Asari Dokubo, Uche Mefor na Uwazuruike ehiwela otu Biafra ọhụrụ

Asari Dokubo

Ebe foto si, AsariDokubo/Facebook

Otu kpọrọ onwe ya 'Biafra De Facto Customary Government' ahọpụtala Asari Dokubo dịka onyeisioche kọmiti ga-ehibe otu a.

Nke a pụtara ihe na nzụkọ nke otu ahụ na-achọkwa nkewapụta Biafra mere n'ikuku na mgbede ụbọchị Satọde.

N'ozi mbụ o ziri n'ọkwa, Dokubo kwuru na "anyị bụ ndị Biafra ekpebiela iji aka anyị weghara akaraaka anyị ma nwetara onwe anyị na ụmụ anyị nnwereonwe"

Ọ jụrụ sị, "Ruo ole mgbe ka anyị ga-agbachị nkịtị ka e jiri ike bata ala anyị na-achịgharị anụmanụ ha?"

"Ruo ole mgbe ka steeti Zamfara ga-enwe ikike ịgwuputa ma jide ọlaedo na ihe ndị ọzọ nke ha mana anyị enweghi ụdịrị ikike ahụ?"

O kwukwara na ndụ a ọ na-ebi ejughi ya afọ, nakwa na ọ gaghị ewetu onwe ya n'ebe onye ọzọ nọ.

Aha onyonyo, Nnamdi Kanu anaghị achụ maka nnwereonwe Biafra - Asari Dokubo

Na ngwụcha o kwuru si "onye echeghi na o nwere ihe dị njọ n'ịbụ onye Biafra n'ihi na o nweghi ihe ka ihe anyị na-agabiga taa na Naịjirịa njọ"

Kedụ otu bụ "Biafra de Facto Customary Government"?

Biafran Flag

Ebe foto si, Getty Images

'Biafra de Facto Customary Government' bụ otu na-achọ nnwereonwe Biafra dịka aha ha si gosi.

E cheere na ọ bụ otu nke Asari Dokubo, Ralph Uwazurike, nakwa nke Uche Mefor bịakọtara ọnụ hibe.

Lee ndị ji ọkwa dị icheiche n'otu ahụ

  • Asari Dokubo - Onyieisioche Kọmiti ga-ehibe otu a
  • George Onyibe - Onye odeeakwụkwọ
  • Uche Mefor - Onye odeeakwụkwọ mgbasaozi
  • Emeka Esiri - Onye ọkaiwu otu ahụ

Ha kwuru na ihe kacha ha mkpa ugbua bụ nchekwa mpaghara ha dịka okwu nchekwa jisike emebi kwa ụbọchị na Naịjirịa.