Ọnọdụ anyị ebe a dị ka ọnọdụ ụmụnne anyị na South Africa - Ndị Naịjirịa na-azụ ahịa na Ghana

Aha onyonyo, Ọnọdụ anyị ebe a dị ka ọnụdụ ụmụnne anyị na South Africa - Ndị Naịjirịa nọ Ghana

Kizito Obiora bụ onyeisi ndị Naịjirịa na-atụ mgbere na Kumasi.

Ọ gwara BBC na o teela ndị Naịjirịa na-atụ mgbere na Gana na-ahụsị anya na njem ịtụ mgbere na mba ahụ.

Ọ kwuru na iwu mba Gana wepụtara maka ndị oji ego achụ ego si mba ọzọ bụ ihe mmekpa ahụ.

Mana, ndị Gana na-ekwu na ọ bụghị eziokwu.

Ha kọwara na ha anaghị achụ ndị Naịjirịa, na ọ bụ ihe iwu obodo ha kwuru ka ha na-eso.

Uche ha bụ ka ndị Naịjirịa ghara iso ha na-atụ mgbere nke ịrepụ obere obere dịka iwu kwuru.

Ndị Naịjirịa na onwe ha si na nke a ga-esiri ha ike maka etu ọnọdụ mgbere si dị na mba ahu.

Lee akụkọ a n'uju.

Ọrụ a si n'aka Chiemela Mgbeahuru na Chimamaka Ihenacho.

Akụkọ ga-amasị gị