Inequality in Nigeria: Ụzọ ise Naịjirịa ka sị na-akpagbu ụmụnwaanyị
Ụzọ ise nwaanyị na-erughị ka nwoke na Naijiria
Azeezat Olaoluwa,Women's Affairs Journalist, West Africa

Ebe foto si, Getty Images
Nchọpụta nke otu UN (United Nations) wepụtara n'ụbọchị Tọzde kwuru na pasent 90 mmadụ nọ n'ụwa nwere echiche na megide ụmụnwaanyị na-agbanyeghị mbọ niile a na-agba ibelata enweghị nhatanha dị na-etiti nwoke na nwaanyị.
Ụmụnwaanyị bụ ọkara mmadụ niile nọ n'ụwa, ihe nke a pụtara bụ na ha nwekwara ọkara ụkpụrụ ọganihu.
Na Naijria, ụmụnwaanyị bụ pasent 49 ọnụọgụgụ ndị mmadụ, dịka ọ dị na mba ndị ọzọ, ha na ụmụnwoke enweghị ikike nhatanha.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Lee ụzọ ụfọdụ ebe ikike ụmụnwaanyị Naijria erughị ka nke ụmụnwoke:
1. Ikike dịka nwamaala
Section 26 (2) (a) nke Iwu Naijiria nke afọ 1999 nyere nwaanyị lụụ onye Naijiria ikike ịbụ nwaamala mana o nyeghị nwoke mba ọzọ lụrụ nwaanyị Naijiria ikike ịbụ nwa afọ
Ọtụtụ na-ekwu na nke a bụ ịnapụ nwaanyị ikike enyere ụmụnwoke nke bụ nkewa megide nwaanyị n'ihi nwaanyị ọ bụ.
Iwu mba ọbụla megidere nwoke maọbụ nwaanyị maka ịbụ nwoke maọbụ nwaanyị megidere mkpebi 'CEDAW' (Convention on the Elimination of All Forms of Discrimination against Women) nke kwuru na obodo kwesịrị inye onye ọbụla nwoke maọbụ nwaanyị ikike ịbụ nwaamala. Ndị nkewa metụtara na-ajụ ihe mere e ji eme ya ka onye ọbịa n'ala nna ha. Ha kwuru na ụdị ikpa oke na-ebute mkpagbu.
Otu onye Ụlọomeiwu Nta bụ Akin Alabi na-agba mbọ ugbua ka a gbanwee iwu ahụ nke a gụpụtarala nke mbụ n'abalị 27 nke ọnwa Februwarị.
2. Alụm dị nwata

Ebe foto si, NTA
Naijiria so n'obodo kachasị nwee alụmdi nwata n'ụwa niile.
Dịka Unicef siri kwuo, a lụpụrụ ụmụnwaanyị anọ n'ime iri tupu ha agbaa afọ iri na asatọ.
Section 29 (4) (b) nke Iwu Naijiria nke afọ 1999 dịka e siri hazigharịa ya kwuru sị, ''Nwaanyị ọbụla lụrụ di etozuola ihe e ji mmadụ eme.''
Ndị na-akwado iwu a kwuru na Iwu Ụka Alakụba ekwughị afọ ole bụ afọ a ga-akpọ na 'nwaanyị etozuola ihe e ji mmadụ eme' ma a bịa n'okwu ịlụ nwaanyị.
Ya mere, dịka nwa nwoke na-etinye uchu na igụ akwụkwọ na ịma ihe ụwa na-akọ, nwa nwaanyị na-etinye anya na ịlụ di, ebe e nwere ike ịkwụsị ya akwụkwọ ma ihe siere ezinaụlọ ya ike maọbụ e were ozi ụlọ na-ezika ya ahụ
Iwu Ikike dịri nwata (Child Right Act, 2003) mere ịlụpụ nwata di ka ọ bụrụ ihe megidere iwu ma mee ka afọ 18 bụrụ afọ nwaanyị tozuru ịlụ di.
Mana dịka Unicef siri kọwaa, steeti 11 na Ugwu Awusa ebinyebeghị aka n'iwu ahụ.
Iwu Ikike Dịri Nwata (Child Right Act, 2003) ezughị oke na ichekwa ụmụaka n'ihi na o megidere Iwu Naijiria.
3. Igba mkpe/Ajadu
A na-ewe ụmụnwaanyị dịka akụ di ha, ya mere a na-atụ anya nrube isi n'aka nwaanyị nye di ya na ndụ nakwa n'ọnwụ.
Ndị obodo na-emegbu nwaanyị di ya nwụrụ.
N'akụkụ ụfọdụ na Naijiria, nwaanyị di ya nwụrụ bụ onye mbụ a na-enyo n'aka ya dị n'ọnwụ di ya, a na-emekwa ka ọ gabiga ọtụtụ omenala na-agbawa obi iji gosi n'aka ya dị ọcha.
A na-akpụ ya isi, mee ka o yiri akwa ojii oge ọ na-eru ụjụ, ebe n'akụkọ ụfọdụ ezianaụlọ di nwaanyị na-awakpo ya n'ike oge iru ụjụ.
Mana nwoke ụmụnye ya nwụru a na-atụ anya na ọ gaghị ebe akwa n'ọha maọbụ gosi na ọnwụ ahụ wutere ya n'ụzọ ọbụla dịka di bu ụlọ.
4. I were ụlọobibi(Tenancy)

Ebe foto si, Getty Images
Inweta ụlọobibi bụ nnukwu ọrụ nye ụmụagbọghọ na-alụbeghị di n'ọtụtụ ebe n'ala Naijiria dịka ndị nwe ụlọ anaghị ekwe enye ha ụlọ n'ebubo na anya edoghị ha maọbụ na ha agaghị akwụli ụgwọ ụlọ.
Ihe ndị nwe ụlọ ji akpa ụdị agwa bụ nghọta ha na nwaanyị alụbeghị di ekwesịghị ibiri onwe ya.
Otu nwaagbọghọ aha ya bụ Olufunmilola Ogungbile gwara BBC na"Pasent 99 ndị nwe ụlọ m zutere ekweghị enye mụ ụlọ n'ihi na m alụbeghị di."
Ha ga-asị gị: "Kpota enyi gị nwoke maọbụ di gị."
Nke mere ka ọtụtụ ụmụnwaanyi na-akpọro nwoke aga ma ha na-achọ ụlọ.
5. Nhazi ọnụọgụgụ ụmụ ole mmadụ ga-amụ

Ebe foto si, Getty Images
Nwaanyị enweghị ikike dịka ụmụnwoke so na ihe na-ebute ọgbattuhie na okwu nhazi nwa ole mmadụ ga-amụ na Naij9iria.
Ọ bụ ihe mere na ụmụnwaanyị anaghị etinye anya na nhazi ga-enyere ha aka ma ọbụrụ na ha anataghị ikike.
Naanị pasent ụmụnwaanyị 13 ndị dị agbata afọ 15 rue 49 na-eme nhazi ọmụmụ nwa.
Nchọpụta gosiri n'ebe ụfọdụ, ọ kachasị n'Ugwu Awụsa, ụmụnwaanyị anaghị emenwu nhazi ọmụmụ nwa na-ataghị di ha ikike.
Ụfọdụ ụmụnwoke na-ekwu mgbe ụfọdụ na-ajụghị nwunye ha ajụ, ma ha-enwe nhazi ọmụmụ nwa.
Odeakwụkwọ Ukwu otu United nations bụ Antonio Guterres, kwụrụ sị, ''Ọnọdụ ụmụnwaanyị enweghị ikike dịka ndị nwoke kwesịrị ịna-eme anyị niile ihere. n'ihi na ọ bụghị naanị na okwesịghị ekwesị, ọbụ ihe iberibe. Ọ bụ naanị na ụmụnwaanyị sonye n'ụzọ zuru oke n'ihe ndị nwoke na-eme ka anyị ga-erite uru na amamihe ha n'ihe ha mụtarala na ndụ."
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2














