Atụmatụ nọrọ n'ụlọ Ipob weputara chịtara ọkụ na Nnewi, Ọnịcha na Aba ma gbaa ọnyụpa n'ebe ndị ọzọ

N'agbanyeghị oku 'nọrọ n'ụlọ' nke otu na-agba mbọ maka nnwereonwe Biafra bụ Ipob kpọrọ, ahịa zụrụ n'Enugwu dịka ọ na-azụ, ebe ahịa na ahịa na Nnewi, Ọnịcha na Aba tọgbọrọ chakoo.
Otu Ipob kpọburu oku ka ndị na-eso ha nọrọ n'ụlọ ụbọchị mbụ nke Oktoba Naịjirịa na-eme mmemme ncheta afọ iri isii e jiri nweta nnwereonwe mba ahụ.
Mana ọtụtụ ndị na-azụ ahịa n'Abakaliki nakwa n'Enugwu na-ekwu na obi adịghị mma ka ihe si aga na Naijiria gwara ndị ntaAkụkọ BBC na agụụ so n'ihe mere ha ejighi sonyere ndị Ipob n'oku ha kpọrọ.
Etu ụbọchị ahụ siri gaa n'Enugwu

Onye ntakụkọ anyị gara Ahịa Ogbete Enugwu kwuru na ndị mmadụ na-azụ ma na-ere, ebe ụgbọala na-agbakwa ọfụma.
Na agbanyeghị na mmiri zoro n'ụtụtụ tata, ebe niile na-ekwo ekwo ka o si adị na mbụ.

Onye nta akụkọ BBC gagharịrị Enugwu kwuru na ụgbọala njem na-agba dịka ahịa na-azụ.
Ndị agha Naịjirịa na ndị uweojii nọkwa n'ụzọ na-echekwa.
Mmọnwụ gbara na "Coal Camp dịka ndị bi na mpaghara ahụ na-emerụba ụbọchị Emume Nnwereonwe Naijiria.


Etu ndị Nnewi na Ọnịcha siri mee n'ụbọchị ahụ
N'aka nke ọzọ, ndị bi na Nnewi gwara BBC Igbo na ha n'ụlọ n'ihi ntụzịaka otu Ipob.

Ọdọahịa ndị mmadụ kpochichara akpọchi na Nkwo Nnewi.
Ebe Bank Road bu na-ekwokarị ekwo bụ nanị ndị ọkada mmadụ ole na ole na ndị ahịa mbuharị ka a hụrụ.

Nke dị ka ibe ya bụ na ahịa azụghị n'Ọnicha, ebe ndị mmadụ nọ n'ụlọ ha.
Otu onye bi n'Ọnicha achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na e tiri ndị gbapere ọdọahịa n'ogbe n'isi ụtụtụ ihe.

Ebe foto si, Ndubuisi Amajo
Ahịa zụrụ n'Ọka mana ọdọ ụgbọala tọgbọ chakoo
Ndị mmadụ na-akpagharị , ebe ahịa kworo ekwo n'Ọka, isiobodo Anambara steeti.

O nweghị emume pụrụ iche gọọmenti mere iji cheta afọ iri isii Naijiria nwetara Nwereonwe.
Onye ntaakụkọ anyị gara n'ama' Dr Alex Ekwueme Square' dị n'Ọka kwuru na m̀kpatụ a na-emekarị nakwa ejiji a na-ejichi ama ahụ adịghị ya.

Kama e ji igodo gbachie ọnụụzọ ama ahụ. Mmadụ na ụgbọala kọrọ ụkọ n'okporoụzọ dị nso n'ama ahụ.
Ọdọ ụgbọala dị n'Aroma Junction' nakwa 'Star Sunny Motor Park', tọgbọ chakoo.
Ahịa gbachisiri n'Aba

Ebe foto si, Chidi Asonye
N'Aba, dị n'Abịa steeti ndi mmadụ nọdụ n'ụlọ ha dịka otu Indigenous People of Biafra (Ipob) kwuru ka ha nọdụdụ n'ụlọ dịka Naịjirịa na-eme emume ịcheta nwereonwe ha.
Onye ntakụkọ BBC gara Aba kọwara ndị mmadụ ha ka na-ele anya etu ihe ga-esi kwụru tupu ha apụọ ahịa.

Ebe foto si, Chidi Asonye
Ahịa Arịara gbachiri agbachi, dịka Ekeoha ShoppingCnetre, ahịa Ehi Road nọkwa n'ọnọdụ mgbachi.
Mana, n'ụfọdụ mpaghara obodo ahụ ndi mmadu na-agara onwe ha ebe ụlọ ahịa gbachikwara agbachi.
Etu Abakiliki siri mee n'ụbọchi mbụ n'Ọktoba
N'agbanyeghi na ọkwa 'onye ọbụla nọrọ n'ụlọ' nke Nnamdi Kanu bụ onye ndu ndị otu na-akwado nnwereonwe Biafra bụ Indigenous People of Biafra (Ipob) tinyere maka ụbọchị taa, ndị mmadụ na-agagharịrị onwe ha n'Ebonyi steeti.

Ebe foto si, Enyinna Omoke
Onye ntaakụkọ anyị nọ na steeti ahụ gagharịrị ebe ọ hụrụ ndị mmadụ na-agara mkpa ha n'isiobodo Abakaliki, mana o kwukwara na ọ hụrụ ebe a gbachiri ụfọdụ ọnụ ụlọahịa bido ebe elekere asaa ruo ebe itoolu nke ụtụtụ.
Ụfọdụ ndị gwara ya okwu kwuru sị na ha ọnọdụ Naịjiria nọ na ya ugbua anaghị enye ha ọṅụ.

Ebe foto si, Enyinna Omoke
Ha kwuru na obi adịghị ha mma na ndị a na-enyo na ha bụ ndị ọchịehi ka na-egbu ndị mmadụ na Naịjiria.
Ha kwukwara na akụnaụba obodo Naịjirịa adịghị mma, nke mere ka ihe taa akpụ.
Umuahia

Ebe foto si, Chidi Asonye
Oku ndị IPOB kpọrọ ka ndị mmadụ ghara iputa ezi kuru afo n'ala n'isi ọchịchị obodo Abia steeti bu Umuahia dịka ndị bi n'obodo ahụ ka ahụrụ ka ha na-aga ihe nke diri ha na enweghi nsogbu ọbula.
Na Isiama Afaraukwu bụ obodo onyeisi ndị otu a bụ Nnamdi Kanu, onye nta akuko anyị hụtara ka ndi obodo ahu na ndị bikwa n'ime ya mepechara ebe ha na-azụ ahịa ha.
N'otu aka ahu, n'ebe ozọ n'ime obodo Umuahia, ahụtakwara ndị mmadu ka ha nọ n'ebe ha nọ na-atu mgbere na enweghi ọdachi ọbula.
Okwuchi Angela, Chibuike Stephen Ogbulafor, Ogechi Nwachukwu siri na ọ bụ ezie na enyere iwu ka mmadụ ọbụla ghara ipụta ezi, ma ha kọwara na iwu a adịchaghị ire n'isi ọchịchị obodo Abia steeti bụ Umuahia na kwa obodo ndị ọzọ dị gburugburu ya.
Owere

Ebe foto si, Maazị Leonard
Ọtụtụ mmadu n'Owere bụ isi obodo Imo steeti na-agara onwe ha ebe dị ha mkpa n'agbanyeghi na otu na-achọ ka ekewa Naịjirịa ma nwete mba a kpọrọ Biafra bụ Indigenous People of Biafra (Ipob) kwuru ka ndi Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa nọdụ n'ụlọ n'ụbọchị Ọktoba 1.
Site Dọuglas Road ruo ụzọ Mahadum Naze, ndị mmadu na-aga onwe ha dịka ụgbọala na-agba.
Ọ bụkwa etu ahụ ka o siri kwụrụ n'Aba road.

Ebe foto si, Maazí Leonard
Ahịa na-azụ ebe.
Dịka ụbọchị a bụ ịnọdụ n'ụlọ ndị ọrụ nke gọọmentị tinyere, ụlọ ọru dị ka ụlụ akụ nakwa ụlọ ọrụ gọọmentị gbachiri agbachi.
Aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodinma mekwara emume ncheta oge nwereonwe Naịjirịa site n'ikiri ndị agha Bekee kpọrọ "marching" n'Owere.
Ihe gọọmentị ụfọdụ steeti n'Ọwụwa Anyanwụ kwuru maka atụmatụ Ipob ka a nọdụ n'ụlọ
N'Abịa

Ebe foto si, Okezie Ikpeazu
Ụlọọrụ 'Civil Defence' n'Abịa steeti ezipụla ndị otu ha na mpaghara e nwere ike inwe nsogbu dịka ụlọakwụkwọ,ahịa ọdọụgbọala, iji hụ na-enwere ezi nchekwa mmadụ na akụnaụba.
Nke a na-abịa dịka e ziterela ha onyeisi ọhụrụ na steeti ahụ aha ya bụ Vincent Ogu.
N'ozi nke ọnụ na-ekwuru NSCDC na steeti ahụ bụ Agu Ndukwe binyere aka, ha kwuru na ha dị njikere isonye ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ rụọ ọrụ ịkpa udo ụbọchị ahụ.

Ebe foto si, NSDC Abia
N'Imo

Ebe foto si, Hope Uzodinma/Facebook
N'Imo steeti, ndị uweojii agwala ndị Imo ka ha pụta gawara onwe ha mkpa, dịka ha kwere nkwa inye ha ezigbo ncheckwa ụbọchụ Oktoba mbụ.
Akụkọ kwuru na ndị ọrụ nchekwa wujuru n'okporoụzọ n'Owere n' ụbọchị Wenezde dịka ha malitere atụmatụ iji gosi na ha kwụ chịm maka emume Ncheta Nwereonwe Naijiria.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Orlando Ikeokwu gwara ụlọakụkọ Punch na ya bụ atụmatụ igosi na ha kwụ chịm na-eso oku otu Ipob kpọrọ ka ndị mmadụ nọọ n'ụlọ.
Ihe Ipob si ka e mee bụ ịkwado Naịjirịa - Massob
Otu so agba mbọ maka nnwereonwe Biafra, bụ 'Movement for the Actualisation of the Sovereign State of Biafra' (Massob) ekwuola na ha akwadoghi oku Ipob kpọrọ ka ndị Igbo nọrọ n'ụlọ n'ụbọchị emume ncheta nnwereonwe Naịjirịa n'aka ndị Briten bụ Ọkutoba 1.
Ọnụ na-ekwuru Massobu bụ Samuel Edeson kwuru na atụmatụ ahụ "bụ ịkwado ọchịchị Naijiria".

Ebe foto si, Getty Images
Otu Ipob kpọrọ oku ka ndị otu ha nọrọ n'ụlọ ụbọchị mbụ nke Oktoba "iji kwanyere ụmụ Igbo ndị ọchịehi nakwa ndị oyiegwu gburu ugwu".
N'ozi nke Emma Powerful binyere aka, ha kwuru na ha nwetara ozi mgbaama na "ndị otu oyiegwu chọrọ igbusi ụmụaka ma ha gaa emume indipenda na Ọkutoba 1."
Powerful dere sị: "Ọ bụrụ na ị chọrọ ịhụ njedebe iyi egwu, na ịgba ọnyụpa, gosi iwe gị site n'ịnọ n'ụlọ n'abalị mbụ nke ọnwa Okutoba."
Mana Massob, site n'ọnụ na-ekwuru ha bụ Samuel Edeson, kwuru na ya bụ ntuziaka Ipob nyere bụ 'ịkwanyere Naijiria ugwu", na "ọ bụghị ndị Biafra".
Edeson sị, "Ipob na Massob bụ nwanne, mana ihe banyere October 1st bụ ụbọchị Naijiria ji echeta nnwereonwe ha."
"Ihe ọbụla ha tinyere maka 'October 1st', ndị mba ọzọ ga-eche na ọ bụ iji kwanyere ndị Naijiria ugwu."
O kwuru na kama ịnọ n'ụlọ ụbọchị emume indipenda, Ipob kwesịrị ịgwa ndị Igbo ka onye ọbụla gawara onwe ya mkpa ya dịka ndị Naijiria ga-anọ n'ụlọ.
"Gọọmenti Naijiria emeela ya na ndịọrụ dị icheiche; ndị ụlọakụ, na ụlọakwụkwọ ga- anọrọ n'ụlọ, kedụ ka isi aga-etinye nke gị ụbọchị ahụ?"
"Ọ bụrụ na ha chọrọ icheta mgbe ndị oyiegwu gburu ndị Igbo, o kwesịrị ịbụ Mee 30 bụ ụbọchị Ncheta Nnwereonwe Biafra."
Ọ gara n'ihu sị na ntuziaka Ipob " na-adịka ọ bụ ihe gọọmenti Naijiria tinyere ka anyị na-eme."
"Ihe o gosiri bụ na ụnụ na Gọọmenti Naijiria na-arụkọ."
Mbọ BBC Igbo gbara inweta ọsịsa ndị otu Ipob amịtaghị mkpuru.
Mgbe a kpọrọ ekwenti Emma Poweful nakwa ọkaiwu Ipob bụ Aloy Ejimakọ, ekwentị ha agaghị.












