HIV Cure: Agwọtala onye ọzọ bu ọrịa HIV

Ebe foto si, Andrew Testa/New York Times/Redux/eyevine
Otu nwoke na London aha ya bụ Adam Castillejo abụrụla onye nke abụọ a gwọtara ọrịa HIV n'ụwa niile.
Ndị dọkịta chọpụtara na Castillejo enweghịzi nje HIV ka ọ gachara ọnwa 30 ọ kwụsịrị ịnara ọgwụgwọ maka ya.
Ihe tụrụ n'anya bụ na ọbụghị ọgwụ HIV gwọrọ ya.
Ihe gwọrọ ya bụ nke a kpọrọ 'stem-cell treatment' bụ nke ọ natara maka ọrịa cancer ọ rịaburu.
Dịka akwụkwọ nnyocha the Lancet HIV si kwuo, e nwere ndị ahụ ha anaghị anabata nje HIV.
Ọ bụ ndị dị otu a nyere Castillejo 'stem cells' ha nke mere ka ahụ ya kwụsịkwa ịnabata nje HIV.
N'afọ 2011, Timothy Brown onye obodo Berlin na Jamanị bụ onye mbụ a chọpụtara na ọrịa HIV ya alaala.
A hụghị nje ọrịa ahụ n'ahụ Brown ka ọ gachara afọ atọ na ọkara ọ kwụsịrị ịṅụ ọgwụ.
Timothy Brown natakwara ọgwụgwọ 'stem cell treatment'.
Gịnị bụ stem cell treatment?

Ebe foto si, Science Photo Library
'Stem-cell transplants' bụ usoro ọgwụgwọ pụrụ iche e ji agwọ ụfọdụ ọrịa siri ike dịka sickle cell, diabetes na ndị ọzọ.
Ọ bụrụ na onye nyere mmadụ 'stem cells' ya nwere ọrịa ahụ ya anaghị anabata nke Bekee kpọrọ 'immunity', onye ahụ ga-enwetakwa 'immunity' ahụ.
Ndị dọkịta na-ekwu na ọ dịka onye nyere Castillejo 'stem cells' ya nwere 'immunity' maka ọrịa HIV.
Ọkammụta Ravindra Kumar Gupta, nke Mahadum Cambridge, gwara BBC na nke a pụtara n'ọrịa HIV alaala n'ahụ Castillejo kpam kpam.

Ebe foto si, Getty Images
Gupta kwuru sị: "O ruola afọ abụọ na ọkara ọṅụbeghị ọgwụ mana HIV anọghịzị n'ahụ ya."
"Nchọpụta anyị goziri na 'stem-cell transplantation' nke gwọrọ HIV afọ itoolu gara aga nwere ike ime ọzọ."
Nnyocha na-ekwu na ọ ga-ara ahụ tupu HIV alaghachikwa n'ahụ Castillejo ọzọ.
Mana onwebeghị onye ma nke ga-eme n'ọdinihu.
Castillejo n'onwe ya kwuru na nke a bụ nnọọ ihe ịtụnanya.
O kwuru sị: "A chọrọ m ịbụ onye na-egosipụta olileanya."
"Achọghị m ka ndị mmadụ na-ele m anya dịka onye pụrụ iche."








