Nigeria Election 2019: Ndị na-azọ ntuliaka na osote ha

Ndị na-azọ ọkwa onyeisiala

Ebe foto si, Buhari and Ezekwesili

Lee mmadụ isii na-azọ ọkwa onyeisiala ndị mmadụ kacha anụ aha ha na ndị osote ha:

Ka otu na-ahụ maka ntuliaka na Naịjirịa bụ "Independent National Electoral Commission (INEC)" bipụtara akwụkwọ gosiri na ihe karịrị mmadụ iri asaa na-azọ ọkwa onyeisiala na 2019, BBC Igbo chọrọ igosi gị ndị nke aha ha kacha ada ụda.

N'ime mmadụ isii a na ndị osote ha, e nwere ụmụnwaanyị atọ n'ime ha; otu na-azọ onyeisiala ebe ndị ọzọ na-azọ osote.

1) Muhammadu Buhari na Yemi Osinbajo

Buhari na Osinbajo

Ebe foto si, Twitter/mBuhari

Nkọwa foto, Buhari na Osinbajo achịala Naịjirịa kemgbe afọ 2015 n'okpuru pati All Progressives Congress (APC)

Onye bụ Muhammadu Buhari?

  • A mụrụ ya n'ụbọchị iri na asaa nke ọnwa Disemba afọ 1942
  • Ọ chịala Naịjirịa ugboro abụọ; dịka onye agha nakwa onye nkịtị
  • Ọ zọrọ ọkwa onyeisiala ugboro atọ (2003, 2007 na 2011) tupu ọ zọta ya n'afọ 2015
  • N'otu aka a ọ bụ onyeisiala, ọ bụkwa onye mịnịsta na-ahụ maka mmanụ amịpụtara n'ala

Onye bụ Yemi Osinbajo?

  • A mụrụ ya n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Maachị afọ 1957
  • Ọ bụ ụkọchukwu n'ụka Redeemed Christian Church of God(RCCG)
  • Ọ zọtara ọkwa osote onyeisiala Buhari n'afọ 2015
  • Ọ bụkwa ọkaiwu ọnụ na-eru n'okwu

2) Atiku Abubakar na Peter Obi

Atiku Abubakar na Peter Obi

Ebe foto si, Atiku Abubakar/Peter Obi

Nkọwa foto, Atiku na Obi na-efe ọkọrọtọ Peoples Democratic Party (PDP) na ntuliaka 2019 a

Onye bụ Atiku Abubakar?

  • A mụrụ ya n'ụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa Nọvemba n'afọ 1946
  • Ọ bụ osote onyeisiala site n'afọ 1999 ruo 2007
  • Ọ zọọla ọkwa onyeisiala dịka onye bu ọkọrọtọ pati ya ugboro abụọ; n'afọ 2007 n'okpuru AC nakwa 2018 n'okpuru PDP
  • Ọ bụ onye achụmnta ego nwere ọtụtụ azụmahịa dị iche iche

Onye bụ Peter Obi?

  • A mụrụ ya n'ụbọchị iri na itoolu nke ọnwa Julaị n'afọ 1961
  • Ọ zọtara gọvanọ Anambara steeti n'okpuru pati APGA n'afọ 2003 mana ọ rigoghị n'oche ruo Maachị 2006 mgbe o meriri n'ụlọikpe, mana e mechara chutuo ya n'ọnwa Nọvemba afọ ahụ.
  • O mechara lọghachita n'oche ya na Febrụwarị 2007, ma pụọ na Mee oge Andy Uba meriri ya, mana ụlọ ikpe kwuru ka a hapụ ya nọzuo afọ anọ ya.
  • O rituru n'oche dịka gọvanọ Anambara n'afọ 2014 ka ọ chizuru ugboro abụọ
  • Ọ bụ onye ọkachamara n'ihe gbasara akụnaụba

3) Oby Ezekwesili na AbdulGaniyu Galadima

Ezekwesili na Galadima

Ebe foto si, Oby Ezekwesili

Nkọwa foto, Galadima bụkwa onyeisioche otu pati Allied Congress Party of Nigeria (ACPN) ha chọrọ iji zọta ọchịchị

Onye bụ Oby Ezekwesili?

  • A mụrụ ya n'ụbọchị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Epreelụ 1963
  • Ọ bụ mịnịsta na-ahụ maka ihe e gwuputara n'ala site na 2005 ruo 2006 nakwa nke agụmakwụkwọ site na 2006 ruo 2007
  • O so hibe otu "Bring Back Our Girls (BBOG)" na-ahụ maka ụmụaka Chibok a tọọrọ kemgbe afọ 2014
  • O merie, ọ ga-abụ nwaanyị mbụ ga-abụ onyeisiala na Naịjirịa

Onye bụ Ganiyu Galadima?

  • A mụrụ ya n'ụbọchị iri na otu ọnwa Jun nke afọ 1964
  • Ọ gụrụ akwụkwọ na Mahadum Kwara steeti ebe o mechara bụrụ otu onye n'ime otu ndị na-achị n'ụlọ akwụkwọ ahụ
  • Ọ bụbu onye zọrọ oche onyeisiala n'okpuru pati ACPN n'afọ 2015
  • Ọ bụ onye ojiegoachụego

4) Kingsley Moghalu na Umma Getso

Moghalu na Getso

Ebe foto si, Kingsley Moghalu

Nkọwa foto, Moghalu na Getso na-azọ ọkwa n'okpuru pati Young Progressive Party (YPP)

Onye bụ Kingsley Moghalu?

  • A mụrụ ya n'ụbọchị asaa nke ọnwa Mee nke afo 1963
  • Nke a bụ mbụ ọ na-azọ ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa
  • Ọ gụru akwụkwọ ma nata asambodo dịka ọkaiwu na mahadum
  • Ọ bụkwa onye ọkachamara n'ihe gbasara ịchekwa akụnaụba.
  • Ọ rụrụ dịka directọn n'ụlọakụ etiti nke a kpọrọ Central Bank of Nigeria(CBN) na bekee.

Onye bụ Umma Getso?

  • A mụrụ ya n'afọ 1981
  • Ọ bụ osote onyeisioche otu pati ha bụ YPP
  • Ọ bụ onye ojiegoachụ ego, nakwa onye na-agba mbọ n'ihe gbasara ikike ruuru ụmụnwaanyị

5) Omoyele Sowore na Rabiu Ahmed Rufai

Sowore na Rufai

Ebe foto si, Omoyele Sowore

Nkọwa foto, Sowore na Rufai na-azọ ọkwa n'okpuru pati African Action Congress (AAC)

Onye bụ Omoyele Sowore?

  • A mụrụ ya n'ụbọchị iri na isii nke ọnwa Febrụwarị 1971
  • Ọ bụ onye na-ebu ihe gbasara ikike dịrị onye n'isi. Ọ malitere ya oge ọ ka nọ na mahadum
  • O hibere ụlọọrụ ntaakụkọ 'Sahara Reporters'
  • O hibere otu pati AAC n'ọnwa Ọgọstụ nke 2018

Onye bụ Rabiu Ahmed Rufai?

  • A mụrụ ya n'ụbọchị iri na asaa nke ọnwa Julaị 1976
  • Ọ bụ dibia Bekee maọbụ dọkịnta bụ ọkachamara n'ihe gbasara ahụ ike
  • Ọ kuziburu nkuzi na mahadum Bayero dị na Kano

6) Fela Durotoye na Khadijah Abdullahi-Iya

Durotoye na Abdullahi-Iya

Ebe foto si, Fela Durotoye

Nkọwa foto, Durotoye na Abdullahi-Iya na-azọ ọchịchị n'okpuru pati Alliance for New Nigeria (ANN)

Onye bụ Fela Durotoye?

  • A mụrụ ya n'ụbọchị iri na abụọ nke ọnwa Mee n'afọ 1971
  • Ọ gara mahadum Obafemi Awolowo dị n'obodo Ile-Ife
  • Ọ bụ onye na-akụziri ndị mmadụ etu e si eji ego achụ ego, ma bụrụkwa onye na-eji okwu akpalite mmụọ ndị mmadụ
  • Ọ na-azọ ọkwa Onyeisiala n'okpuru pati Alliance for New Nigeria (ANN)

Onye bụ Khadijah Abdullahi-Iya?

  • Ọ bụ onye hibere otu na-ahụ maka nlekọta ụmụnwaanyị bụ "Women Community of Africa (WCA)" nakwa "Rags to Riches (R2R)"
  • Ọ bụkwa onye ọkaiwu

Kedụ onye ị ga-atụnyere?