi Kanu bụ onye na-agba mbọ ka e kewapụta Biafra na Naijiria, iwe.
Fada Abiagom kwuru na ụdị okwu mkpali ahụ megide nnukwu ụkọchukwu Katolik jọgburu udele, sigbuo nkapị n'isi.
Abiagom, kwuru na o nweghị ihe ọjọọ dị n'ihe Bishop kwuru banyere ịdịnotu na-agbanyeghị ebe onye si.
"Ọ bụrụ na i kwenyeghị ihe Bishop kwuru maka ịdịnotu, nke ahụ bụ echiche ya, i nwere ike ịgbagha ya na-ejighị iwe na mkpalị megide ọkwa Bishọpụ na-anọchite."
Fada Abiagom, onye jiri Moses n'Akwukwọ Nsọ were maa atụ, kwuru na Moses chikọtara ndị okenye Izrel ya na ha nyụkọ mamiri ọnụ iji nweta nnwereonwe ụmụ Izrel, were gaaa n'ihu kwuo na ipob agaghị achịta aja ma ọ bụrụ na ha ndị nọ n'ọchịchị ejikọtaghị aka chọwa ihe dara mmiri.
Ọ dụrụ Kanu ọdụ ka ọ ghara ịhapụ "ọrụ nnwereonwe Chukwu kpọrọ ya mee onwe ya Chukwu."
N'okwu ya, Abiagọm jụrụ sị,"Onye pụrụ ịbụ ụkọchukwu nke Chineke,nnukwu Bishọpụ e doro nso nakwa onye apọstụ ụka ọnụ? A gafela oke na ọrụ Chineke nyere gị."
Ihe Ipob sara Fada Abiagom
N' ịzaghachi ya, otu Ipob kwuru na ha na Fada Abiagom enweghị okwu ọbụla n'ihi na ọ bụghị ọnụ na-ekwuru Kukah.
N'ọsịsa nke ọkaiwu otu Ipob bụ Aloy Ejimakor nyere BBC n'ekwenti, Ipob kwuru na o nweghị esemokwu dị n'etiti Kukah na Ipob maọbụ onye ndu ha bụ Kanu mana ọ bụrụ na Kukah kwuo ihe ha anabataghị, na ha nwere ikike ịgbagha ya okwu.
"O nweghị onye ga-akụkọ Fada Kukah na Nnamdi Kanu isi."
"O kwuo ihe metụtara Ipob maọbụ ihe Ipob achọghị, Ipob na onye ndu ha bụ Nnamdi Kanu nwere ikike ikwu uche ha iji saa ya."
"O nwere ndị na-achọ ịkụkọ ha abụọ isi, ọ gaghị adị ile."
"Fada ahụ abụghị ọnụ na-ekwuru Fada Kukah, anyị enweghị ihe anyị ga-asa ya."
N'aka nke ọzọ, ebe ụfọdụ na-eto Fada Abiagom, ụfọdụ ndị mmadụ na-akatọ ya, na-ajụ ya ebe ọ nọ kemgbe ihe na-emebi ghara itinye ọnụ ịkatọ ihe ndị na-emebi ihe n'ala Naijiria.












