Kaduna: Mgbe ọgbaghara a bidoro na ihe gọọmentị merela

Ebe foto si, Getty Images
Mpaghara ndịda Kaduna steeti abụrụla ebe e ji ọgbaghara mara dịka akụkọ na-ekwu na mmadụ iri isii na atọ ọzọ nwụrụ n'ụbọchị 26 nke ọnwa Julaị, 2020.
Ugbua, ọ na-abụkarị ndị nwe obodo na ndị ọchị ehi na-ebokọrịta onwe ha ebubo mwakpo a na arụ ndị ọzọ.
Ọtụtụ ndị mmadụ akwaala arịrị maka ogbugbu na nkwafu ọbara a, mana ọtụtụ amaghị etu ya bụ ọgbaghara siri bido.
Tebulu a ga-akọwa mgbe ya bụ ọgbaghara bidoro, ndị o metụtara na ihe butere ya.

Gịnị ka eji alụ ọgụ a?
Ndị otu Amnesty International, bụ ngalaba na-ahụ maka ikike dịrị onye, na-ekwu na ha mere nnyocha wee chọpụta na ọ bụ egbe Ak-47, egbe ọka, ogbunigwe na mma dị iche iche, ka e ji alụ ọgụ ma na-akwafu ọbara a. (Nyocha Egbe)
Kedụ ihe gọọmentị na-ekwu maka ogbugbu ndị a?
Otu Amnesty International kwukwara na onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari gwara onyeisi ụka 'CMS' na ọ bụ ndịagha mba Libya nakwa egbe ha si na mba ha webata na Naịjirịa, na-enye ndị a ike.
Buhari kwuru sị " Ọ bụghị taa ka nsogbu a bidoro, ọ bụ ndịagha onye chịburu Libya bụ Muammar Gadaffi zụrụ, ndị nke gbara ọsọ mgbe Gadaffi nwụrụ. Anyị zutere ọtụtu ndị a mgbe anyị na-aluso Boko Haram ọgụ. Ndị Fulani anyị ma na-eji mma na osisi. Nsogbu a abụghị maka ofufe, kama ọ bu maka akụnụba na mmekọrịta".
Kama ndị otu a na-ekwu na naanị ihe kwadoro ihe Buhari kwuru bụ naanị ngwaagha ndị omekome a ji alụ ọgụ.
NLTP na atụmatụ ndị ọzọ
N'ọnwa Febụwarị afọ 2018 ka gọọmentị etiti hiwere nzụko nke osote onyeisiala bụ Yemi Osibanjo bụ onyeisi ha, ka ha gaa obodo ndị a ọgbaghara metụtara ka ha mata etu gọọmentị ga-esi kwụsị mkpamkpa ndị a.
Atụmatụ gọọmentị kacha tinye uchu bụ nke "National Livestock Transformation Plan" (NLTP).
Atụmatụ a bụ nke e bu n'obi na ọ ga-akwụsi ọgụ n'etiti ndị ọchị ehi na ndị ọrụ ugbo nke a ga-eji afọ iri were hiwe.
Atụmatụ a ga-agụnye Achụmnta ego, ikpe udo, ihiwe iwu obodo, enyemaka, agụmakwụkwọ na atụmatụ ndị ọzọ.
NLTP ga-ewe afọ iri ma riekwa ijeri naira otu narị na iri asaa na itoolu. (Otu Amnesty International)









