Elisabeth Ndubuisi Chukwu: Gọọmenti etiti gwa anyị ihe gburu nwanne anyị

Aha nkeananụānụ, Elisabeth Ndubuisi Chukwu: "Gọọmenti South Afirika gbachiri nkiti maka ọnwụ nwanne anyị"

Ndị be Elizabeth Ndubuisi Chukwu nwụrụ n'ụlọ oriri na nkwari na mba Sawụt Afrịka arịọla gọọmenti etiti Naịjirịa ka ha gba mbọ chọpụta etu nwanne ha nwaanyị si nwụfuo na mba ahụ.

Chiedu Ndubuisi bụ nwanne ya nwoke gwara BBC Igbo na onye nnọchiteanya obodo Naịjirịa na Sawụt Afirịka gwara ya na nyocha ozu ndị dịbia bekee mere na-egosi na-atọgburu nwanne ha nwaanyị.

Ndubuisi kwuru na ọ bụ ada ya nwaanyị nọ na Sawụt Afịrịka agụ akwụkwọ ka nwanne ya hụrụ anya ikpeazụ tupu ọnwọ makana ọ gara n'ụbọchị fotere ubọchị ọ nwụrụ ga leta ya.

O kwuru na ruo ugbua, ahụ ọ majiji ka na-ama ada ya ahụ.

Ndubuisi kwuru na nwanne ha nwaanyị nuru di mana ya na dị ya ebighịzi tupu ọ laa mmụọ. Ọ mụtara otu nwa.

O kwuru na ka ọ dị ugbua, onye nnọchiteanya Naịjirịa na Sawụt Afrika na-ekwu na ndị uweojii na mba ahụ apụtabeghị bia were ihe nkiri 'CCTV' gosiri etu ọnwụ nwanne ya si mee.

Ndubuisi kwuru na Elizabeth Chukwu bụ otu nwanne ya bụ ọpụrụiche maka etu o si emete ihe ọfụma.

Akụkọ ndị ga-amasị gị