Imo State: Kedụ etu atụmatụ 'Treasury Single account (TSA) Imo ga-esi rụọ ọrụ?

Ndị mmadụ na-ekwu etu inwe ndị nnọchịteanya otu pati dị iche iche n'ụlọomeiwu Imo steeti ga-esi emetụta nkwekọrịta n'ọchịchị Emeka Ihedioha.

Ebe foto si, Dịka okwe sị nwe gba maka ndị ahọpụtara ị ga ụlọme

Otu onye so na kọmiti hibere Treasury Single Account (TSA) n'Imo steeti bụ Bongo Adi ekwuola na "atụmatụ TSA ga-enye aka igbochie mpụ na ohi ego steeti Imo.

Ụbọchị Wenezde gọvanọ Imo bụ Emeka Ihedioha wepụtara iwu ọkụ a kpọrọ TSA nke bụ usoro nhazi ego steeti ga-eme ka ego steeti ahụ niile nọrọ n'otu akaraọba ego.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Adi kọwara na kama itinye ego steeti n'akaraọba ego dị icheiche, itinye ya n'otu ebe ga-enye aka ka anya ruo ya otu mgbe.

Mgbe a jụrụ ya ma ya bụ atụmatụ a ga-enweta nsogbu n'ọrụ n'Imo steeti, Adi zara na, "o nweghị nsogbu ọbụla ọ ga-ebute kama ọ ga-enye aka gbochie mpụ na ohi nke dị gbanyụ na gọọmenti pụrụ apụ".

O kwetara na o nwere ike iseghachi ọrụ azụ nwantii, mana "ọka mma karịa ịhapụ mpụ na ohi ka ochie eze na steeti ahụ".

Adiị gbakwụnyere na "nke a ga-abara ọhanaeze ndị Imo uru ma gosikwa na gọọmenti a chọrọ ịkwụwa aka ha ọtọ n'ọchịchị ha".

Bongo Adi

Ebe foto si, Bongo Adi

Nkọwa foto, Bongo Adi, onye ọkammụta n'ihe gbasara akụnaụba bụ onye

Site na nke a, gọọmentị ga na- esite ụlọakụ ezipụ ego ọbụla, kama inye ego n'aka n'aka.

Onye ọkammụta n'ihe gbasara akụnaụba gbara ama na a ga-etinye akaraoba ego a n'aka ụlọakụ ukwu nke Naịjirịa bụ 'Central Bank' bụ ndị ga-elekọta ya anya.

Adi onye bụ onye nkuzi na mahadum ama ama bụ Lagos Business School kwuru na ndị mba ndị ọzọ mepere anya na-etinye ya bụ TSA n'ọrụ kemgbe ụwa.

Uru dị na TSA

  • TSA ga-eme ka ibi ego belata na steeti ehibere ya,
  • Ọ ga-enye aka ka usoro mkpata na mwefu akụ nke steeti ahụ "kwụru ọtọ", ka aghọghọ ghara ị bata na ya.
  • Ọ na-enye aka ka gọmenti mara ebe ego ha gara.
  • Ọnaghị ekwe ndị ministri meepe akaraọbaego dị icheiche.
  • O na-eme ka mpụ na ohi beleta na gọmenti
  • Ọnweghị ego ga-esi n'akpa gọmenti pụọ ka ha ghara ịma.

gbatauhie so TSA

Adi sị na ọ bụ eziokwu na atụmatụ 'TSA' bara ọtụtụ uru mana ọ na-eme ka iwepụta ego n'akpa gọọmentị sitụọ ike maka na ọ ga-eso usoro nke ga-eme ka akwụkwọ sị n'aka fere aka were ruo ndị mmadụ aka.

Aha onyonyo, Bongo Adi :Ihe 'Africa Free Trade Agreement' pụtara

N'Imo steeti

Ọrụ a nyere anyị aka ịchọpụta na Imo steeti nwere akaraọbaego dị ọtụtụ nke mmadụ amachaghị.

Adi sị na "ego di na ụfọdụ akaraọba ego a, ebe ụfọdụ tọgbọ chakoo. Ọtụtụ akaraọbaego ndị a anwụọla agbanyeghị n'ego dịcha na ha."

Lee ihe nkiri ebe a

Aha onyonyo, Widowhood in Nigeria: Etu m si gbalahụ mkpagbu a na-akpagbu ndị di ha nwụrụ

Akụkọ ga-amasị gị