A kwaala Onyeisiala Muhammadu Buhari emu na Maiduguri

Onyeisiala Muhammadu Buhari

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Ndị mmadụ pụtara were kwaa onyeisiala Muhammadu Buhari emu na Maiduguri dịka ọ biara iti ha aka n'obi maka mwakpo ndị otu Boko Haram Wakporo ha n'ụbọchị sunde.

Ọ bụ na mpaghara Yan Nono dịka o ji ụgbọala aga ụlọ gọọmentị ha ka ha pụtara n'ụzọ kwaa ya emu.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

N'aka nke ọzọ, e nwekwara ụfọdụ ndị pụtara were bunye ya ụkpa ekele.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Nke mere na Kaduna

Ndị oji egbe egbu egbuola ihe ruru mmadụ iri abụọ nke gunyere mmadụ iri na isii si n'otu ezinaụlọ.

A na-eche na ọ bụ otu si na Boko Haram pụta nke a na-akpọ Ansaru kpara arụ a.

Bishọp Mathew Hassan Kukah

Bishop Mathew Kukah
Nkọwa foto, Bishop Mathew Kukah

Onyeisi ụka Katọlik na Sokoto steeti bụ Bishọp Mathew Hassan Kukah ekwuola na ọchịchị onyeisi Muhammadu Buhari emeela ọtụtụ ndị Naịjirịa e chete e bewe.

Kukah kwuru nke a n'olili Michael Nnadi bụ nwata akwụkwọ semịnarị nke ndị ekperima tọọrọ na Kaduna ma mechaa gbuo ya.

N'okwuchukwu ya n'ofufe nru akwamozu Michael, Kukah kwuru na enwebeghị mgbe ogbugbu mmadu na ihe isi ike ka njọ na Naịjirịa ruo ka ọ dị ugbua.

Ọ gara n'ihu kwuo na Buhari awụfuola nkwa niile o kwere oge ọ na-azọ ọchịchị n'afọ 2015.

Oge a na-ebubata ahụ Michael Nnadi maka 'mass' ikpeazụ ya.

Ebe foto si, Catholic TV Nigeria

Nkọwa foto, Oge a na-ebubata ahụ Michael Nnadi maka 'mass' ikpeazụ ya.

Kukah chetere nkwa niile Buhari kwere n'ọgbakọ 'Chatham House' dị na London maka ibibi ndị Boko Haram ma mee ka ndịagha Naịjirịa nwee ezi ndụ.

"Mana onweghị onye ma na ọchịchị Ọchịagha Buhari ga-eweta nnukwu nkewa n'etiti ndịagha Naịjirịa na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ."

"Ọ dizi ka na tupu mmadụ enwee ọkwa di elu na Naịjirịa taa, onye ahụ ga-abụrịrị onye ụka alakụba si mpaghara ugwu."

Matthew Kukah na Naịjirịa

Ebe foto si, Matthew Hassan Kukah Facebook

Nkọwa foto, Bishọp Kukah sị na mwufu obara na mmebi akụnaụba obodo Naịjiria karịrị akarị.

Kukah kwuru sị na "onweghi onye ma ihe echi ga-eweta maka ọnọdụ Naịjirịa nọ n'ime ya."

Mana Kukah rịọrọ ndị otu Kraịst bi na Naịjirịa ka onye ọbụla zeere tigbuo zọgbuo maka na ọ bụghị ya ka mma.

Aha onyonyo, Ihe mere ndị ntọ jiri tọrọ nne m - Okonjo-Iweala

Cheta na ndị ntọ wakporo ụlọakwụkwọ ebe a na-azụ ndị ga-echi ụkọchukwu na Kaduna n'ọnwa Jenụwarị ma tọrọ ụmụakwụkwọ anọ.

Aha ụlọakwụkwọ ahụ bụ 'Good Shepherd Major Seminary'.

E mechara tọhapụ mmadụ atọ n'ime ụmụakwụkwọ ahụ ma gbuo otu n'ime ha bụ Michael Nnadi.

Gọọmenti ga-akwụ Sowore puku narị abụọ

Shehu Sani na Omoyele Sowore

Ụlọikpe dị n'Abuja ebugala ikpe Omoyele Sowore na nke gọọmentị gaa n'ụbọchị Tọọzde 13 Febụwarị, 2020.

Ọkaikpe Ijeoma Ojukwu were iwu sị na ọkaiwu gọọmenti etiti na-egbu oge n'ikpe ahụ ma nye iwu ka ha kwụọ Sowore ego dị puku narị abụọ maka nke a.

Mgbe ọkaikpe Ijeoma kpọpụtara ọkaiwu gọọmenti ka ọ bịa sara ọnụ ha, ọ si na ha adịghị njikere kamgbe ọkaiwu ukwu nke gọọmentị etiti napụrụ ha ikpe ahụ n'aka n'ọnwa Disemba 2019.

Nke a were ọkaikpe Ijeoma iwe mere o ji sị ka ha kwụọ Sowore ụgwọ maka igbu oge.

Ụlọikpe a jupụtara na ndị isi okpokpo dịka Wole Soyinka, Shehu Sani, Chidi Odinkalu na ndị ọzọ bịara ịdonyere Sowore ukwu.

Agaghị eme ndị lụrụ nwaanyị Fada - Pope Francis

Pope Francis

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Pope Francis

Onyeisi ndị ụka Katọlik bụ Pope Francis efufeela isi were sị na agaghị echi ụmụnwoke ndị lụgoro nwaanyị fada.

Ọ bụ maka na e nweghịzị ndị fada na mpaghara Amazon butere okwu a, mana Pope Francis Kagburu ya.

Nkwekọrịta Naịjirịa na Ethiopia

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Naịjirịa na mba Ethiopia e kwerikọtala ibelata ọnụego akwụkwọ njem n'etiti ndị ọrụ gọọmenti abụọ ndị a.

Ndị tinyere aka n'akwụkwọ a bụ minista na-ahụ maka mba ọzọ na Naịjirịa bụ Geoffrey Onyeama na nke mba Ethipia bụ Gedu Andargachew.

'Ọmụgwọ ga-abụzi ọnwa isii n'Ekiti Steeti'

Kayode Fayemi

Ebe foto si, Fayemi/Twitter

Gọvanọ na-achị Ekiti Steeti bụ Kayode Fayemi agbatịala oge ezumike ụmụnwaanyị mụrụ nwa na steeti ahụ ka ọ bụrụ ọnwa isii.

N'ozi sị n'aka odeakwụkwọ mgbasaozi pụta, Fayemi sị na nke a wulite ahụike ndị ụmụaka nakwa ndị nne nọ n'ọmụgwọ.

WHO enyela coronavirus aha

Ndị China

Ebe foto si, Getty Images

Ụlọọrụ ahụike mbaụwa bụ World Health Organisation akpọọla okwu aha site n'inye coronavirus aha nke ha kpọrọ Covid-19.

Otu a sị kwara na ha na-agbasi mbọ ike igbochi mmụbanye ọrịa a na-egbuola mmadụ karịrị otu puku.

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 4

N'Egwuregwu

Joseph Yobo

Jospeh Yobo

Ebe foto si, Jospeh Yobo/ Instagram

Nkọwa foto, Joseph Yobo gbaburu boolụ dịka onyeisi ndị otu ewgu bọolụ Super Eagles

Ngalaba na-ahụ maka bọolụ na Naijirịa bụ Nigerian Football Federation (NFF) emeela Jospeh Yobo osote onye nchịkọta ndị Super Eagles.

Nkea na-abịa dịka e wepụrụ Imam Amapakabo dịka osote onye nchịkọta otu Super Eagles n'ụbọchị Wednesde.

Joseph Yobo onye gbaburu ndị otu Everton na Gernot Rohr ga-arụzi ọrụ.

Ousmane Dembele

Ousmane Dembele na Lionel Messi

Ebe foto si, Getty Images

Ousmane Dembele na-agbara Barcelona bọọlụ agaghị agba bọọlụ ruo ọnwa isii dịka awara ya ụkwụ maka mmerụ ahụ n'akwara.

Nke a pụtara na ọ gaghị eso ndị France gbaa asọmpi Euro 2020.

Chaị nwamadị a ahụla ihe ooo.

BBC Nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe onyonyo

Aha onyonyo, Ọgba mbọ: "Ihe niile nwoke na-eme nwaanyị ga-eme ya karịa"