Nigerians in Ghana: Anyị aṅụbeghi miri tọgbọ iko - Onyeisi ndị Nigeria na-azụ ahịa

Aha onyonyo, Okwu Kizito Obiora maka nsogbu ndị Naịjirịa na-enwe n'ahịa Ghana
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Dịka Kizito Ikechukwu Obiora bụ onyeisi "Nigerian Union of Traders Association" - bụ otu ndị Naịjiriịa na-azụ ahịa na mba Gana - siri kọwaara BBC Igbo ihe na-ebe ka na-ebekwa na mpaghara Ashanti na mba ahụ.

Site na Fraịde bụ abalị iri na anọ nke ọnwa Junn ruo ụbọchị Tusde nke izu a bụ izu atọ nke ọnwa Juun, ndị amaghị ndị ha bụ awakpochara ndị Naịjirịa ma manye ha ka ha gbachie ụlọ ahịa ha.

Maazị Obiora sị na agbanyeghị na ndị uweojii sị ha gbapee, ọtụtụ ndị mmadụ ka nọ na nkwụcha maka ha amaghị ihe ndị na-achụ ha bu n'obi.

Dịka Maazị Obiora siri kwuo, nsogbu a malitere oge ụmụokoroọbịa malitere ngagharị iwe na-asị ndị Naịjirịa kwara laa.

Ahịa Makola na mba Ghana

Ebe foto si, Getty Images

"Ndị a na-aghagharị na-aba n'ụlọ ahịa ndị mmadụ asị ha mechie maka na ha achọghị ndị Naịjirịa. Ha sị na anyị bụ ndị ntọrị."

Obiora sị na etiri ndị mmadụ ihe ma merụọ ụfọdụ ndị ọzọ ahụ.

Ihe onyonyo pụtara na soshal midia Gana gosiri ndị na-eme ọgbaghara a na-agụ egwu asị na ha achọghị ndị Naịjirịa na be ha.

Skip YouTube post
Hapụ Google YouTube ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Google YouTube. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Google YouTube iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of YouTube post

Obiora sị na ọbụghị ihe taata, na ọtụtụ mmadụ achọghị ọnụnọ ha nọ na Gana.

N'afọ 2018, ndị Naịjirịa nọ na Gana tikwara mkpụ maka mwakpo na ịchụpụ.

Ọnụ na-ekwuru uweojii na Ashanti bụ Godwin Ahianyo gwara BBC Igbo na uche ha dị n'ihe mere na ebe niile nọkwa juu ugbua.

Ọ gakwara n'ihu sị na ha na-eso nzụmụkwụ mmadụ abụọ ha sị aka ha dị na mkpa mkpa a.

Ọ sị: "Anyị na-enyo ihe nkiri pụtara n'ihe mere iji nwụchie ndị kpara ike a."

Ọ gakwara n'ihu kwuo na-agbanyeghi na onweghi onye aka ji ugbua, ha na-achọ mmadụ abụọ ha sị n'aka ha dị na ọgbaghara.

Naịjirịa chụru ndị Gana bi na Naịjirịa n'afọ 1983, nke mere ọtụtụmmadụ na-eche na onwereike bụrụ mmekwụta ka ndị Gana na-eme ugbua.

N'izu a kwa, otu onye Naịjirịa bụ ọkammụta na mahadụm dị na Gana banyekwara nsogbu maka itinye ọnụ n'ọnụ ndị Naịjirịa na mba ahụ, ọkachasị ebe o si metụta ebubo na mkpasi agwa oke agbụrụ.

Austin Nwagbara

Ebe foto si, Austin Nwagbara/Linkedin

Nkọwa foto, Austin Nwagbara bụ onyenkuzi na mahadum, University of Lagos gara ezumike nkuzi 'Sabbatical' na mahadum, University of Ghana