Nigerians in Ghana: Ndị amaghị ndị ha bụ kpochiri ọdọahịa ụmụ Najiria na Ghana
Akụkọ ndị dị mkpa taa:
Ndị amaghị ndị ha bụ kpochiri ọdọahịa ụmụ Najiria na Ghana

Ebe foto si, Getty Images
Ihe karịrị ọdọahịa iri atọ ndị ụmụafọ Naijiria nwere n'ahịa a kpọrọ, 'Suame Magazine' na Kumasi, dị na mba Gana ka ndị ndị ntorobịa obodo ahụ kpochiri.
Cheta na oteela nghọtahie ji dịrị n'etiti ndị ntorobị Gana na ndị Naijiria na-azụ ahịa n'obodo ahụ n'ihi ebubo na ụmụ Naijiria na-erekarị ahịa adigboroja.
Gọọmenti mba Gana akwadoghi ka ndị si mba ọzọ na-ere ahịa mgbere nke ndị bekee kpọrọ 'retail'.
Ha mepụtara iwu iji machie ya nke mere ka e mechie ọtụtụ ọdọahịa ndị Naijira nwere n'afọ 2008.
Mana Gọọmenti Niajiria tinyere ọnụ n'okwu ahụ nke mere ka ha kwụsi ịcha ụmụ Naijiria na-azụ ahịa na mba ahụ ọkụ.
Ka ọ dị ugbua, ndị uweojii mba ahụ ekwela nkwa na ha ga-elebanye anya na nsogbu ahu.
Onye uweojii e jidere ya na ndị ntọ abụghị onye otu anyị -Ndi uweojii

Ebe foto si, NPF
Ndị uweojii Naijiria ekwuola na Kingsley Udoyen, onye e chere bụ Osote Kọmishiona ndị uweojii( Assistant Commissioner of Police) a nwụchiri n'Akwa-Ibom steeti nke foto ya na-efegharị na soshal midia dịka onye anwụchiri ya na ndị ntọ ọzọ abụghị onye uweojii ma ya fọdụ ịbụ Osote kọmịshọna ndị uweojii.
Ha kwuru ihe e ji nwuchie Udoyen bụ maka ebubo ịbụ onye uweojii adigboroja ji uwe ha atụrụ ndị mmadụ ego.
Ndị Uweojii kọweara na ya nwụchiri ya na abali abụọ nke ọnwa Januarị afọ dịka iko ya juru ma kpụpụ ya ụlọikpe magie dị n'Abak dị n'Akwa-Ibom steeti.
Ite ime ka egbu umụnwaanyị karịa Malaria

Ebe foto si, Getty Images
Dọkịta Christopher Lamai kwuru na ọnwụ a kachasị metụta ndị mpaghara ugwu Naịjirịa.
Dịka o si kwuo "kwa nkeji asatọ, otu nwaanyị na-anwụ site n'ite ime n'ụzọ ezighi ezi"
Ọ gwara ndị ntaakụkọ gbakọrọ ebe ahụ ha gbasaa ozi ka ndị mmadụ mụta ọghọm dị na ite ime.
Ikpe Nnamdi Kanu

Akụkọ na-eru anyị ntị na-ekwu na Ụlọikpe ukwu Naịjirịa ga-amalite ọgbakọ ha maka ịmalite ikpe Nnamdị Kanu bụ onye ndu otu Ipob.
Gọọmenti Naịjirịa na-ebo Nnamdị Kanu ebubo mgbaokpuru.
Ngagharịiwe N'Anambra steeti

Ebe foto si, AFP
Otu kpọrọ onwe ha Host Communities of Nigeria Producing Oil and Gas, emeela ngagharị iwe ụnyahụ n'Onitsha ịgosi iwe ha maka gọmenti ekweghị itinye Anambra steeti na nzukọ steeti na-emepụta mmanụ agbidi na Naịjirịa.
Otu a sị na nke a na-egbochi steeti ahụ irite uru ndị ọzọ nọ na nzụkọ a na-erite.
Nrụrụaka n'ụlọomeiwu nta

Ebe foto si, Facebook/Nigerian HoR
Ntamu na aga n'ihu ụgbụa n'ụlọomeiwu nta maka ntuliaka emere bụ nke weputere Femi Gbajabiamila dịka onye ndu ụlọomeiwu ahụ.
Otu kpọro onwe ha G-70 si na-enwere nrụrụaka na ya bụ ntuliaka ma kwukwa na ha ga-aga ụlọikpe maka ya.
Mohammed Morsi awụọla

Ebe foto si, EPA
Onye bụbu onyeisiala Ejipt bụ Mohammed Mosi alala mụọ ụnyahụ n'ụlọikpe.
Ebe Muslim brotherhood nakwa na ndị ọzọ na-ekwu na gọmentị ma ihe mere ya, Amnesty International na-akpo oku ka enyocha ọnwụ ya bụ nwamadị nke ọma.
France emeriela Naịjirịa n'iko mbaụwa ụmụnwaanyi

Ebe foto si, @NGSuper_Falcons
N'egwuruegwu, asompi iko mbaụwa ụmụnwaanyị, France ji otu goolu merie Naịjirịa ụnyahụ.
Na penariti agbagharịrị nke ugboro abụọ , ka ha ji nwete ya bụ mmeri.











