CAMA Act: Fada Mbaka akatọọla iwu 'CAMA'

Father Ejike Mbaka

Ebe foto si, Adoration ministries

Nkọwa foto, Mbaka kwuburu na Buhari bụ "onye nzọpụta"
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Fada Ejike Mbaka adọọla gọọmenti aka na ntị ka ha wepụ aka n'okwu gbasara ụlọụka tupu ha anọrọ n'oche ọchịchị ree ure.

'CAMA' bụ iwu gbasara etu e si edebanye aha ụlọọrụ ọbụla na Naịjirịa nke gụnyere ụlọụka nakwa ụlọọrụ na-abụghị nke gọọmentị nke bekee kpọrọ 'Non-Governmental Organisations' nke e megharịrị na nsonso ma nye gọọmenti ikike iwepụ onyeisi ụka maọbụ NGO ma ọ bụrụ na e nwee ebubo nrụrụaka.

Fada Ejike Mbaka, onye gbarụrụ ihu maka iwu 'CAMA' tata bụ Wenezde n'ọgbakọ 'Adoration' o nwere n'Enugwu gwara gọọmenti ka ha wepụ aka na CAMA ahụ dịka o kwuru na-akwado imegbu ụka.

"Unu bụ gọọmentị gbaso ụka mgba, unu nwere ike ree ure n'oche ọchịchị."

"Onye ọbụla na-agba ụka mgba na-agba christ mgba."

Ọ gara n'ihu kwụọ sị, "Obi adịghị m ọcha. Oge adịghị anya, Mụọ Chukwu ga-eme ihe ga-ama obodo Naijiria jijiji."

Mbaka gwara Onyeisiala Muhammadu Buhari ka o cheta nkwa niile o kwere tupu ọbata n'ọchịchị.

Fada kwuru na ọ bụrụ na ndị gọọmenti ewepụghị anya na Ụka, ụfọdụ n'ime ha nwere ike ire ure n'oche ọchịchị.

Mbaka kwuru na gọọmenti kwesiri ị na-enye ndị ntorobịa ọrụ, ime ka nrị dị n'obodo nakwa ọtụtụ ihe eji enyere ndụ aka karịa itinye anya na ka ụka chineke sị aga.

CAN, Falana ajụla iwu CAMA, ebe Serap sị na ha ga-akpapụ gọọmentị ụlọikpe

Sam Ayokunle,David Oyedepo na Femi Falana

Ebe foto si, Ayokunle,Oyedepo,Falana/Facebook

Nkọwa foto, Sam Ayokunle, David Oyedepo na Femi Falana gbarụrụ ihu maka iwu 'CAMA'

Otu jikọrọ ndị okpukpere Kraịst bụ 'Christian Association of Nigeria (CAN) ajụla iwu ọhụrụ e mere maka ihibe otu maọbụ ụlọọrụ na Naijiria a kpọrọ 'Companies and Allied Matters Act' si na ọ bụ "akaọrụ ekwensu."

N'ozi nke Adebayo Oladeji bụ onye enyemaka pụrụ iche nye onyeisi CAN bụ Samson Ayokunle wepụtara, CAN sị, "Ndị ndu otu 'Christian Association of Nigeria' jụrụ kpamkpam iwu 'Companies and Allied Matters Act, 2020' nke onyeisiala Muhammadu Buhari binyere aka na nsonso a."

Ọjụjụ CAN na-ajụ iwu a na-abịa dịka otu na-agba mbọ maka ikike dịrị onye bụ Socio - Economic Rights And Accountability Project (Serap) na-ekwu na ha ga-akpụpụ gọọmenti ụlọikpe maka iwu ahụ ha kpọrọ "iwu mkpagide".

Iwu ọhụrụ a kpọrọ 'CAMA' n'aha ịchafụ ebutela nnukwu nghọtahie na Naịjirịa.

Serap kwuru si, " Iwu 'Companies & Allied Matters Act (CAMA) 2020' bụ iwu mkpagide kachasị kemgbe Naijiria ji bido."

"A ga-eji ya gaa n'ihu ịkpagbu ikike dịrị ụmụafọ. Anyị ga-agbagha ya n'ụlọikpe."

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Ọtụtụ ndị mmadụ nwere agba gụnyere ndị isi ụka, akatọọla iwu ha sị na ọ bụ iji iko kunye enwe mmiri, n'ihi na gọọmenti nwereike isi n'azụ ụlọ napụ ndị mmadụ ikike dịrị ha.

Dịka ọkaiwu a ma ama bụ Femi Falana si kwuo, iwu ahụ a hazigaharịrị nke nyere ngalaba gọọmenti ikike iweghara otu nke onyeisi ya dajọrọ, megidere iwu Naijiria.

"O megidere ikike dịrị mmadụ ịgbakọ dịka o si dị n'akụkụ 40 nke Iwu Naijiria."

Ihe ndị ụkọchukwu na-ekwu

David Oyedepo

Ebe foto si, Winners Chapel

Cheta na onyeisi ụlọụka 'Living Faith Church' bụ David Oyedepo tinyere ọnụ n'okwu a n'ụbọchị ụka gara aga.

O kwuru na o nweghi gọọmentị ọbụla pụrụ ịtinye mmadụ ka o lekọta ụlọụka ọbụla si ahazi onwe ha.

"Naịjirịa bụ ebe ndị mmadụ nwere mwereonwe n'ofufe, atụmatụ a bụ ụzọ a chọrọ iji jichi ụlọụka" ka o kwuru n'ihe onyonyo na-efegharị

Gere ya n'uju ebe a:

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Gịnị dị n'iwu ọhụrụ CAMA na-akpasu ndị isi ụka iwe?

Úlóúka

Ya bụ iwu gbasara etu esi edebanye aha ụlọọrụ ọbụla na Naịjirịa nke gụnyere ụlọụka dị icheiche nakwa ụlọọrụ na-abụghị nke gọọmentị nke bekee kpọrọ 'Non-Governmental Organisations'.

Ọ bụ iwu CAMA ka e ji hibe ngalaba 'Corporate Affairs Commission' nke ọrụ ya bụ idebanye aha ụlọọrụ dị iche iche n'akwụkwọ gọọmentị.

Mana ihe na-akpata nghọtahie na ya bụ iwu bụ ebe o kwuru na gọọmentị nwere ike iwepụ onyeisi ụlọọrụ maọbụ ụlọụka ọbụla ma tinye onye ọbụla dị ha mma ma ọ bụrụ na e nwee mkpesa na ndịisi ụlọọrụ maọbụ ụlọụka ahụ tinyere aka na nrụrụ aka.

Ụfọdụ cheere na akụkụ 839 dị n'ime ya bụ ụzọ gọọmentị si chọọ ịtinye ụkwụ n'ihe na-eme n'ụlọụka.

CAMA

Ndị ọzọ dịka Roland Nzimora chere na ọ bụ ezi ihe ma gọọmentị chọọ ịtịnye otu anya n'ihe na-aga n'ụlọụka

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Ndị ọzọ na-ekwu na ọ bụ ụfọdụ ihe dị n'iwu 'Social Media Regulation' bụ nke ụmụ Naịjirịa kwuru na ha achọghị, ka ndị omeiwu tinyere n'ime iwuo ọhụrị a.

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 4

Gịni ka ọ pụtaara ụlọụka dị icheiche?

Mega church

Ebe foto si, Getty Images

Otu onye ọkaiwu bụ Amarachi Nwankwo gwara BBC Igbo n'ekwentị na iwu ọhụrụ a dị mma n'ebe ụlọụka nọ.

O kwuru na ihe iwu a pụtara bụ na gọọmentị ga na-elebanye anya n'ihe na-aga n'ụlọụka etu ha si elebanye anya n'ụlọọrụ ọbụla dị icheiche.

Nwankwo kwuru sị: "Ụlọụka ọbụla dị na Naịjirịa nọ n'okpuru CAC (Corporate Affairs Commission) nke nọ n'okpuru CAMA, ya mere na iwu ọbula CAMA tinyere ga-emetụta ha"

"Ọ bụkwa iji chekwaa ndị mmadụ n'ebe ụlọụka adịgboroja nọ, ọ bụghị ịbanye n'ebe ahụ were oche eze ka iwu a bịara ime".

Kedụ ihe ndị ụkọchukwu na-ekwu?

Ihe ndị ọzọ dị n'iwu CAMA a emegharịrị ọhụrụ

Ihe ọhụrụ dị n'iwu CAMA nke a emegharịrị ọhụrụ buru ibu.

Ọtụtụ ndị ọkaiwu kwuru na ya bụ iwu mara mma n'ihi na o mere ka ọ dịwanye mfe mmadụ idebanye aha ụlọọrụ ya.

Lee ụfọdụ ihe ndị dị iche na'iwu CAMA nke ochie na nke ọhụrụ.

  • N'iwu ọhụrụ a, otu onye nwere ike idebanye aha ụlọọrụ. Iwu nke ochie kwuru na ọ ga-adịrịrị opekata mpe mmadụ abụọ tupu ha enwee ike idebanye aha ụlọọrụ.
  • N'iwu nke a, tupu ụlọọrụ ọbụla eree ihe ọbụla ha nwe, pasentị iri ise nke ndị niile tinyere ego ha n'ụlọọrụ ahụ ga-ekwekọrịta.
  • N'oge mbụ, onye chọrọ idenye aha ụlọọrụ ya ga-achọ onye ọkaiwu ga-agbara ya akaebe, mana ugbua, onye ahụ nwere ike iji aka ya dee akwụkwọ akaebe ahụ.
  • N'iwu nke ochie mmadụ ga-enwerịrị nke a kpọrọ 'Common Seal' tupu o nwee ike idebanye aha ụlọọrụ ya, mana ugbua, inwe 'Common Seal' abụghịzị iwu'
  • Ọ bụ iwu, n'iwu nke ochie, na ụlọọrụ niile ga-emerịrị ọgbakọ kwa afọ, mana n'iwu ọhụrụ a, ọgbakọ kwa afọ nke Bekee kpọrọ 'Annual General Meetings' abụghị iwu maka ụlọọrụ nta.

Ị chọọ ịgụ iwu CAMA nke ọhụrụ a n'uju, lee ya ebe a.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Ọgba mbọ: Ọrụ ugbo m na-arụ si m n'obi pụta