Kamala Harris: Ihe ị kwesịrị ịma maka nwaanyị onye isi oji a bụ osote Joe Biden ọhụrụ

Kamala Harris

Ebe foto si, Getty Images

Joe Biden, onye na-azọ ọkwa ọchịchị mba Amerịka n'otu Demokrat ahọrọla Kamala Harris, onye ọkaiwu ka onye osote ya.

Ka a na-akwado ịga tụọ aka, n'afọ 2020 n'Amerịka, Joe Biden egosila ụwa niile osote ya na ntulaka na-abịa.

Ọ bụ nwaanyị isiojii a na-akpọ Kamala Harris.

Ndị mmadụ na-aja maka ị họro nwaanyị nke mbụ ma bụrụkwa onyeisi o

Olileanya maka Kamala Harris

Lee ụfọdụ ihe i kwesịrị ịma maka ya:

  • A mụrụ ya n'Ọktoba 20 n'afọ 1964 na Oakland, Kalifọnịa.
  • Nne na nna ya bụ Shyamala Gopalan na Donald Harris, ndị mbịarambịara n'Amerịka,
  • Nne Harris - Shyamala Gopalan bụ onye Nepal, n'Indịa mana nna ya bụ Donald Harris bụ onye Jamaịka
  • Kamala Harris bụ onye ọkaiwu. Ọ gụrụchara akwụkwọ na Mahadum Howard.
  • Ọ bụ onye ụlọomeiwu nta na Kalifọnịa, ọkwa ọchịchị ya malitere na Jenuwarị 21, 2019,
  • Kamala Harris na Joe Biden so nwee nrụrịtaụka nke ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị Demokrat mere na Nọvemba 2019, tupu ọ họpụta ya ka onye osote ya na-anọchị anya ndị Demokrat n'Atlanta, Georgia.
  • Kamala Harris bụ nwaanyị onye isi ojii nke mbụ a na-ahọpụta ka osote onyeisiala
  • Harris lụrụ Douglas Emhoff na 2014, mana Kamala Harris na di ya amụtabeghi ụmụ