Buhari akatọọla ndị oji egbe gburu mmadụ 12 na steeti Platu

Ebe foto si, Boko Haram
Mwakpo e mere n'ime obodo Kulben dị na Platu steeti ataala isi mmadụ iri na abụọ ma merụọ otu ọzọ ezigbote ahụ.
Ndị uweojii sị ọ bụ n'ehihe Wenesde ka ndi oji egbe wabatara na ya bụ obodo ma malite kwawa mgbọ.
Onyeisila Muhammadu Buhari katọrọ mwakpo ma sị na a ga-achọpụ ndi kpara mkpa mkpa a.
NLC sị ndị Gọvanọ akwụbeghị ọgwọ ọnwa opekatempe sonye ọsịsọ

Ebe foto si, AFP
Otu ndị ọrụ akpọrọ Nigerian Labour Congress enyela aka na-achị steeti dị iche iche na Naịjirịa ruo ngụcha ọnwa Janụwarị 2020 ịsonye qụọ ọgwọ ọnwa opekatampe ha na gọọmentị kwekọrịtala n'afọ 2019.
Ha sị na ọ bụ sọsọ steeti isii malitere ịkwụ ụgwọ ọnwa opekatampe a.
N'Ofesi,

Ebe foto si, Getty Images
Nwunye nwa eze Harry bụ Meghan ahapụla mba Briten gawa Canada dịka ya na di ya kwuru na ha na-awụsa ọwa n'iso n'ihe ndị be Ezenwanyị Eliza na-eme.
Ezenwaanyị Eliza na onwe ya ekwuola site n'ọnụ ndi na-ekwuru ya na a na-achọ usoro nhazi ọnọdụ mmadụ abụọ a.
N'Egwuregwu,

Ebe foto si, Rangers FC
Ọ ga-akpọtụ akpọtụ n'Enugwu ụbọchị Sonde oge Rangers na otu egwuregwu Nouadhibou nke Mureshus ga-ezute onwe ha na ama egwuregwu Nnamdi Azikiwe
Asọmpị a bụ nzute nke abụọ otu abụọ n'iko CAF nke ọkpọ a .
Ndị ntọrị atọrọla Seminarian anọ na Kaduna

Ebe foto si, Getty Images
Ndi uweojii na Kaduna si ndị ntọrị yi uwe ndi agha tọọrọ ụmụakwụkwọ anọ n'ụlọakwụkwọ akpọrọ Good Shepard Major Seminary dị n'ụzọ Abuja.
Ndị uweojii sị na ha na-achụ ndị kpara ike n'ike iji zọpụtata ụmụakwụkwọ a.
Ndị omekome egbuola ndị agha Niger

Ebe foto si, Getty Images
Ndị omekome a na-eche na ha na Alqeada nwere mmekọ egbuola ndị agha iri abụọ na ise na oke ala mba Niger na Mali.
Isi mmadụ iri isi na ato n'ime ndị bịara ọgụ a nakwara mụọ na ya bụ mkpa mkpa kpara ụnyaahụ
N'Ofesi,

Ebe foto si, Getty Images
Mba Amerịka na Canada na-ebo mba Iran ebubo na ọ bụ ha ji ogbunigwe elu gbatuo ụgbọelu mba Ukraine si ọdọ ụgbọelu ha fepu.
Ha sị na ọ bụ na-amaghi ama ka Iran jiri mee ihe mana Iran na-ago si na ha ka na-eme nyocha ihe kpatara ya bụ ụgbọelu jiri daa
N'Egwuregwu,

Ebe foto si, Getty Images
Real Madrid and Atletico Madrid ga-ezute onwe ha na mgbacha iko akpọrọ Spanish Super Cup ga-esu ụbọchị Sunday.
Atletico jị ọkpọ gọọlụ atọ asatara abụọ merie Barcelona ụnyaahụ ji tozuo









