Real estate : Ị na-achọ ịzụ ala maọbụ ụlọ? Lee ihe asaa i kwesiri ime iji gbalahụ okwu na ụka

Ebe foto si, Obinna Ogbukiri Cartouche
- Onye dere ya, Uche Akolisa
- Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo, Lagos
Victoria Okonkwo( ọ bụghị eziaha ya) na di ya tụkọrọ ego zụọ ala.
Oge di ya nwụrụ, Victoria kwachara di ya, chọwa akwụkwọ ala ha zụrụ, ọ hụghị ya.
Ọ gara n'ụlọikpe nweta akwụkwọ akaebe n'akwụkwọ ụlọ ya furu efu.
Mana oge ọ malitere iwu ụlọ n'ala ahụ maka obibi ya na ụmụ di ya hapụrụ ya, Ogbonna Nwafor (ọ bụghị ezi aha ya) bịara gwa ya wepụ aka n'ala ahụ na ọ bụ ya nwee ala ahụ, na nwa di ya resiri ya ala.
Okonkwo gwara ya na o nweghị onye ọzọ ya resiri ala,
Okwu ahụ pụrụ ụlọikpe bụ ebe ọ pụtara ihe na Nwafor zụrụ ala n'aka ya enweghị ikike ire ala ahụ ebe a gwara ya gaa n'aka onye ahụ narakwa ego ya.

Ebe foto si, Getty Images
Ị tụkọtala ego gbara ọkpụrụkpụ mana tupu ịzọpụ ije ịzụ ala maọbụ ụlọ?
Cheta na ọ dị oke mkpa ike nkwụcha ka ị ghara ịkwọ aka tiere ọkụkọ akụ n'ihi na ịzụ ala maọbụ ụlọ abụghị egwu achị ụtaba n'aka agba.
Ndị mmadụ abụọ bụ ọkachamara n'ihe gbasara ala na ewumewu; Ayo Akinwale, onye bụ ihe Bekee "real esate surveyor" na Obinna Ogbukiri bụ onye 'architect gbara ndị chọrọ itinye ego n'ala ama ka ha jụọ ese.
Lee ese asaa ndị i kwesịrị ịjụ maọbụ ihe ị ga-eme tupu ị zụọ ala maọbụ ụlọ dịka ha si rụtụ aka:
1. Onye nwe ala?

Ala ị chọrọ ịzụ ọ bụ nke ogbe ka ọ bụ nke otu onye nwe? Ya bụ ajụjụ mbụ dị oke mkpa ị jụ ndị nwe ala ahụ.
Dịka Akinwale na Ogbukiri si kọwa, ọ dị mma ịchọpụta maọbụ ala obodo maọbụ, otu onye nwe iji mara ma onye chọrọ iresi gị ala o nwere ikike ire ya.
Ọ bụrụ ala obodo maọbụ ihe karịrị otu onye nwe, eze obodo maọbụ ndị gbakọrọ aka nwere ya ga-ebinye aka n'akwụkwọ tupu e ree ya.
E meghị etu ahụ, ị mara na mmiri nwere ike ịma ehi n'anya n'ọdịnihu.
Ogbukiri, onye nwe ụlọọrụ Cartouche Shelters Owere kọwara sị, "ịzụ ala dịka ịlụ nwaanyị, anaghị e ji ọsọ achụ ya. Ọ dị mma ime nnyọcha i kwesịrị ime."
2. Kedụ ihe gọọmenti mabụtara mpaghara ebe ị chọrọ ịzụ ala ka ọ bụrụ?
Akinwale na Ogbukiri kwuru na ihe dị mkpa ịchọpụta bụ ma e nwere ihe gọọmenti mapụtara mpaghara ebe ịzụ ala ka e were ya mee.
A na-enwe ebe gọọmenti mapụtara maka ebe obibi, nwee ebe a mapụtara maka ụlọọrụ maọbụ ụlọọrụ mmepụta ngwaahịa.
Iji maa atụ, Ogbukiri si,"E nwere ala n'Owere ebe ndị mmadụ bụ ebe amapụtara maka ụgbọoloko mana ndị mmadụ ruru anọ azụọla ya n'ihi n'ala ahụ dị ebe dị mma."
"Ị ga-ebe e mewere maka ịwu ụlọ ana-emepụta ngwa ahịa, ị ga-azụọ ala maka obibi na-ụdị ebe ahụ, ị ga-adanye na nsogbu."
3. Okwu ala ahụ ọ dị n'ụlọikpe?

Ebe foto si, Uche Akolisa
Ịzụ ala okwu ya dị n'ụlọikpe bụ iji aka gị kotere onwe gị nsogbu.
Gba mbọ mee nchọpụta ka ị ghara ibe "m gara mara."
4. Kedụ ka ntọala ụlọ ahụ siri kwụrụ?

Ebe foto si, Odogu Emman
Akinwale si na ọ dị mkpa itule ma ntọala ụlọ ị chọrọ izu ọ kwụsikwara ike.
Ọ sị, "Onye injinia bụ ọkachamara n'ewumewu nke Bekee kpọrọ 'structural engineer bụ onye ị ga-akpọ ka o lere gị ma ụlọ ị chọọ ịzụ ọ kwụ dịka o kwesịrị n'ihi ụfọdụ ụlọ enweghị ezi ntọala.'
Ụfọdụ ndị ji anya okenye ahụ ihe dara mmiri ga-agwa gị n'ọdị mma ile ala oge udummiri.
Ogbukiri tụpenyere gị azụ sị gị "gaa were anya gị hụ ebe ị chọrọ ịzụ. Ọhịa dị ya, sụọ ya."
" Ọ bụrụ ala onye ọzọ, onye nwe ya ga-apụta jụọ gị onye dunyere gị sụwa ala ya."
5. Ụlọ ahụ enwere nkwado "Town Planning"?

Akinwale kwuru na ọ dị mkpa ịmata ma ụlọ ị chọrọ ịzụ ọ gbaso nhazi obodo(Town planning) dịka gọọmenti sị kwado ya.
Ọ bụrụ n'ụlọ dị n'ebe ọwammiri kwesiri ịdị, maọbụ n'ebe ekwesịrị ịwa okporoụzọ, gọọmenti nwere ike ikutu ụlọ ahụ oge ị tụghị anya.
6. Ị gbakọ aka zụ ala ka ọ bụ ịzụrụ onwe onye?

Ebe foto si, Getty Images
Akinwale kwuru na ha abụọ nwere uru na ọghọm dị ya.
"Ị zụọ nke onye nwe ala(ọmọnile), ọ dị mkpa ịgba ọsọ ga tinye aha ala ahụ na gọọmenti n'ihi na ọ bụ onye bụ ụzọ denye aha ala ahụ ka gọọmenti ma dịka onye nwe ala."
Nke a bụ n'ihi na i meghị otu ahụ, ha nwere ike resikwa onye ọzọ otu ala ahụ.
Akinwale kwuru na ọ bụrụ na ị bụ onye banyere ọhụrụ n' itinye ego n'ịzụ ala, ịzụ ala ebe a gbakọrọ aka nwee ala nke Bekee kpọrọ 'estate' kacha mma karịa nke onye.
Nke a bụ n'ihi na n'agbanyeghị na dị ala ahụ na-adị oke ọnụ karịa, ha na-enwe ezi nchekwa, ebe ndị hiwere ya na-etinye okporoụzọ, ọwammiri ma nwetakwa ikike ala ahụ n'aka gọọmenti.
Mana onye nwee ala ga-ersị gị ọnuala mana o nweghị ihe nhazi ọbụla ọ ga-etinyere gị nke ọ na-enwe ezi nchekwa.
7. Chọọ onye ọkachamara n'ihe gbasara ala nke Bekee kpọrọ 'estate surveyor'
Nke a ga-egboro gị mkpa bido na ese mbụ rue nke isii.
Onye 'estate surveyor' aha ya dị n'akwụkwọ ndị otu ahụ bụ onye nwere ọzụzụ maka ihe niile gbasara ala maọbụ marakwanụ onye maọbụ onye ihe gbasara ala dị n'aka.
Akinwale, onye bụ 'Estate Surveyor' sị, na" ọ bụ ya ga-enyere aka ịdụ gị ọdụ ihe kwesiri ịchọpụta maka ala maọbụ ụlọ ị chọọ ịzụ.
Cheta na ndị etinyeghị anya na mmiri were zụọ ala ga-ebe ka nwata tara ose ma ha danye na nsogbu maka akwụgbughị ajụgbu were eri.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
- Lee ndị Amerịka chọpụtarala na ha bụ ndị Igbo
- Gịnị na-esere Mbazulike Amaechi na Jim Nwobodo?
- Onye bụ Umaru Altine chịrị Enugwu dịka 'Mayor'?
- 'A kwụrụ anyị otu nde Naịra iji gbuo Uwa Omozuwa'
- Kedụ ihe dị iche n'ịlọụwa, agwụ, ọgbanje na nkwenye dị ọzọ ndị Igbo nwere gbasara ọnwụ na ndụ?
- Ihe ndị ị na-ekwesịghị ime n'akụkụ onye Igbo











