Ndị Naịjirịa anyị gbachiri ọdọ ahịa ha dara iwu ala anyị - Gọọmentị Ghana

Onyeisi mgbasaozi na ngalaba na-ahụ maka ịtụ mgbere na Gana bụ Prince Boakye Boateng ekwuola na ihe mere ha ji na-agbachi ọdọahịa ndị Naịjirịa na mba ahụ bụ makana iwu ha machiri ndị ofesi ịtu mgbere n'otu n'otu nke Bekee kpọrọ "retail".
Okwu Prince Boateng a na-abịa dịka ndị ofesi na mba ahụ - ọkachasị ndị Naịjirịa - na-eti mkpu na ndị na-arụrụ gọọmentị Gana ọrụ na-agagharị agbachisi ọdọ ahịa ha.
N'ụbọchị Satọde Kizito Ikechukwu Obiora bụ onyeisi "Nigerian Union of Traders Association" - bụ otu ndị Naịjiriịa na-azụ ahịa na mba Gana - gwara BBC na ndị ọrụ gọọmentị Gana na-agagharị na-agbachị ụlọ ọrụ ha.
Ọ sị na ihe a tinyere ọtụtụ mmadụ na gbagharịa.
"Ndị Naịjirịa nọ na Ghana ugbua na-ekwu na ọnọdụ ha bụzị kwara lawa, kwara lawa dịka gọọmnetị mba ahụ malitere njem a ọzọ."
Kizito sị na ndị Naịjirịa nọ na Gana na-ahụ ihe a na-eme dịka mmegide, ọkachasị ebe o si metụta ị gwa ha ka ha ghara ịtụ mgbere na ahịa nakwa ịsị ha dewe otu nde dọla tupu ha amalite ịzụ ahịa.
"Ọbụghị sọsọ idowe otu nde dọla bụ nsogbu. Nke ka nke bụ ịsị anyị ghara ịtụ mgbere n'ahịa. Nke a pụtara na anyị nwee otu nde dọla, anyi agawa n'ime ọhịa ga hibe ọdọ ahịa."
"Onye ga-abịa zụọ anyị ahịa ma ọ bụụ na anyị anọghị n'ahịa?"
'Rụwanu Naịjirịa Mall na Ghana'
Mana, Prince Boateng sị na ọ bụ iwu Gana ka ha na-eso dịka iwu ahụ kwuru ka ndị abụghị ndi Gana ghara ịre ahịa n'ime ahịa.
Ọ sị; "Anyị nwere Shoprite, nwee China Mall. Onweghi ihe gbochiri ndị Naịjirịa maọbu ndị mba ọzọ nọ Gana ịga rụọ ọdọ ahịa ma kpọọ ya "Nigeria Mall", maọbụ "Senegal Mall".
Ọ gakwara n'ihu kwuo na ọbụghị ndị Naịjirịa ka e ji maka ha wepụta atụmatụ a, mana ọ sị na bụ ndị Naịjirịa ka ọ kachasị emetụta.
O kwuru sị: "Ihe anyị na-ele anya bụ ma edenyela aha ọdọ ahịa ahụ n'akwụkwọ gọọmentị."
"Ọzọ bụ ịma ma ụlọọrụ ahụ o nwere akaebe na ọ na-akwụ ụtụ isi."
"Ọzọkwa bụ ma ngalaba a na-akpọ "Ghana Standards Authority" o kwuola ma ihe ụlọọrụ ahụ na-ere ọ bu ihe ziri ezi."
Mana Maazị Obiora sị na atụmatụ ndị a niile bụ usoro ndị Gana jiri chọọ ịchụ ndị Naịjirịa na mba ahụ, nke mere o ji jụọ: "mmadụ ole nwere otu nde dọla ha ga-eji tuọ mgbere na Gana?"
Ndị Naịjirịa ga-ala
Obiora si na ihe ga-echere ha ma ya bụrụ na okwu a ekweghị okwukwu bụ gọọmentị Naịjirịa ị bịa buru ndị Naịjirịa no Gana laa.
Mana Prince Boateng sị na otu nde dọla a na-ekwu okwu ya abụghị ka ndị Naịjirịa nye ha ego a.
Ọ sị: "ego a abụghị Gana ka ha na-enye ya, kama ọ bụ ego iwu sị na onye ọbụla si ofesi ga-etinyeriri na ụlọọru ya ma ya chọrọ ịtụ mgbere na Gana."
Maazi Obiora sị na ọ bụghi sọso nke a bụ isi okwu.
Ọ sị, "Iwu ha a sịkwa na anyị ga-ewe ndị Gana mmadụ 25 n'ọrụ."
Ọ bụghịzị ndị Gana na-azụ ahịa na-achụ ndị Naịjirịa
Obiora sị na ọbụghị ndị a kpọrọ Association of Ghana Traders na-achụ ha ugbua.
Ọ sị: "Ọ bụ gọọmentị na eme nke a ugbua."
Maazi Boateng kwenyere na nke ahụ. Ọ sị na oge ndị ahịa Gana gbachiri ọdọ ahịa n'afọ gara aga, gọọmentị gwara ha gaa gbapee ha.
"Otu ndị Gana na-azụ ahịa mere ihe gọọmentị kwuru, mana ndị Naịjirịa emeghị ihe a sị ha mee kemgbe ahụ. O bụ nke a butere ihe a gọọmentị na-eme ugbua."
Otu onye na-azụ ahịa n'obodo Akra ihe a metụtara gwara BBC na ya amaghị ebe ya ga-aga aga makana ya tinyere ihe niile ya nwere n'ahịa ha.
Ọ jụrụ: "Kedụ ebe mmadu dị ka mụ ga-enwete otu nde dọla a ha si anyị wete?"
Abdulaziz Ibrahim bụ onyeisi ngalaba na-anọchite anya Naijirịa na Ghana gwara BBC na ha na ndị mba ahụ na-akparịta ụka banyere okwu a.
Ọ sị: "Naịjirịa na Ghana na-emekọ ọfụma. Anyị ga-ahazi okwu nso nso a."












