Nigeria Election 2019: Mbaka, Oyedepo na ụkọchukwu ndị ọzọ okwu ha na-adị ire

Ebe foto si, Twitter/NGR_Presidency
Ọtụtụ oge ka a na-ahụ ndị na-azọ ọkwa ndọrọndọrọ ọchịchị ka ha na-aga n'ụlọụka dị iche iche ma oge ntuliaka ruwe nso.
Ebe ụfọdụ ndị na-ahụta ya ka amansị ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-eme makana ha ma ụdịrị ikike ndị ụka nwere na ndụ ndị Naịjirịa, ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-ahụta ya dịka na ha chọrọ "ịnata ngọzị".
Ọtụtụ oge ka ndị ụkọchukwu na-anọ n'elu ebe ha na-aka ụka, ma na-ebukwa amụma maka ihe ga-eme na ntụliaka maọbụ n'ọchịchị Naịjirịa.
Ụfọdụ oge, ọ dabara ndị nọ n'ọchịchị, ụfọdụ oge amụma ahụ agaghị adaba, ọ kpọtụwa.
Ndị ụkọchukwu na-akpa ike:
1) Fada Ejike Mbaka
Mbaka bụ otu onye ọ na-abụ o kwuo sị wụlie elu, ndị ụka ya bụ Adoration Ministry Enugu, ajụọ ya, "kedụ ebe ị chọrọ ka anyị wụruo?"

Ebe foto si, Facebook/Adoration ministries
Ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ma nke a, ya mere ha na-eji akpọku ya, maọbụ agara ya njem nleta n'ụlọụka ya, ebe ha ga-ezute ndị "ụmụazụ" ya n'ihu n'ihu.
Kwa ntuliaka, Mbaka na-ebu amụma onye ga-enweta mmeri na ntuliaka na onye enweghị ebe o ji azụ aga.
N' afọ 2015, Mbaka buru amụma na Goodluck Jonathan agaghị emeri na ntuliaka ọkwa onyeisiala nke afọ ahụ n'ihi na Chineke ajụla ya, kama na Muhammadu Buhari ga-enweta mmeri.
Amụma ya ahụ adịghị ọtụtụ ndị mmadụ mma ọkachasị Ndigbo n'ihi ịhụnanya ha nwere n'ebe Jonathan nọ, mana Buhari mechara merie.

Ebe foto si, MBuhari Twitter
N'ọnwa Julaị 2018, Mbaka wụgharịrị kwuo na ọchịchị Buhari bụ 'Demon-cracy', na ọ bụghị Democracy .
Ọmụmatụ ọzọ gosiri ụdị ike o nwere na ndọrọndọrọ ọchịchị bụ oge Hope Uzodimma nọchitere anya onyeisiala Buhari ka Mbaka na-eme ire ahịa owuwe ihe ubi (Bazaar) n'ọnwa Disemba.
Uzodimma kwuru na Buhari nyere ya nde naịra abụọ ka o jiri "waa ọjị" n'emume ahụ, ma kwekwa nkwa iwuru ụka ahụ ụlọọgwụ nke ha.
N'otu emume ahụ, o kwukwara na Atiku ịbụ onyeisiala nwere ike ịbụ ọnọdụ "ire enwe gote nkịta".
2) David Oyedepo
Ọ bụrụ na ị maghị Oyedepo maka inwe otu n'ime ụlọụka kachasị nwee ndị na-aga ya na Naịjirịa,Living Faith Church, nke e ji 'Winners Chapel' mara, ị mara ya maka ugboro ole ọ na-emeta ihe e ji akpụ ya n'ọnụ.
Maka etu ụlọụka ya ha, ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-abịa njem nleta ebe ahụ, ọkachasị ma oge ntuliaka na-eru.
Ndị dịka Goodluck Jonathan bụ aka chịburu Naịjirịa, Atiku Abubakar na-azọ ọkwa onyeisiala nakwa Kingsley Moghalu, so na ndị ndọrọndọrọ zuterela Oyedepo.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Ọtụtụ ndị bụ isi a hụrụ kwaba okpu n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjirịa, bụ ndị na-aka ụka n'ụlọụka ya.

Ebe foto si, Kinsley Moghalu Facebook
Na Nso nso a, Oyedepo kpalitere okwu na soshal midia oge o tinyere ọnụ n'okwu gbasara ma ọ bụ "ezigbo" Buhari nọ n'Aso Rock ka ọ bụ "adigboroja".
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
3) Enoch A. Adeboye
Adeboye bụ onyeisi Redeemed Christian Church of God (RCCG), so na ndị ọzọ okwu ha na-ada ụda na Naịjirịa ma n'ụka ma na ndọrọndọrọ ọchịchị.
N'agbanyeghị na ọ bụ nwoke na-anaghị emesi ike (ọ na-ekwu okwu nwayọ nwayọ), o kwuo okwu, a na-akwụsị gee ya ntị.
Yemi Osinbajo bụ osote onyeisiala Naịjirịa ugbua, bụ onye ụkọchukwu n'ụlọụka a; e nwekwara ọtụtụ ndị ụkọchukwu ha ndị ọzọ nọ na ndọrọndọrọ ọchịchị.
Aka chịburu Naịjirịa bụ Goodluck Jonathan nakwa Olusegun Obasanjo, so na ndị na-abịa eleta Adeboye n'ụlọụka ya.
O zutekwara Buhari na London oge ahụ adịghị ya.

Ebe foto si, Facebook/Femi Adesina
4) TB Joshua
Joshua bụ onye ụkọchukwu ọzọ ọtụtụ ndị Naịjirịa anaghị eji egwu egwu, ọkachasị makana ha kwenyere na amụma ya na-abịakarị na mmezu.
Kwa afọ ka ọ na-ebu amụma metụtara ọchịchị Naịjirịa nakwa ndị ndọrọndọrọ ọchịchị, n'ụlọụka ya bụ Synagogue Church of All Nations (SCOAN).
N'ọnwa Julaị nke 2018, Joshua buru amụma ebe o kwuru ka "ndị mmadụ kpeere Naịjirịa ekpere maka ntuliaka na-abịa", makana ọ rọrọ nrọ ugboro ugboro maka "ihe ndapụta nwere ike ịdapụta n'usoro ntuliaka 2019".
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
N'ọnwa Ọktoba 2018, Buhari kwuru na ndị ụka ekwesịghị itinye ọnụ n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị, makana o nwere ike ibutere ha mkparị.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
5) Mathew kukah
Kukah bụ ụkọchukwu Sokoto Catholic Diocese, bụ otu onye ọzọ ọnụ na-eru n'okwu na ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa.
O so na ndị ụkọchukwu zuterela onyeisiala Buhari; o zutere ya na 2015.
N'ọnwa Epreelụ 2018, Kukah kpọkuru Buhari sị ya gbaa mbọ hụ na o mezuru nkwa niile o kwere tupu ọ bụrụ onyeisiala.
6) Tunde Bakare
Bakare bụ ụkọchukwu ụka a kpọrọ Latter Rain Assembly, abụghị sọ onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị, o sorola zọọ ọkwa ọchịchị.

Ebe foto si, Getty Images
N'afọ 2011, Buhari kpọorọ ya zọọ ọkwa onyeisiala n'okpuru pati CPC, nke Bakare zọrọ dịka osote ya, mana ha emerighị.
7) Poju Oyemade
Oyemade bụ ụkọchukwu Covenant Christian Centre, ebe ọ na-anọ ahazi nrụrịtaụka gbasara ntuliaka nke Bekee kpọrọ "election debate" n'etiti ndị na-azọ ọchịchị, ma ntuliaka ruo.
Ọ na-akpọ nrụrịtaụka a "The Platform".
Ụkọchukwu ndị ọzọ ọnụ ha na-eru n'okwu ndọrọndọrọ
- Johnson Suleiman
- Ayo Oritsejafor











