COZA: CAN esepụla aka ha n'okwu Fatoyinbo

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Akụkọ dị mkpa taa bụ Julai 21, afọ 2019:

CAN esepụla aka n'okwu Biodun Fatoyinbo

Coza

Ebe foto si, @Biodun Fatoyinbo

Nkọwa foto, Fatoyinbo kwuru na ọwakpotubeghị nwaanyị na ndụ ya

CAN esepula onwe ha n'akụkọ njem ngwado ndị COZA ma kwuo kwa na ha na ndị COZA enweghị mmekọ .

Ndi otu 'Christian Asociation of Nigeria', CAN, esepula aka na ukwu n'akukọ n'agagharị na ha gaara ikwado ndị ụlọ ụka Commonwealth of Zion Assembly ụbochị ụka gara aga.

"Anyi na-agwa oha mmadu na PFN ehibela nzụko na-ahu maka ebubo a , ndị nzukọ a ga-agwa anyi ihe ha chọputara n'ime izuuka abuọ. Anyị na-agwa ndi ofufe nke Kraịst na ọ bụ otua ka CAN siri eso okwua ma na ekwu kwa na anyị aghaghị ịta onye aka ya adighi ọcha ahụhụ ruru ya.

Alex Otti ka nọ n'APGA

Alex Otti

Ebe foto si, Alex Otti

Ọnụ na-ekwuru Alexi Otti nke APGA Abia steeti bụ Kazie Uko, ekwuola na akụkọ ahụ na-efegharị na achụpụla Otti na pati ahụ abụghị eziokwu.

BBC kpọrọ otu n'ime ndị binyere aka na ya bụ akwụkwọ sị na a chụpụrụ Otti bụ Augustine Ehiemere mana ọ saghị okwu kama o kwere nkwa ịkpọghachị mana ome ghị nke a ahụ tupu anyị wepụta akụkọ a.

PMB azachiela OBJ

Muhammadu Buhari na Olusegun Obasanjo

Onyeisiala Muhammadụ Buhari ekwuola na ndị na-akatọ ya maka Ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa abụghị ezi nwaamala.

Okwu Buhari a na-eso akwụkwọ ozi Olusegun Obasanjo deere ya maka ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa bụ nke ọ sị na-akawanye njọ.

BBC emechiela ụlọọrụ ha na Burundi

Ụlọ BBC

N'ofesi e, BBC emechiela ụlọrụ ha na Burundi dịka mbọ ha gbara iji kpezie okwu ha na ndị ọchịchị nwere na mba ahụ kpụrụ afọ n'ala.

Cheta na gọọmenti Burundi mechiri ụlọọrụ BBC nakwa nke Voice of Amerca n'ọnwa Maach ka ha bochara ha ebubo ịmetọ aha mba ahụ.

Gernot Rohr sị na ya echewebeghị echichi ụla

Gernot Rohr

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Gernot Rohr onye nkuzi Super Eagles

N'egwuruegwu e, onyenkuzi Super Eagles bụ Gernot Rohr ekwuola na ya anaghị akụ mgbanụ iche maka echi maka ọrụ ya na otu egwu bọọlụ ahụ agwụbeghị.

Rohr kwuru nke a ka e merichara Super Eagles n'asọmpị ọkara - ikpeazụ Afcon mgbe BBC gbara ya ajụjụ ọnụ.

Gee akụkọ BBC na nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Onye nwe ụlọ na ụmụ ya abụọ so na ndị nwụrụ n'ụlọelu dara na Jọs

Ụlọ dara ada

Ebe foto si, EPA

Otu 'Red Cross' agbaala ama na ozu mmadụ anọ ọzọ bụ ihe a dọpụtara n'ụlọelu dara na Jos, Plateau steeti nke mere ya mmadụ iri na otu nwụrụ n'ọdachi ahụ.

Ụlọelu ogogo atọ daara bụ ebe obibi ma nwekwa ọdọahịa dagidere ọtụtụ mmadụ gụnyere ụmụaka.

A kwụsiburu ọrụ gbagbata ebe ahụ n'abali ma bidokwa ụbọchị Monde mana ndị niile a dọpụtara na Tuzde bụ ndị nwụrụ anwụ .

Onye ndu ndị gbatagbata 'Red Cross' na Plateau steeti bụ Hussaini Umar Zakari) gwara BBC na onye nweụlọ na ụmụ nwaa nyị abụọ so na ndị nwụrụ anwụ.

Ụfọdụ ndị gbajiri ọkpụkpụ n'ụlọ ọkwụ, ebe a na-atụ uche na aọ ka nwere dị tọọ n'okpuru ụlọ ahụ dara ada.

O nweghị ony emaa ihe mere ụlọ ahụ ji daa mana ụfọdụ ndị bi ebe ahụ na-ekwu na ọ nwere mgbawa n'ahụ ya.

Trump tweets: Ụmụnwanyị ndị omeiwu n'Amerịka akatọọla Trump maka okwu ndị mbiarambiara

Rashida Tlaib, Ayanna Pressley, Ilhan Omar and ALexandria Ocasio-Cortez spoke at a press conference on Monday

Ebe foto si, AFP/Getty

Nkọwa foto, Rashida Tlaib, Ayanna Pressley, Ilhan Omar and ALexandria Ocasio-Cortez so na ndị omeiwu nke mba Amerịka

Ụmụnwaanyị ndị omeiwu nke mba Amerịka akatọọla onyeisiala mba ahụ bụ Donald Trump n'ihi okwu o kwuru na-asị ha laghachi mba ha si.

Ndị omeiwu ahụ gụnyere Ayanna Pressley, Ilhan Omar, Alexandria Ocasio-Cortez and Rashida Talib.

Ụmụnwaanyị ndị a bụcha ndị Amerịka ugbua mana nne na nna ha si mba dị iche iche wee bịa.

N'ederede nke o dere na soshal midia Twitter, Trump kwuru na onye achọghị ịbụ onye Amerịka, ya bilie laa.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Ọ kpọghị ụmụnwanyị ahụ aha n'ihe o dere mana atụọ ilu nkịrịka nkata, onye agwara amarala onwe ya.

Ndị ọchịchị mba dị icheiche, tinyere mba New Zealand, Canada nakwa Britain, katọkwara 'okwu ọjọọ' ahụ Trump kwuru.

BBC emechiela ụlọọrụ ha na Burundi

Obodo Bujumbura dị na Burundi

BBC emechiela ụlọrụ ha na Burundi dịka mbọ ha gbara iji kpezie okwu ha na ndị ọchịchị nwere na mba ahụ kpụrụ afọ n'ala.

N'ọnwa Maach afọ 2019, gọọmenti machiri mgbasaozi BBC nakwa onye ọbụla na-anye BBC akụkọ dịka ha boro BBC ebubo ịgbasa akụkọ n'ihe onyonyo nke ha kwuru nyere mba ha ajọ aha.

Ha machikwara ụlọrụ 'Voice of America'.

Ndị mmadụ na-atụ uche maka mkpachi a na-akpachi ọrụ ntaakụkọ na Burundi.

Na ngwụcha izu gara aga, 'Human Rights Watch' katọrọ gọọmenti mba ahụ maka inye onye ama dịka onyeisi otu ndị ọlụ-ọla na mba ahụ onyeisi ụlọmgbasaozi mba ahụ.

Ụmụaka Chibok dị anyị n'obi

Ụmụaka Chibok atọghapụrụ n'agbụ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụfọdụ ụmụakwụkwọ Chibok ndị Boko Haram tọghapụrụ n'agbụ

Ụlọọrụ onyeisiala agọọla na ọ bụghị eziokwu na ha gbahapụrụ ụmụaka ndị Boko Haram tọọrọ na Chibok, Borno Steeti, n'ihi na ha bụ ndị ogbenye.

Ọnụ na-ekwuru onyeisiala Muhammadu Buhari bụ Garuba Shehu kwuru nke a n' ọsịsa o nyere maka akwụkwọ nke Isha Sesay onye bubu onye ntaakụkọ CNN dere, nke kwuru na gọọmenti gbara nkịtị maka ụmụakwụkwọ Chibok dị otu narị iri na abụọ ndị Boko Haram ka ji kemgbe 2014.

Shehu kwuru na ọchịchị Buhari ka na-anwa oke ya ịhụ na ụmụakwụkwọ ndị ahụ e ji eji nweere onwe ha.

Ụmụ Naijiria na Saut Afrịka

Onyeisi 'Sineti' Ahmed Lawan zutere onye nnochite anya mba Saut Afrịka na Naijiria

Ebe foto si, Twitter/Ahmed Lawan

Nkọwa foto, Onyeisi 'Sineti' Ahmed Lawan (nke kpu okpu) zutere onye nnochite anya mba Saut Afrịka na Naijiria

Onyeisi Ulọomeiwu Ukwu bụ Ahmad Lawan akatọọla oke ogbugbu a na-egbu ụmụ Naijiria na mba Saut Afrịka dika ọ rụtụrụ aka na na e gbuola ndị Naijiria mmadụ otu nari na iri na asatọ anwụọla na mba ahụ.

Lawan kwuru nke a oge onye nnọchite anya mba Saut Afrịka na Naijiria bụ Bobby Moroe bịara leta ya ụbọchị Monde.

Amerịka achọghị ndị mbịarambịara

Migrants cross the Suchiate River, which delimits the border between Guatemala and Mexico, in the state of Chiapas, Mexico, on 11 June 2019. T

Ebe foto si, EPA

Nkọwa foto, Puku kwuru puku mmadụ na-aga osimiri iji baa mba Amerịka

Otu United Nations na-ahụ maka ndị gbara ọsọ ndụ a kpọrọ 'UN Refugee Agency' ekwupụtala obi mwute maka iwu ọhụrụ gbasara ndị mbịarambiara nke mba Amerịka wepụtara nke ga-adị ire ụbọchị Tuuzde.

Ha kwuru na iwu ahụ megidere ikike dịrị onye n'ihi na ọ dabaghị na iwu jịkọrọ mba ụwa.

David De Gea ekwetala?

David De Gea

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Ochee goolu ndị otu bọọlụ Manchester United, David De Gea

Onye nlekọta otu egwu Manchester United bụ Ole Gunnar Solskjaer sị n'olileanya dị na David De Gea ga-etinye aka n'akwụkwọ ịnọgide n'otu egwu bọọlụ ahụ.

Ọ bụrụ na nke a nwee isi, a ga-na akwụ De Gea ihe ruru puku pound narị atọ na ọkara kwa izuụka.

Akụkọ ga-amasị gị:

Lee ihe onyoonyoo ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Prof Austin Nwagbara: A dụrụ ihe onyonyo ahụ tinyere m na nsogbu na mahadum Ghana adụ