Igbo Ancestry: Lee ndị Amerịka chọpụtarala na ha bụ ndị Igbo

TD Jakes and Forest Whitaker

Ebe foto si, TD Jakes and Forest Whitaker

    • Onye dere ya, Chigozie Ohaka
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo service
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Nke Igbo mere ọkacha mma? I lee anya, i ga-achọpụta na ebe ọbụla ihe na-aga nke ọma, aka onye Igbo na-adịkarị ya.

Maka etu ndị Igbo na-esi emekarị njem dịka ndị mbịarambịara, ọ bụghị ihe ọhụrụ ịnụ na ndị Igbo mụrụ nwa na mba dị iche iche.

Ka ọtutu afọ gachara, ọtutu n'ime ndị a amụrụ na mba ọzọ ọtụtụ afọ gara aga, amalitela iji teknụzụ na sayensị wee chọpụta na ha bụ ndị Igbo site na inyocha ihe a kpọrọ 'DNA' ha.

BBC Igbo na-atụle mmadu abụọ a so n'osisi ka osisi ma a bịa na mba Amerịka.

Mmadụ abụọ a egosikwala n'ezie na ha bụ ezi ụmụafọ Igbo n'ihi na ha na-eme ọfụma n'akaọrụ ha dị iche iche.

T.D Jakes

T.D Jakes

Ebe foto si, T.D Jakes

TD Jakes bụ onyendu ụka Kraist nke nwe ụlọụka a kpọrọ 'Potters House' ma bụrụkwa onye na-emeputa ihe onyonyo ama ama n'ụwa nille gburugburu.

TD Jakes bidoro ịka ụka dịka onyendu mgbe ọ dị naanị afọ iri abụọ na atọ n'afọ 1980.

Kama, ọtụtụ mmadụ amaghị na ndị nnanna nwoke a bụ ndị Igbo, nke mere ka ọ bụrụ nwaafọ Igbo.

O kwuru na ndị Igbo bụ ndị a na-akpọ "Black Jews" ma kwuokwa na ndị Igbo bụ ndị na-agba mbọ.

Lee ihe onyeisioche n'ahu maka ndị Naijirịa nọ n'ofesi kwuru maka nkea:

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Forest Whitaker

Forest Whitaker

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Forest Whitaker na-enyere ụmụaka ndị agha metụtara na mba Uganda aka.

Forest Whitaker bụ onye na-eme ejije na mba Amerịka nke a ma dịka "Hollywood".

Forest bidoro ime ejije n'afọ 1982.

Echiri ya echichi "Nwannedinamba" nke Nkwerre Imo steeti.

O mere nyocha 'DNA' were chọpụta na nnanna ya bụ onye Igbo.

Olaudah Equiano

Olaudah Equiano

Ebe foto si, Alamy

Nkọwa foto, " A bụ m onye eluigwe hụru n'anya" Olauda Equiano

Olauda Equiano bụ onye Igbo ndị ntọ tọọrọ n'obodo Isieke nke dị n'Imo steeti mgbe ọ dị afọ iri na otu.

Ndị ntọ a tinyere ya n'ụgbọmmiri nke buru ya gaa obodo Barbados.

Otu nwoke onyeocha bụ Micheal Pascal zụtara ya dịka ohu were nye ya aha Gustavus Vassa n'afọ 1754.

Micheal kuziere ya etu esi akpọ ugbọ were mechaa ziga ya obodo Briten ka nwunye nwanne ya guziere ya akwụkwọ.

E mechara, Robert King onye Amerịka were gote ya.

Robert King kwere ya nkwa na ọ ga enwere onwe ya ma ọ kwụọ ya Pọm iri anọ (nhata ya bụ Pom 5,400 n' 2018) n'afọ 1756.

Olauda kwuru ugwu a were nwere onwe ya n'afọ 1766.

Olauda Equiano dere akwụkwo ya ama ama nke ọ kporọ " The Interesting Narrative of The Life of OLauda Equiano, or Gustavus Vassa, the African" n'afọ 1789.

Akwụkwọ a kọwara ihe niile gbasara ndụ ya.

Olauda lụrụ nwanyị onyeocha, ha mụtara ụmụnwanyị abụọ.

Olauda nwụrụ n'afọ 1797.

Ọtụtụ ndị ọzọ dịkwa ka mmadụ abụọ a achọpụtala na ha gbara mgbọrọgwụ n'ala Igbo. N'otu n'otu, ha ga na-agbakwa onwe ha n'anwụ.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ga-amasị gị

Akara ntụ-ntụ

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Obyno Daddy Muna

Nke a ga-amasịkwa gị:

Aha onyonyo, The Experience 13: Lee ka Don Moen na otiegwu ndị ọzọ na-asụ Igbo