Charles Duruji bịara ileta m nihi ejighi m ahụ mana egburu ya n'ụlọ m
Okebata Sunday bụ nwanna Charles Duruji, onye nwụrụ n'ogbe ndị uweojii dị na New Heaven n'Enugwu, ekwuola na ha chọrọ ikpe nkwụmọtọ gbasara ọnwụ nwanne ha.
Okebata kwuru na Duruji bụ Inginia gara ịhụ onye uweojii nwaanyị ọ na-akwado ịlụ n'Enugwu mgbe o jekwudoro ọnwụ ya.
Ka ndị be Charles Duruji si nwete ozi ọnwụ ya

Okebata si na a kpọrọ ha n'ekwenti n'elekere iri na abụọ nke ime abali nke Sepụtemba 28, si ha biawa na nwanne ha anaghị ekute ume .
N'oge na-adịghị anya, onye ahụ kpọghachiri si ha biawasiwi ike. N'elekere ise nke ụtụtụ, a kpọkwara ha si na nwaanne ha anwụọla.
Nke a mere, ka ha chọrọ ya gawa Enugu, ebe a kpọ ha gaa n'ụlọ ozu ka ha hụ ozu Duruji.
O kwuru na mgbe ha hụrụ ozu ya, egbukasiri ya mma n'ahụ ya.
Kedụ ka Charles Duruji si nwụ?

Ebe foto si, Sunday Okebata
ASP Chidimma Victoria Nwala bụ nwaanyị onye uweojii nke Duruji na-akwado ịlụ gwara BBC na ọ bụ maka na ahụ adịghị ya kpatara Duruji ji hapụ Imo steeti ebe o bi bịawa Enugwu.
N'abalị ahụ ọ bịara, a malitere ịnụ ụda egbe n'ogbe ndị uweojii nke gosiri na ọgbaaghara dị n'ezi.
Duruji gwara nwunye ya ahụ ka ọ lakpuo n'ụlọ mposi ga zoo ma mechie ọnụ ya.
O teghị aka, ọ nụrụ ka ndị mmadụ gbakara ụzọ ha ma bata n'ime ụlọ.
Ọ nụkwara ka di ya tiri mkpu sị "abụghịkwa m onye uweojii, abụkwa m onye nkịtị", mana ndị ahụ sị ya mechie ọnụ.
Nke a bụ ihe ikpeazụ ọ nụrụ tupu e gbuo di ya.
Chidimma ka nọ n'ụlọọgwụ oge o gwara BBC okwu.










