Rochas Okorocha: Ihe 'Ministry of Happiness' ga-emere ụmụ Naịjirịa

Ebe foto si, Facebook/Rochas Okorocha
Senatọ na-anọchịte anya mpaghara Ọdịda Anyanwụ Imo steeti bụ Rochas Okorocha ekwuola na ọ bụrụ na gọọmenti etiti mepee Ministrị na-ahụ maka obi anụrị, ndị na-ewere ndụ ha ga-ebelata.
Ọnụ na-ekwuchitere Okorocha bụ Sam Onwuemeodo gwara BBC na ọ bụrụkwa na gọọmenti etiti machie orire na ọzụzụ ọgwụ ọtapịapịa a kpọrọ 'Sniper', ọ ga-enye aka.
Onwuemeodo kwuru na mgbe Rochas Okorocha chiri Imo steeti, mmepe ministry na-ahụ maka ikpa obi anụrị nyere aka ịkwụsị ndị mmadụ iwere ndụ ha.
Ihe ise emere na 'Ministry of Hapinness' n'Imo steeti
Onwuemeodo gụpụtara ihe ndị a dịka ihe a na-eme na mịnistrị ikpa obi anụrị Okorocha hibere n'Imo.
- Mkparịtaụka ndụmọdụ
- Enyemaka gụnyere ego
- Nkuzi pụrụ iche gbasara etu e si emepụta ihe
- Igbosa ọgụ
N'ọnụ ya, "ihe ndị a ga-enye aka imelata etu ndị mmadụ si ewere ndụ ha".
O kwuru na ihe mere ndị mmadụ ji ewere ndụ ha ọtụtụ mgbe bụ maka ha enweghị onye ha ga-akọsara mkpa ha.
Cheta na ndị sineti Naịjirịa kpọrọ oku ka gọọmenti etiti machie orire na ọzụzụ ọtapịapịa a kpọrọ 'Sniper' maka etu ndị ntorobia si ejikarị ya egbu onwe ha.
Mbọ niile anyị gbara ka anyị nụta n'ọnụ ụfọdụ sinetọ kpọrọ oku ahụ kpụrụ n'ala.









