Umaru Altine: Ị ma nwoke Fulani a bụ 'Mayor' Enugwu?

Ebe foto si, Facebook/Africa Archive
- Onye dere ya, Adline Okere & Chigozie Ohaka
- Ndị mere akụkọ a, Editor, BBC Igbo
Mallam Umaru Altine bụ Meyọ (nke Bekee kpọrọ Mayor) na mpaghara ụfọdụ n'Enugu steeti.
Altine bụ onye mbụ meriri ntuliaka maka ọkwa Meyọ nke afọ 1952, wee chịa ruo 1958.
Ọ chịrị n'ebe anyị ma ka Enugwu municipal council n'Enugwu steeti ugbua.
Ọ zọrọ ọkwaọchịchị site n'otu patị NCNC ya bụ National Council of Nigeria and the Cameroons; nke Herbert Macaulay hibere n'afọ 1944.
Onyeisiala mgbe ahụ bụ Nnamdi Azikiwe sokwa n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị NCNC n'oge ahụ.

Ebe foto si, Getty Images
Ọ bụkwa otu patị a ka onye onyeisiala Naịjirịa nke mbụ bụ Nnamdi Azikiwe jiri baa ọchịchị.
Gịnị ka anyị ma maka Malam Umoru Altine?
- Ọ bụ onye Fulani si Sifawa na Sokoto.
- O meriri ntuliaka ugboro abụọ.
- Ọ na-ere ehi n'Enugwu.
- O nwere nkwado Nnamdi Azikiwe ka o wee bụrụ onye izizi Meyọ Enugwu.
- O jiri vootu 117 merie DT Inyang chịtara vootu 58.
- Ọ chịrị site n'afọ 1952 ruo 1958.
- Ọ chịrị tupu Naịjirịa enwereonwe n'afọ 1960.
Olee ihe Meyọ na-eme?
- Dịka 'Ide Mbanọ' bụ Goddy Uwazuruike si kwuo, onye Meyọ bụ onye nchịkọta ihe a mara ka okpuruọchịchị ise maọbụ isii taata.
- Uwazuruike kwuru na onye ji ọkwa Meyọ na-elekọta ọtụtụ ihe. Ha gụnyere: ọdịmma okporoụzọ, ụlọakwụkọ, ahịa, nchekwa obodo nakwa ọdịmma ndị bi na ya.
Ụfọdụ ndị dere maka Altine na-ekwu na ọ lụrụ nwaanyị Igbo mana o nwebeghi ihe gosiri ya kpọmkwem.
Ka ọ dị taa
Ọ bụ eziokwu na ọ rara ahụ ịhụ onye si mpaghara ọzọ na Naịjirịa imeri ntuliaka na mpaghara na-abụghị nke o si pụta, mana ọ ka na-eme.
Taa, onye Igbo, Emeka Idimogu, so na ndị omeiwu na Legọs steeti.
Idimogu meriri ntuliaka n'afọ 2015 nakwa 2019.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:












