Hepatitis: Gịnị ka ọ bụ?

Ebe foto si, Science Photo Library
Dịka ụwa niile na-echeta ihe gbasara ọrịa Hepatitis taa, ọ dị mma ka ị mata na ọrịa a abụghị obere ihe.
Nke a mere ngalaba World Health Organisation ji họpụta ụbọchi 28 nke ọnwa Julaị afọ ọbụla maka ọrịa Hepatitis.
Isiokwu nke afọ 2020 ka ha kpọro "Hepatitis-Free Future" ya bụ "Ọdịnịhụ na-enweghi Hepataịtis".
Gịnị bụ ọrịa Hepatitis?
Ngalaba WHO kọwara na Hepatitis bụ ọrịa imeju, a na-akpọ ya ọrịa ịbaọcha n'anya n'Igbo.
Ọ bu nje virus kacha ebute ọrịa Hepatitis kama ihe ndị ọzọ dịka mmanya na-aba n'anya na mgbe ahu madụ na-aluso ya ọgu nke bekee kpọrọ auto immune disease na-ebutekwa ya.
Ọrịa Hepatitis di icheiche kama ọ bụ ise kacha enye nsogbu n'ụwa niile.
Ha bụ Hepatitis A, B, C, D na E.
WHO kọwara na Hepatitis A na E bụ site na nri maọbụ mmiri na-adịghị mma ka esi ebute ya.
Ebe Hepatitis B, C na D bụ site na mmiri maọbụ ọbara si n'ahụ mmadụ banya ahụ onye ọzọ ka e si na-ebute ya.
BBC Igbo kpọtụrụ Dọkịta bụ ọkammụta maka imeju bụ Dkt. Uchenna Ijoma ka ọ tinye ọnụ n'ihe gbasara ọrịa Hepatitis.

Ebe foto si, Dr Uchenna Ijoma
Dkt. Ijoma kọwakwara na ọ bụ ọrịa na-arịa imeju.
Ọ kọwara na Hepatitis B na C bụ ndị akacha elebe anya maka ha kacha egbu ime ahụ mmadụ ma na-ebute kwa ọrịa ndị ọzọ.
Ijoma kwuru ihe na-ebute Hepatitis
Dọkịta Ijoma kọwara na-enwere ụfọdu ihe na-ebute ọrịa ịbaọcha n'anya, ọ kpọpụtara ha nke gụnyere:
1. Oke mmanya - Ijoma kọwara na oke mmanya na-ebute ọrịa Hepatitis.

Ebe foto si, Science Photo Library
Ọ kọwara na ịṅụfe mmanya ọkụ oke na egbu imeju nke kacha ebute ọrịa Hepatitis.
2. Ọgwụ na-ebute kwa Hepatitis
Dkt Ijoma kọwara na ụfọdụ ọgwụ eji agwọ ụkwara nta na nke Bekee kpọrọ anti-biotics na-ebute Hepatitis.

Ọ kọwara na ọbụghị na ọgwụ ndị a adịghi mma, kama ahụ mmadu dị n'iche n'iche nke mere na ọ dị mkpa ka ọ bụrụ dọkịta nyere mmadụ ọgwụ.
3. Ọgwụ mgbọrọgwụ
Ijeoma kọwara na ọ bụghị na ọgwụ mgbọrọgwu niile di njọ kama ọtụtụ n'ime ha enweghị ọnụ ọgwụ nke Bekee kpọrọ dose.
Ma tinye kwa na ọtụtụ ha na-eji mmanya ọkụ aṅụ ọgwụ ndi a.
O kwuru sị "Ihe ndị a na-eme ka mmadụ nwee ike ibute ọrịa Hepatitis".
4. Ọrịa sitere n'ime ahụ nke Bekee kpọrọ auto-immune.
Dọkịta Ijoma kọwara na ụfọdụ mgbe, na ahu mmadụ na-alụsọ ime ahụ onye ahu ọgụ.
Ọ mara atụ sị "ụfọdụ mgbe ahụ mmadụ nwereike na-ahụta imeju ahụ gi ka ọ bụghi nke kwesiri ekwesi, nke a ga-eme ka ahụ mmadụ na ọbara eji achụ ọrịa bido lụsa imeju onye ahu ọgụ".
Ọnọdu dị otu a, na-ebute ọrịa bekee kpọrọ auto-Immune Hepatitis.
5. Ibu oke ibu

Ebe foto si, SPL
Oke ibu maọbụ ọrịa shuga na enyere aka ebute kwa ọrịa Hepatitis.
Nke a na-ebute ọrịa Bekee kpọrọ non-alchoholic fatty liver disease.
Ijoma kọwara asị "ọ bụghi mmanya na-ebute ụdịrị ọrịa a, kama otu ihe na-ebute ya bụ oke ibu maọbụ ọrịa Shuga na ebute ya bu ọrịa".
Ọnọdu a na-ebute ọrịa ịba ọcha n'anya.
Dokịta Ijoma kwuru sị "Ihe mere ndị ahụike ji etinye anya na Hepatitis B na C bu maka na ha nyecha mmadu ọrịa nke akpọro Acute Hepatitis na bekee, ha na-atọtị ya manye kwa mmadụ nke a na-akpo chronic Hepatitis".
Ijma kọwara na Chronic Hepatitis bu mgbe ọrịa a na-egbu imeju mmadụ nke na-eme ka ọnodụ ọnye ahu kawanye njọ ma bute ọrịa Liver cirrhosis, Imeju ịda mba maọbụ Kansa imeju.
Ọ kọwara na ọrịa atọ a na-esi ike ịgwọta nke mere na ọ ka mma ka egbochie ha maọbụ chopụta ha n'oge.
Kedụ etu mmadụ si ebunye onye ọzọ ọrịa Hepatitis?
Dọkịta Ijoma kọwara na ụzo esi ebute ọrịa ịgbaọcha nanya dị iche iche, ha bụ
- Site n'ọbara

Ijoma kọwara na ọ di mkpa ka enyocha ọbara nke ọma tupu etinye ya n'ahụ onye ọzọ.
Ọ kọwara na mmadụ na mmadụ iji otu ihe dịka agụba, Ngịga, ịka ichi na ihe ndị ọzọ.
O kwuru sị " Ihe ọbụla na-ewepụta ọbara ekwesịghi ka mmadu abụọ nwere ya".
2. Nne na-ebunyekwa nwa

Ebe foto si, Getty Images
Nne nwere ọrịa hepatitis nwereike ibunye ya nwa ya mgbe ọ na-amụpụta ya.
Nke a bụ na a na-enwe ọtụtụ mmekọ ọbara nke nwereike ime ka nne bunye nwa ya ọrịa Hepatitis.
3. Mmekọ nwoke na nwaanyị
Ijoma kwuru na a na-esikwa na mmekọrịta nwoke na nwaanyị ebute ọrịa Hepatitis.
Kama ọ kọwara na nke a esoghi na ụzọ ọrịa kachasị si efe kama o di mkpa ka ndi mmadụ mara na e si na ya ebufe ya bụ ọrịa.
Kedụ etu mmadụ ga-esi gbochie ibute ọrịa Hepatitis?
Dọkịta Ijoma kwuru na ụzo kachasi di ire bụ ịgba ọgwụ mgbochi ọrịa Hepatitis ọkachasị ndị ọrụ ahụike.
O kwukwara na onye ọbụla onye ezinụlo ha butere ya bụ ọrịa gbalịa gbaa ọgwụ mgbochi Hepatitis.
Ijoma kwuru si "Mmadu ekwesịghiike ihe ọbụla na-emeputa ọbara ma ka onye ọbụla hapu ịṅụ oke mmanya".
Gịnị bụ njirimara ọrịa Hepatitis?

Ebe foto si, Getty Images
Hepatitis na-abịa n'ụzọ abụọ nke bekee kpọrọ Acute na Chronic Hepatitis.
Ijoma kwuru " Acute Hepatitis ga-arịa mmadụ ahụ ọkụ , anya gị achaa odo odo, o ga-akujisi mmadụ ahụ, Ike ọgwụgwụ ma nwee kwa ike onye ahu a na-agbọ agbọrọ, ma etu nsi si acha agbanwee".
Dọkịta Ijoma kọwara na ọtụtụ ndi mmadụ na arịa Acute Hepatitis ma si na ya gbakee.
Kama o kwuru si "ihe dịka passentị iri itolu (90%) ndị bu Chronic Hepatitis anaghi ama n'ihi na ọ naghị egosi n'ahụ mmadụ".

Ebe foto si, Getty Images
Ijoma kọwara na ọ bu ya mere ka ndi mmadụ ga-enyocha onwe ha.
"Kama mgbe Chronic Hepatitis bidoro, njirimara ya gụnyere anya ịcha odo odo, ụkwụ na afo ọzịza maọbu onye ahụ ebido ịgbọ ọbara".
Ijoma kọwara na mgbe o ruru etu a, onye ahụ no n'ezigbo nsogbu.










