Indaboski Bahose: Ihe iri ọtụtụ mmadụ amaghị maka Odumeje

Chukwuemeka Ohanemere

Ebe foto si, Instagram/Prophet Chukwuemeka

Nkọwa foto, Chukwuemeka Ohanemere
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ị jụọ ọtụtụ ndị mmadụ onye ụkọchukwu aha ya kacha ewu ewu na Naịjirịa ugbua, onye mbụ ị ga-anụ aha ya bụ Odumejeje.

Chukwuemeka Ohanemere bụ ụkọchukwu na-elekọta ụlọụka 'Mountain Of Holy Ghost Intervention And Deliverance Ministry' dị n'Ọnicha, Anambra steeti.

Odumejeje bụ ụkọchukwu ma bụrụkwa onye otiegwu. Egwu ya agasaala ọtụtụ steeti na Naịjirịa.

Aha a na-etu ya buru ibu nke gunyere: 'Lion', 'Liquid Metal', 'Indaboski Bahose' dịrị gawa.

Otu onye ma ya ọfụma na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC ọtụtụ ihe ndị mmadụ amaghị maka odogwu nwoke a:

Chukwuemeka Ohanemere

Ebe foto si, Holy Ghost Intervention

Nkọwa foto, Chukwuemeka Ohanemere onye e ji Odumejeje mara
  • Odumeje bụ nwa nke atọ n'ime ụmụ isii nne na nna ya mụrụ
  • Ọtụtụ na-eche na ọ bụ onye Anambra steeti mana ọ bụghị eziokwu. Nne na nna Odumeje bụ ndị Orsu Ihiteukwa n'Imo steeti
  • Ụbọchị ncheta ọmụmụ ya pụrụ iche n'ihi na ọ bụ ụbọchị itoolu n'ọnwa nke itoolu (09/09), ya bụ abalị itoolu nke ọnwa Sepụtemba
  • Odumeje gụrụ akwụkwọ na 'Prudence Comprehensive Commercial College nke dị n'Ọdọakpụ ọnịcha
  • Egwuregwu bọọlụ na-amasị ya nke ukwu, nke na o cheburu echiche ịbụ onye ọgbaa bọọlụ oge ọ na-eto.
  • Ọ gbara odibo n'aka onye na-azụ ahịa akpụkpọ ahụ ụmụ anụmanụ nke bekee kpọrọ 'leather'
  • Odumeje dị afọ 19 oge e ji kpugheere ya na ọ ga-abụ onye amụma. Mana tupu ọ malite ime ekpere, ọ bụ onye isi ike ndị mmadụ ma nke ọma na Fegge, Ọnịcha bụ ebe ọ nọ too
  • Oge o chegharịrị, ọ malitere izisa oziọma nakwa ibu amụma n'okirikiri ogbe ha nke mere ka ndị enyi ya na mbụ na-achị ya ọchị ma na-akwa ya emu
  • Odumeje malitere dịka onye otu ekpere 'Charismatic' nke ndị ụka Katọlik tupu ọ malite ụlọekpere nke aka ya
  • Dịka akụkọ dị n'ọba ozi ụka ya si kwuo, ọ bụ n'afọ 2000 ka Odumeje malitere ụlọ ekpere ya n'uju
  • Ọ bụ nne ya nyere ya obere ego o ji malite ọrụ ụkọchukwu ya
  • Odumeje nwekwara nzere 'Doctorate' nke Mahadum Gregory dị n'Uturu, Abịa steeti nyere ya n'ihi ọrụ enyemaka ọ na-arụ
  • Odumeje alụọla nwaanyị ma mụta ụmụ anọ
  • Nwunye ya bụ onye Umuobom dị na Ideato South n'Imo Steeti

Ihe mere Odumejeje ji ewu ewu ugbua

  • Ya na ndị ejije Nollywood dị na mma. N'ọdị nso a, otu 'Actors Guild of Nigeria' kwanyeere Odumejeje ugwu dịka 'patron'
  • Ndị mmadụ na-ekwu na egwu ya na-atọwa isi.
  • Ọtụtụ na-ekwu na ọ naghị ezo omume ya ezo, ọ bụghị onye ihu abụọ
  • Etu o si asụ bekee na-atọ ọchị mana ọ chọghị ịma
  • Ọ bụ onye gara gara. Etu o si agụ egwu nakwa etu o si agba egwu na-akpa ndị mmadụ obi ọma
  • Ihe ya na-amasị ndị ntorobịa nke ukwu ọkachasị ụkwụ egwu ya.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka Odumeje na soshal midia

Mahadum 'Gregory University' nyere Odumeje nzere 'doctor of humanity'

Ebe foto si, Instagram/Prophet Chukwuemeka

Nkọwa foto, Mahadum 'Gregory University' nyere Odumeje nzere 'doctor of humanity'

Ụfọdụ na-ekwu na onye chọrọ obi aṅụrị gakwuru Odumeje

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Ndị ọzọ na-eto ya maka ụkwụ egwu ya

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2