Nnamdi Kanu anaghị achụ maka nnwereonwe Biafra - Asari Dokubo
Asari Dokubo akọwaarala BBC Igbo ebe mmiri si baa n'opi ụgbọgụrụ na mmekọrịta ya na onye ndu Ipob bụ Nnamdi Kanu.
Ọ sị na Kanu anaghị achụ maka nnwereonwe Biafra, na o nweghi onye ọbụla ọ na-edu nwereike ime ka e nwete Biafra.
Ọ sị na ozutebeghi Kanu ihunihu, kama ọ bụ n'ekwenti ka ha abụọ na-akpa.
O kwukwara na mgbe Kanu nọ n'ụlọ mkpọrọ, na o so na ndị gbara mbọ ịhụ na a tọhapụrụ ya.
Dokubo kwuru na ihe seere ya na Kanu okwu bụ mgbe Kanu sị ka ndị Igbo gbajọọ iso mee ntuliaka n'afọ 2019, mana ọ gwara ya mba na etu a adịghị mma.
"Agwara m Kanu na ọ bụ site n'ime ntuliaka ka a ga-eji chụpụ Onyeisiala Buhari n'ọchịchị mana Kanu nupuruisi ma kpọsa m asị."
Dokubo gara n'ihu tinye ọnụ n'ebubo Kanu boro ya maka ị nara ya nde naịra iri abụọ ma jụọ Kanu "kedụ mgbe nke a mere"?
Ọkaiwu Nnamdị Kanu bụ Aloy Ejimakor sị na Kanu maọbụ ya onwe ya enweghi ọsịsa ha ga-enye Dokubo n'okwu ndị o kwuru.
Ejimakor sị na Dokubo bụ mmadụ nkịtị nwereike ikwu ihe ọbụla dị ya n'uche.
Kirie ihe ha kwuru n'uju n'elu.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: