Working From Home: Ụzọ asaa ị ga-esi baara onwe gị uru ma rụọ ọrụ n'oge mmachi maka coronavirus

Soweto

Ebe foto si, Getty Images

Dịka ọtụtụ mmadụ nọ n'ụlọ na mba dị iche iche nke gụnyere Naịjirịa mere mmachi ngagharị na nnọkọ mmadụ maka ọrịa coronavirus, ọtụtụ ndị mmadụ amaghị etu ha ga-esi eme n'ihi na ịnọ n'ụlọ amaghị ha ahụ.

Kama, echegbula onwe gị n'ihi na anyị na-ewetere gị ụzọ asaa ị ga-eji baara onwe gị uru dịka ị si n'ụlọ arụ ọrụ n'oge mmachi a.

Ihe atọ ị kwesịrị ị bụ n'obi dịka ị si n'ụlọ arụ ọrụ bụ Nghazi, oge mmecha na ezumike.

Ọ bụ site na ihe atọ ka ụzọ asaa a sị pụta.

coronavirus
coronavirus branding

Ngwa ka anyị zọpụ ije:

1) Chọta nkọrọ dị ahụ gị mma: Oge eruola ị ga-eji hazie obere ebe ị ga-akpọ ụlọọrụ n'ụlọ gị. Chọta ebe dị ahụ gị mma nke mmadụ agaghị enye ndụ gị nsogbu. Gba mbọ hụ na ihe na abata ebe ahụ nke

ma. Ma ya bụrụ kwa ebe ụbụrụ gị ga-edere duu ka ị rụọ ọrụ gị nke ọma.

2) Ekwela ka enwee ihe ga-arafu uche gị : Ọ bụrụ na mmadụ anọghị n'ụlọ ọrụ ya, itinye uche na ihe ọ na-eme na esi ike n'ihi na ọtụtụ ihe nwere ike irafu uche gị. E nwere ìgwè na adị n'ime ekwentị ga-enyere gị aka ka uche gị hapụ ị pụ n'ọrụ.

Maka Ihe gbasara iru ọrụ nke ọma igwe aap dịka "cold turkey", "proud" na "rescue time" ga enyere gị aka. Ọ bụrụ na ị chọrọ ka gị na ndị ọrụ gị rụkọọ nke ọma igwe aap dịka "zoom", G-suite", "Bannersnack" na "slack" ga enyere aka nke ukwu.

3) Hazie ụbọchị gị ma tinye uchu na ihe ndị kacha mkpa:

Aha onyonyo, Etu m siri ebi ndụ m na London kemgbe mmachi ngagharị malitere

Ọ dịkwa ezigbote mkpa ka ị were atụmatụ iji arụ ọrụ n'ụlọ ọrụ were ya na-arụkwa ọrụ ugbu a ị nọ n'ụlọ. Ọ dịkwa mkpa ka ị bido n'ụtụtụ hazie ụbọchị gị, wepụta oké ị ga-eji rụọ ọrụ dịka ị na edetu ihe niile ị ga-eme n'ụbọchị ahụ.

4) Hụta na ndị gị na ha na-arụkọ ọrụ ghọtara gị mgbe niile: I si n'ụlọ arụ ọrụ dị iche nke mere na ọ dị mkpa na ị hụrụ na ndị gị na ha na-arụkọ na-ghọta gị mgbe ọbụla. Ịkpọ na ekwe ntị nke ihe onyonyo

kpọrọ "video call" na enyere aka nke ukwu. Ọ dịkwa mkpa na ị jụrụ ajụjụ mgbe ọbụla enwere ihe ị na-aghọtaghị.

5) Kwado nke ọma tupu ị banye ọgbakọ n'ekwenti: Gbaa mbọ hụ na ị kwadoro onwe gị nke ọma tupu ị banye n'ogbakọ ekwe ntị. Hụ kwa na ihe nwere ike irafu gị dịka ìgwè onyonyo tivi, redio ma ọbụ ndị ọzọ gbanyụrụ agbanyụ.

Ọ dịkwa mma ma ahọpụta otu onye ka edu ndị ọzọ na nzukọ ahụ.

6) Nye onwe gị oge ezumike nri : Gbalịa hụ na ị nyere onwe gị oge ezumike ị ga-eji rie nri dịka ị si n'ụlọ arụ ọrụ. Nke a ga-enyere aka ka ụbụrụ gị zuo ike. Erikwala nri dịka nzukọ na-aga. Isi nri nke gị bụ kwa ezigbo ohere inye onwe gị ezumike.

7) Echefu kwala izu ike: mmadụ abụghị ìgwè. Gbalịa hụ na ị zuru ike. Were ohere ezumike a, hazie ụlọ gị, kpọtụrụ ndị ezinụlọ gị na ndị enyi gị n'ekwe ntị, maọbụ mụọ ihe ọhụrụ. Ihe kacha mkpa bụ na ị nyere onwe gị oge ezumike.