Hydroxychlorine and Zithromax: 'Stella Immanuel esoghi usoro e ji ekwupụta maka ọgwụgwọ ọrịa' - Ndị Dọkịta Naijirịa

Trump na Stella

Ebe foto si, GETTYTWITTER

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6

Ndị dọkịta Naijirịa ekwuola uche ha maka okwu Stella Immanuel kwuru ebe ọ sị na o ji ọgwụ Hydroxychloroquine agwọ ma na-egbochi ọrịa coronavirus.

Ndị tinyere ọnụ n'okwu a bụ ndị okammụta n'ihe gbasara nje na-ebute ọrịa na ahụike ọha mmadụ.

Okammụta Bayo Onajole

Dọkịta Bayo Onajole bụ ọkammụta ahụike ọha n'ihe gbasara etu nje sị amụbanye n'ọha mmadụ nke Bekee kpọrọ Epidermiologist.

Onajole kọwara na ọrịa coronavirus bụ ọrịa ọhụrụ a na-ahụbeghi mbụ.

Ọ kọwara na ụfọdụ ndị apụtala kwuo na ha jiri ọgwụ di iche iche gwọọ ọrịa coronavirus.

Onajole kwuru na otu n'ime ọgwụ Immanuel kpọpụtara bụ ọgwu eji agwọ ọrịa nje Bacteria kama coronavirus bụ ọrịa nje Virus na-ebute.

Aha onyonyo, Covid 19 n'otu nkeji: 'Dogoyaro' o nwereike ịgwọta coronavirus

O kwuru na e kwesiri ime nyocha nke ọma, lee ọnụọgụgụ anya iji mara nke bụ eziokwu.

Onajole kwuru na Immanuel kwesiri iso usoro kwesiri ekwesi ma mee nyocha etu o kwesiri nke a na-akpọ Scientific Peer Review n'okwu bekee tupu ọ pụta kwuo okwu ọbụla.

Ọ rụtụkwara aka n'etu Immanuel si kwuo okwu mere ka ọ dịka ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị.

Dọkịta Ezekiel Oridota

Dọkịta Ezekiel bụ onyeisi ndị ọrụ ahụike na-aluso ọrịa covid-19 ọgụ na Legọs steetị.

Ọ bụ kwa ọkammụta n'ihe gbasra ahụike ọha na etu nje si amụbanye na mahadum ụlọọgwụ nke legọs steeti.

Ọ Kọwara na e nwere usoro tupu mmadụ ekwuo na ọ chọpụtala etu e si agwọ ọrịa.

Oridota kwuru na ocheghị na Immanuel mere nyocha dịka etu ndị sayensi si eme ya.

Ọ kọwara na ọ bụ ihe ọ hụtara n'ihu ọrụ ya ka o jiri kwuo ihe o kwuru.

Dkt Oridota kwuru na ha na-eme nyocha nke ha n'ụzọ ziri ezi

Aha onyonyo, Akpụkpọ ụkwụ ọ na-ebu coronavirus

Oridota kwuru na ha na-eme nyocha na LUTH ma n'ime izuụka ole na ole na ndị mmadụ ga-ahụta mpụta nyocha ha.

Ọ rịọkwara ka ndi mmadụ mee ihe niile gọọmentị si ha mee maka nchekwa ọrịa coronavirus.

Dọkịta Ore Makinde

Dọkịta ore Makinde bụ dọkịta na-ahụ maka ahụike ezinụlọ.

Makinde kwuru na ọ nabataghị etu Stella Immanuel si kwupụta ihe ọ chọpụtara.

Ọ kọwara na Immanuel kwesiri iwepụta ihe ọ chọpụtara ma gosi kwa ọnụọgụgụ etu ziri ezi.

Makinde sị na e kwesiri itule ma nyocha ihe Immanuel kwuru site n'usoro bekee na-akpọ "Peer Review" tupu o kwuputa ya.

Ebe Donald Trump kwụ

Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump akwadola ọzọ ka e jiri ọgwụ hydroxychloroquine were buso coronavirus agha.

O kwuru ya ka onyonyo ebe dọkịta onyeisi oji bụ Stella Immanuel na-ekwu maka etu Hydroxycloroquine si gwọta ndị ọ na-elekọta bu ọrịa coronavirus fegharịchara n'elu intanet.

Trump sị na ihe mere ndị ọrụ ahụike ya ji jụ ịnabata ọgwụ a e ji agwọ ọrịa ịba bụ maka na ọ bụ ya wepụtara atụmatụ a.

O kwuru na Twitter machiri ọkpara ya nke nnukwu tinyere onyonyo ahụ ma na-akwado hydroxychloroquine.

Trump kwuputere ihe ndị a mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu na "White House" ebe onye ntaakụkọ jụrụ ya maka ihe nkiri ahụ.

Trump kwuru na o nweghị ihe ọbụla ọ ma maka nwaanyị ahụ ma gawara onwe ya.

Mana Trump toro ihe onyonyo nwaanyị ahụ mere n'elu twitter ya mgbe ọ pụtachara.

Ihe ndị ị na-amaghị maka Stella Immanuel kwuputere maka ọgwụgwọ covid-19

Ndị mmadụ chọrọ imata maka nwada Stella Immanuel, onye Facebook, Twitter nakwa ụlọọrụ soshal midia ndị ọzọ dọtụrụ onyonyo ebe o na-ekwupute maka ọgwụ nwereike ịgwọ covid-19.

Ha na-ajụkwa ihe mere o ji kwupute maka hydroxychloroquine nakwa ndị ya kwụ mgbe o na-eme nkwupute ahụ. Cheta na WHO kwuru na ọgwụ ahụ anaghị agwọta ndị na-arịa coronavirus.

Mana BBC hụrụ onyonyo ọzọ dịka agba abụọ nke nkwupute Immanuel.

Onyonyo ahụ gosiri dọkịta dị iche iche nakwa dọkịta Immmanuel kọwara onwe ya dịka ụkọchukwu nakwa 'onye agha nke chukwu.'

N'okwu ya, "ọgwụ a karịrị ndị wenitere isi na Amerịka, ndị democrats na republicans,. ọ bụ amansi a ga-ejili naanị agha ime mmụọ wee merie."

Stella Immanuel

Ebe foto si, Twitter

"Ndị kwadoro ọrịa ebughị ọdịmma mmadụ ibe ha n'obi."

Ihe ndị ikwesiri ịma maka Stella Immanuel

N'ime Onyonyo ka dịnụ mgbe e dere akụkọ a, Immanuel kwuputere na ọ bụ onye Cameroon , nwetere ọzụzụ maka ahụike na Naịjirịa. ọ batara na mba Ameịka n'afọ 1992. o kwukwara na ọ nọla ebe ahụ ruo afọ iri atọ.

  • Aha ya n'uju bụ Stella Gwandiku-Ambe Immanuel, ọ dị ebe afọ iri ise na ise
  • Ọ gara akwụkwọ na Cameroon Protestant College dị na Bali, Northwest of Cameroon
  • Ọ gara Mahadum na University of Calabar dị na Naịjirịa ma gụchaa n'afọ 1990
  • Ọ mụtara nwa nwaanyị nwetekwara ọzụzụ dịka dọkịta na mahadum "Baylor University" na "University of Westminster"
  • Ọ malitere njem dịka dọkịta na ụlọọgwụ Paediatric Clinic na Louisiana
  • Ọ bụ ụkọchukwu chọpụtara Fire Power Ministries dị na Houston, Texas. Dịka ụlọụka ahụ si depụta na soshal midia ha, ha na-eme nkpocha na nzacha nke mmụọ.
  • O deela akwụkwọ ise nke dị na webusaiti ndị Amazon
  • Na 2019 ka o bidoro rụwa na Rehoboth Medical Centre bụ ngalaba ahụike o hibere

Hydroxychroloquine na Zithromax dọkịta a kpọpụtara a na-agwọ coronavirus?

Ụwa na-ekwu n'elu soshal midia maka Dọkita Stella Immanuel nọ mba Amerịka maka etu o si kwuo n'onyonyo na-efegharị ka o si jiri ọgwụ Hydroxychroloquine nakwa Zithromax gwọta mmadụ 350 na-arịa ọrịa coronavirus.

O kwuru na o ji ya bụ ọgwụ e chekwa ndị ọrụ ya iji gbochie ha ibute coronavirus.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Stella kwuru na ndị o ji ọgwụ ndị a gwọta gụnyere ndị bu ọrịa shuga, asthma nakwa ndị kalara nka.

O gara n'ihu kwuo na ọtụtụ ndị mmadụ welitere isi n'Amerịka na-aṅụ ọgwụ ndị a mana ha achọghị ka ụmụ ụwa mata maka ya.

O kwuru na ọ bụrụ na ha ma na ha anaghị aṅụ ọgwụ ndị a, ha ṅyụta mammiri ha ka o mee ya nnyocha ka eziokwu gbaa.

Mana Hydroxychroloquine nakwa Zithromax a na-agwọ Covid-19?

Sam Ohuabunwa bụ ọkachamara n'ihe gbasara ọgwụ ma bụrụkwa onyeisi otu jikọrọ ndị na-akụ ọgwụ a kpọrọ 'Pharmaceutical Society of Nigeria' kwuru na ọgwụ abụọ ndị dịcha mma n'onwe ha.

Mana tupu onye dịka dọkịta Immanuel pụta gwa ndị mmadụ ha nwụwa ya maka ọgwụgwọ Covid-19, na o kwesiri iji usoro e si eme ya na ngalaba ahụike.

Usoro ahụ gụnyere, Immanuel idepụta ihe ndị ọ chọpụtara ma kwe ka ndị ọkammụta tinye ya anya, nwalee ma mara ka ya bụ ọgwụ si agwọ ihe ọ sị na ọ na-agwọ.

Ohuabunwa kwuru na ọ bụghị onye ọbụla ka ọgwụ ndị a na-enyere aka.

O kwuru na nnyocha ndị sayensi mere gosiri na ndị ọgwụ ndị a na-emeru ahụ karịrị ndị o na-enyere aka maka na ahụ dị iche iche.

O kwuru na o nwere ndị na-agaghị aṅụ ọgwụ ma gbakee n'ọrịa coronavirus, nwekwa ndị ahụ ha ga-anabata kịrịkịrị ọgwụ ga-eme ka ha agbakee ha, nwekwarị ndị ọnọdụ ha maka covid-19 ga-akawanye njọ.

Ihe na-eme na soshal midia maka nkwupute Stella Immanuel

Stella Immanuel

Ebe foto si, YOUTUBE/AGF

Facebook, Persicope nakwa ụlọọrụ soshal midia dị iche iche dọtụru onyonyo ahụ ebe Immanuel na-ekwu maka etu hydroxychloroquine, zinc si gwọta ndị na-arịa coronavirus na mba Amerịka.

Ha dọtụrụ ya bụ onyonyo ka ndị mmadụ kirichara ya ruo nde iri na anọ dịka onyeisiala Donald Trump kesara onyonyo nke Periscope tinyere n'elu twitter ya.

Ihe mere Facebook ji dọtụọ ihe nkiri Immanuel

Ọnye na-ahụ maka nhazi atụmaatụ ụlọrụ Facebook bụ Andy Stone kwuru na ha wepụrụ ya maka na ọ bụ nkesa akụkọ ụgha maka ọgwụgwọ covid-19.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Ihe WHO na-ekwu maka ọgwụ ndị a?

World Health Organization depụtara na webụsaiti ha n'ụbọchị anọ nke Jụlai na jka ha mechara nyocha hydroxychloroquine and lopinavir/ritonavir , ịmata ma ha na-agwọ covid-19, ha chọpụtara na ọ naghị

egbochi ndị mmadụ isi n'ọrịa covi19 nwụ.

Onye bụdị dọkịta Stella Immanuel?

Dọkịta Stella Immanuel bụ onye ọrụ ahụike na Houston Texas,. Ọ na-arụ na Rehoboth medical centre dị n'obodo ahụ.

O kwuru na o nwetara ọzụzụ dịka dịbia bekee na Naijirịa mana o kwughị ụlọakwụkwo ebe o nwetara ọzụzụ a.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia

@NicoleKathryn3 toro etu dọkịta a si na-agwa ndị wenitere isi n'Amerịka ha nyụta mamiri ha ka e nyocha ma ha si na ha anaghị aṅụ ọgwụ ndị a.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Kemi Ariyo na-etokwa ya.

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 4

Akụkọ ndị ga-amasị gị