Coronavirus Impact: Etu coronavirus si metụta emume 'Holy Week' nke afọ a

Holy Cross Cathedral, Lagos

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụlọụka 'Holy Cross Cathedral' dị na Legọs kpọchiri akpọchi

Ihe adịghịzị ka ọ dị na mbụ ugbua n'ihi na ọrịa coronavirus egosila ụwa ihe ọkụ jị ntị oke eme.

Ka ọ dị tata bụ Tọzde dị asọ, ọtụtụ ụlọụka na Naịjirịa mechiri emechi.

N'ụka Katọliki, tata ka a na-eme emume mass chrism, ebe ndị ụkọchukwu na-ekwenwo nkwa echichi ha.

Aha onyonyo, Etu coronavirus si metụta emume 'Holy Week' nke afọ a

Ụka Anglican nakwa ndị ọzọ na emekwa ya bụ emume "Maundy Thursday" maọbụ "Holy Thursday" kwa afọ n'ụwa niile.

Ọnụ na-ekwuru ụka Katọlik n'Enugwu Dayọsis bụ Fada Benjamin Achi kwuru na nke afọ a ga-adị iche n'ihi ọrịa coronavirus.

Aha onyonyo, Ihe mere m ejighi akwado mgbachi ụlọ uka maka covid19 - Archbishop Chukwuma

Fada Achi kwuru na ọ bụ nanị ndị ụkọchụkwụ iri abụọ 20 ga esonyere Bishọp na 'Chrism mass' nke afọ a iji nọchite anya ndị ụkọchukwu ndị ọzọ ọnụọgụgụ ha ruru 450.

Nke a bụ iji rube isi n'iwu gọmenti etiti wepụtara iji gbochie mgbasa ọrịa Corona.

Achị yọrọ ka ndị mmadụ sonye na ya bụ emume site na TV, Redio nakwa social media.

N'Ọnịcha

Usoro 'Holy Week' nke ndị ụka Katọlik n'Ọnịcha

Ebe foto si, Facebook/Archbishop Valerian Okeke

Nkọwa foto, Usoro 'Holy Week' nke ndị ụka Katọlik n'Ọnịcha

Ozi si n'aka Bishọp ụka Katọlik nke Ọnịcha bụ Valerian Okeke gosiri na ha agaghị aka ụka na mgbede Tọzde dị asọ.

Uka ga-ebido na mgbede 'Good Friday' n'elekere ise.

N'Abịa

Aha onyonyo, Ash Wednesday: 'Onye ọbụla chọrọ gị okwu maka uwe ojii i yi, gwa anyị'- Bishop Martins

Na mgbede ụbọchị Tọọzdee ka gọọmentị Abịa kwuru na ga-ebelata aka n'iwu onye nọrọ be ya nke ha tinyere.

Ha kwuru na nke a bụ iji mee ka ndị mmadụ sonye nke ọma n'emume 'Easter'.

Nke a pụtara na ụlọụka nwere ikike ịka ụka mana ndị mmadụ agaghị akarị 50 n'ime ụlọụka n'otu oge.

Amabeghi etu ndịisi ụka dị icheiche na steeti ahụ ga-esi megharịa ọgbakọ ha n'ihi ntuziaka ọhụrụ a gọọmentị wepụtara.

Abuja

Usoro 'Holy Week' nke ndị ụka Katọlik n'Abuja

Ebe foto si, WowCatholic

Nkọwa foto, Usoro 'Holy Week' nke ndị ụka Katọlik n'Abuja

Onyeisi ụka Katọlik n'Abuja bụ Bishọp Ignatius Kaigama machikwara ọgbakọ ndị mmadụ n'ụlọụka n'oge a, n'ihi coronavirus.

Usoro e wepụtara bụ na ndị ụka ga-esonye na mass site na igwe ịntaneetị nakwa onyoonyoo TV na ndị ọzọ.

coronavirus
coronavirus branding