Iri oke nri ọnụụtọ so n'ihe na-ebute atụghị ime nwaanyị

Ebe foto si, Getty Images
Ụmụ nwaanyị na-eri oke nri ọnụụtọ nka a na-akpọ fast food n'asụsụ bekee na anaghị ara cha mkpụrụ osisi nkeọma na-enwe karị nsogbu ịtụrụ ime dịka nchọpụta kwuru.
N'ime nyocha emere n'etiti ụmụ nwaanyị dị 5,598, achọpụtara na ndị na-eri nrị ọnụụtọ 'fast food' ugbo anọ n'ime ọnwa anaghị atụ ime ọsịsọ dịka ndị anaghị ericha ọnụ ụtọ.
Ndị na-eri nri ọnụ ntagharị a nakwaghị atụrụ ime ọsịsọ n'ime otu afọ dịka akụkọ gbasara ọmụmụ mmadụ ji kwuo.
Ndị ọkacha ama tụrụ alọ na iri nri dị nma na-enye aka ịkwalite ohere ịtụrụ ime.

Ebe foto si, Getty Images
Nyocha ndị a chọpụtara na ọ na-ara ụmụ nwaanyị na anaghị eracha mkpụrụ osisi ahụ tupu ha tụrụ ime karịa ndị nke na aracha ya nkeọma.
Onye dọkịta na-esoghị na nyocha ahụ bụ Ọkanmụta Claire Roberts nke Mahadum Adelaide na Australia kwuru na nyocha a kwadoro ihe ndị ọkacha n'ihe gbasara ahụike na-ekwu.
Nke bụ na dị na nwunye na-achọ nwa kwesiri ị na-eri ezigbo nri.







