Okwesilieze Nwodo: Ihe ga-emebi rinne ma ọ bụrụ na Ndigbo achịghị Naijirịa n'afọ 2023

Aha onyonyo, Okwesilieze Nwodo: Ọ bụrụ na-enyeghi onye Igbo ọkwa onyeisi Naịjirịa, ihe ga-emebi
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Onye chịbụrụ dịka Gọvanọ Enugwu steeti bụ Okwesilieze Nwodo ekwuola na ọ bụrụ na Ndigbo enwetaghị ohere ịbụ onyeisiala Naijirịa n'afọ 2023, "na ihe ga-emebi rinne."

Nwodo kwuru na o meghị etu a, na ndị Okenye Igbo na-eji ndị ntorobia ha chọrọ nnwereonwe ka ha dereju, agaghị enwekwa ihe ha gbadoro ụkwụ iji si ha nwee ndidi na onye ọbụla ga-enweta oke ruru ya na Naijiria.

Nwodo, onye kwuru nke a oge ya na BBC Igbo nwere mkparịtaụka ụbọchị Tuzde kwuru na dị ntorobia Igbo na-ekwubu na ndị ọzọ agaghị ekwelata ka Igbo chia Naijiria ga-asị na ihe ha kwuru emezuola.

O kwukwara na ndị agbụrụ ndị ọzọ obi adịghị mma n'ihe na-eme Naijiria ndị na-ekwu okwu ọpụpụ ga-ekwechiri ịpụ na Naijiria ma Igbo enwetaghị ohere ịchị n'afọ 2023.

Okwesilieze Nwodo

Ebe foto si, Okwesilieze Nwodo

Nwodo tụrụ arịrị na naanị Igbo bụ otu n'ime alaka atọ Naijiria ji kwụrụ enwetabeghị ohere ịbụ onyeisiala.

Ọ sịkwa, "Anyị chọrọ Naijiria onye ọbụla nọ n'ime ya ga-enweta afọ ojuju mana ọ bụrụ nke a na-eme anyị ihe a na-eme Igbo kemgbe Agha biri, anyị ga-esokwa ndị ọzọ sị ka ahapụ Naijiria."

Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụghị ugbua o ruru Igbo ka a ga-ana-ekwu okwu onye tozuru dịka ọ kwuru na Igbo nwere ebu nwee ụfụ na ndị tozuru ịchị dịka onyeisiala.

Nwodo kwuru ọtụtụ ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ na nkata ahụ, lee ụfọdụ n'ime ha:

1. Maka Nnamdi Kanu na-ọchịchọ Biafra

Nwodo kwuru sị "anyị bụ ndị okenye na-agwa Nnamdị Kanu na ọ bụrụ na anyị ga-enweta Bịafra, na ọ bụghị ịkparị ndị mmadụ ka anyị ga-eji enweta ya".

Nwodo kọwara na ụfọdụ ndị agbịrụ ndị ọzọ nwere ike iji okwu ọnụ Kanu megide ndị be anyị.

Aha onyonyo, Ndị Igbo ji ekwurekwu ebutere onwe ha nsogbu na Naịjirịa - Onyeisi Ohaneze Legọs

Ọ kọwakwara na dịka o si na ha ga-esonye Nnamdị Kanu, na nke ahu apụtaghị na ha kwadoro maọbụ na ha ga-eso ya akparị ndi mmadụ.

Ụzọ a ga-esi enweta Biafra na-alụghị ọgụ bụ ime ihe a na-akpọ 'plebiscite' n'okwu bekee ma sịkwa na ụzo ọzọ bụ ịju ndị mpaghara ma ha chọrọ ịpụ.

Plebiscite bụ mgbe ndị mmadụ mere ntụliaka iji mara ma ha a ekwenyere ịsoro mba ọbụla maọbụ na ha achọghị.

Okwesilieze Nwodo

Kama enweghị iwu kwere na gọọmentị ga-eme ihe pụtara na ntụlịaka plebiscites.

Nwodo kọwara sị, "ebe anyị kpọ ụmụ Igbo na-aga, kedụ ihe anyị ga-eme ma ọ bụru na ndi ahụ achọghị anyị?"

O kwuru na ha na-arịo ndị agbataobi Ndigbo na ndị agbụrụ ndị ọzọ ka ha "mee ndị etu e mere ibe ya".

O kwukwara sị, "Ị gaghị akpọchị anyị na nga sị anyi ekwula okwu ma sịkwa anyị esola ndị na-ekwu okwu".

Nwodo kwuru a ndi niile hụrụ Naijirịa n'anya sị ka a hapu Ndigbo ka ha chịa.

2. Maka nhazigharị Naijiria

Okwesilieze Nwodo kwuru na ọtụtụ otu na-anọchite anya ndị agbụụ na mpaghara dị iche iche na Naijirịa na-ekwusi maka 'restructuring' ike.

O kwuru na atụmatụ nghazịharị Naijirịa na mpaghara na mpaghara nke Bekee na-akpọ 'restructuring' dị oke mkpa maka akụnaụba, ndọrọndọrọ ọchịchi ma ọ ga-eme ka udo dị na Naijirịa.

Nwodo kwuru na gọọmentị a nwere ike iji afọ abụọ mee ya bụ nhazigharị.

O kwuru sị "nke a ga-eme ka ntụlịaka ọzọ a ga-eme hapu ị bụ tigbuo zọgbuo".

Gee ihe Okwesilieze Nwodo kwuru n'uju ebe a:

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

Ọ kọwara na nke a ga-eme ka mpaghara ọbụla were ihe ha nwere leta onwe ha anya, ma sịkwa na ọ dị mkpa ka eme ya tupu ebido election.

3. Kedu Igbo nke ị na-ekwu ga-achị, ọ bụ Igbo nọ Benue, Edo,Rivers dgz?

O kwuru sị " onye igbo ọbụla banye n'ọchịchị, ya bụ na Igbo achịwago".

Nwodo kwuru na ndị Igbo agaghị ekewa onwe ha n'ihi na onye ọbụla bụ onye igbo na-asụ igbo ebe ọbụla o si , ga-anọchite anya ndị Igbo nke ọma.

O kwusiri ike sị "anyị agaghị ekewa onwe anyị ma ọrụọ oge ntụlịaka, ihe anyi chọrọ bụ ka nwaafọ Igbo chịa".

4. Kedu ihe ndi Igbo na-eme iji chịkọlata onwe ha?

Nwodo zara sị "Naijirịa ebuka, anyi agaghi enweta ya naani anyị" kama agbụrụ ndị ọzọ nọ na Naijirịa ga-esonye kwado Igbo inweta ihe ha na-achọ.

O kwuru si "anyị nweta ọchịchị, anyị ga-ahụ na onye ọbụla nwetara ihe ruru ha".

5. Kedu maka ndị sị an ha achọghị Naijirịa na ha chọro Biafra?

Okwesilieze Nwodo zara sị " echeghị m na Biafra ga-enye anyị ihe niile anyị chọrọ kita".

O kwuru na nke abụọ bụ na gọọmentị Naijirịa achọghị ka Igbo naba, kama ha na-achọ ụzọ ga-adịrị ha mfe.

O kwuru sị " ọ bụghị ihe anyị ga-eji ọgụ nweta n'ihi na anyị adịghị njikere ọgụ, anyị ga-eji akọnụcha nweta ya, anyị ga-akpa ya akpa".

6.Ụfọdụ na-ekwu na o bụruna PDP rụrụ ọru nke ọma na APC agaghị imeri

O kwuru na PDP mere nke ọma n'ime afọ iri na ise ha chịrị.

Nwodo jụrụ sị, "Lee ebe anyi debere ọchịchi onye kwuo uche ya mana kịta ndịa batara kedu ebe ọ nọ?".

Aha onyonyo, 2023 Election: 'Ndị ọchịchị na-akawapụ ndị Igbo akwapụ' - Ezeife

7. Kedụ nke ka mma; inwe pati abụọ kabụ inwe ọtụtụ?

Ọ sị, "Ọ ka mma inwe pati abụọ" n'ihi na ha ga-enwe nkwenye doro anya nke Bekee kpọrọ 'ideology'."

Nwodo ji mba ndịọcha wetara ọchịchị onyekwuouche ya dịka Amerịka, Briten, Fransi, Jamanị ama atụ mba ndị nwere pati abụọ, abụọ.

O kwuru na inwe pati karịrị abụọ bụ "imebisi ego " dịka o kwuru n'ụfọdụ na-eme ya iji nweta ego Inec na-eke pati.

Ọ kọwara na ọ bụrụ na ị na-azọ ọkwa mana inwetaghị ohere inweta ikike na pati abụọ, ịzọ dịka 'independent'.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: