Ndi Igbo na-azụ ahịa na Ghana: Mkpagbu a na-akpagbu anyị akarịala

Ebe foto si, Getty Images
Ụmụ Naijiria na-azụ ahịa na mba Gana akpokuola gọọmentị etiti ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka dịka ha na-ekwu na mmiri agafeela garị n'okwu mkpagbu ha na-agabiga na mba Gana.
Nke a na-eme dịka otu jikọrọ ndị ahịa Gana a kpọrọ 'Union of Traders Association' (GUTA) ekwuola na ha ga-eme ngagharịiwe ga-akpụ ọkụ n'ọnụ megide gọọmenti ha ma ọ bụrụ na ha etinyeghị n'ọrụ, iwu mmachi ndị mbịara mbịara na-azụ ahịa mgbere.
Onyeisi otu ahụ bụ Joseph Obeng kwuru na ọ bụrụ na gọọmenti emeghị ihe ọbụla ọnwa atọ zuo, "ndị otu anyị ga-awuju ezi ime ngagharịiwe.

Ebe foto si, Kwesi Debrah/Luv FM
" Ọchịchị obodo abụghị okwu nwanne na nwanne, ka asị na Gana na Naijiria bụ nwanne, i nwezie iwu, ị gaghị etinye ya n'ọrụ."
Na nkọwa ya otu onye n'ime ndị ndu otu jikọrọ ndị Naijiria na-azụ ahịa na Gana a kpọrọ 'Nigerian Union of Traders Associations', (NUTA) bụ Kizito Obiora kwuru na Ọ bụ ezie na ndị Gụta majara na-aga eme ngagharịwe.
Ebe niile bidoro kpọwa ghara ghara kemgbe Monde ka a ga-asi na ọgbaghara achọrọ ịda n'etiti ndị ahịa Gana na ndị nke Naijiria n'Ahịa Opera Square dị n' Akra, Gana.
Obiora gwara BBC Igbo na 'ha kpọchiri ọdọahịa ụmụ Naijiria ụbọchị Monde mana gọọmenti ha na ndị uweojii mere a gbapekwa ya ụnyahụ (Wenezde)."
"Gọọmenti ha gwara anyị na ha ga-echekwa anyị mana anyị ahụghị isi nkwa ahụ mana oge rue ndị obodo ahụ achụgharị anyị merụwa ndị mmadụ ahụ, mebisia ahịa anyị."
Ọ gara n'ihu kpọọ oku ka gọọmenti Naijiria na nke mba Gana nwekọ mkparịtaụka iji mee ka nsogbu ahụ bịa na njedebe.











