Abortion: Ị ma na ite ime ga-eduba gị n'ụlo mkpọrọ afọ 14?

Ebe foto si, Getty Images
Na Naịjirịa, ite ime abughị ihe mmadụ nwereike banye ụlọọgwụ ga mee.
Nke a bụ maka iwu Naịjirịa megidere ite ime.
Mana, etu ọ dị na Naịjirịa abụghị etu ọ dị n'ụfọdụ mba ndị ọzọ.
N'ọnwa Mee nke afọ 2018, mba Ireland merụrụ iwu megidere ite ime.
Ha ji ntuliaka nke jụrụ ndị mmadụ ma ha chọrọ ka nwaanyị nwee ikike nke onwe ya ite ime.

Ebe foto si, Brian Lawless
Ndị mmadụ dị Pacenti iri isii na asatọ na mba ahụ kwenyere na nwaanyị nwere ikike onwe ya, nke mere na ha nwereike ị sị na ha achoghi ime ha bu.
Ọtụtụ mba nwekwara ụdịrị ohere a.
Na Naịjirịa, iwu kwuru na naanị mgbe mmadụ nwere ikike ite ime bụ na nwaanyị dị ime nwereike ịnwụ.
Mkpọrọ afo asaa na-eche onye ọbụla aka kpara na-ete maọbụ tere ime.
Ebe onye nyere aka n'ụzọ ịnye ihe eji tee ime ga-enwete mkpọro afọ atọ.
Onye ọ bụ ya tere ime na-ele anya mkpọrọ afọ 14.
Mana, iwu a akwụsighị ite ime na Naịjirịa.

Ebe foto si, Getty Images
Nchọpụta e mere maka atụmatụ ezinaụlọ a kpọrọ 2018 Global Family Planning kwuru na ime e tepụrụla na Naịjirịa n'afọ 2018 eruola otu nde na ọma(1.3m.).
N'akụkọ si n'ọgbakọ atụmatụ ezinaụlọ bụ International Conference on Family Planning bụ nke na-eme na mba Rwanda ugbua kwukwara na ndị tere ime azụụlọ dị 735,000.
Ihe ọ pụtara bụ na ọtụtu ime a na-atụrụ na-akwadoghi akwado na a gaa ete ime azụ ụlọ.
Dibia Bekee Francis Ezenwankwo gwara BBC na ọ maghị etu ndị a nọ nzukọ jiri nwete ọnu ọgụgụ a, ọ dị ka ihe ndị ọkammụta ma.
Ezenwankwo gara n'ihu kwuo na ihe na-ebute ite ime na-abụkarị maka naanị pasenti iri n'ime ụmụnwaanyị na-eme ihe atụmatụ ezinaụlọ a kpọrọ 'Family Planning'.
O kwuru na ya bụrụ na Naịjirịa megharịrị iwu ji ite ime, ọ ga-eme ka ite ime belata dika o si mee na Saụt Afrịka.
Ọghọm ndị dị n'ite ime n'ụzọ na-ezighi ezi:
Ndị ọkacha mara n'ihe gbasara ahụike ụmụnwaanyị depụtara ụfọdụ ọghọm ndị a;
- Nje nke akpa nwa nwaanyị.
- Oke ịgba ọbara.
- Ụfọdụ ime ahụ nwereike ịfọ n'ime afọ.
- Mmebi ọnụ ụzọ akpa nwa.
- Mmebi akpa nwa n'onwe ya.
- O nwereike ibute ọrịa kansa nke ara.









