Madagascar vs DR Congo: Madagascar ewerela mpi sụkpọọ DR Congo anya
Akụkọ dị mkpa:
Madagaska agbapụla DR Congo

Ebe foto si, Getty Images
Madagaska ji Penariti ọkpụ anọ asatara abụọ merie DR Congo iji tozuo oke n'agba anọ nke ikpeazụ asọmpi Total AFCON 2019.
Asọmpi ha chịị ezigbo ọkụ dịka mba abụọ a nyeritara onwe ha goolu abụọ abụọ ma kwechiti rue n'ogogo ịgba penariti.
Madagaska nyere goolu ha na nkeji 9 site naka Ibrahim Amada nakw na nkeji 77 site n'aka Faneva Andriatsima.
Na nkeji 21 Cedric Bakambu nyeere ndị DR Congo goolu mbụ ebe Chancel Mbemba mezuru ya abụọ na nkeji 90.
N'ogogo Penariti, Madagaska nyere goolu anọ ma gbapụ DR Congo nyetara naanị goolu abụọ.
Ụmụnwaanyị anabataghị arịrịọ Sịnetọ Abbo

Ebe foto si, Elisha Abbo /Facebook
Otu jikọtara ụmụnwaanyị nke ngalaba Abuja akpọọla ekwe nkụ na ha anabataghị arịrịọ Sịnatọ Elisha Abbo rịọrọ maka ịma nwaanyị aka ntị.
Ụmụnwaanyị a sị ka ama sịnetọ a ikpe ma taa ya ahụhụ ruru ya iji kuziere ndị ọzọ ihe.
Na mba Ịran

Ebe foto si, EPA
Mba Ịran ekwuola na ha ga-enupuisi n'iwu na-achịkwa iji Uranium emepụtN'a ngwaagha nuklịa nke ha na mba Yorupe tinyere aka na ya n'afọ 2015.
Mịnịsta na-ahụ maka mba ndị ọzọ bụ Abbas Araqchi sị na ha chọrọ ichebe iwu a mana mba Yurope achọghị imezu nkwa ha kwere.
N'egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
Ndị egwu bọọlụ ụmụnwanyị nke mba Amerịka emeela ndị ogbo ha nke mba Netherlands taa kpuchie ọnụ n'asọmpi nke ikpeazụ Iko Mbaụwa taa.
Amerịka ji ọkpụ goolu abụọ asataghị asata wee menyụọ ndị Netherlands anya ma maburu ya bụ iko.
Uloma na ụlọikpe

Ebe foto si, Uloma Nwosu/Instagram
Nke na-akpọtụ n'Imo steeti taa bụ na Uloma Nwosu bụ nwa Rochas Okorocha nke Uche Nwosu na-alụ akpụpụla Gọvanọ Imo steeti bụ Emeka Ihedioha na ndị ọzọ ụlọikpe.
Uloma na-ebo ha ebubo iji ike tikaa ụlọahịa ya akpọrọ House of Freeda ma buru ngwaahịa ya. O sị na ha ga-akwụ ya ijeri naịra ise n'ụma.
Buhari n'AfCFTA

Ebe foto si, @MBuhari
Taa, atụrụ anya na onyeisiala Mohammadu Buharị ga-etinye aka n'akwụkwọ maka ihibe ogige azụmahịa nke mba Africa.
Buhari nọ na Niger Republic ugbua ebe onye nnọchita anya obodo ahụ na Naịjịrịa bụ Attahiru Dahiru kelere Buhari maka ihe onyinye o nyere ha maka ikpokọba ya bụ ọgbakọ.
Buhari bunyere Niger Republic ụgbọala iri anọ na asaa nakwa ngwaagha di iche iche bụ nke ga-enye aka ka ha hazie ya bụ ọgbakọ n'udo.
Ọgbajuo dọrọ na Lampedusa, Italy

Ebe foto si, EPA
Ụmụibe, ụgbọmmiri bu ndị njem gbara ọsọndụ akachiela ntị kwụsị na ọdọmmiri nke Italy agbanyeghị mmachị amachiri ha.
Otu awa ọ kwụsịchara ebe ahụ ụbọchị Satọde, ọnwebeghị onye ekwere tụọ ụkwụ n'ala n'ime mmadụ iri anọ na otu ya bụ ụgbọ bu.
Ndị uweojii achọrọ ịbọ Abbo?

Ndị uweojii n'Abuja ekwuola na ha nwere ike ịkpọpụ Elisha Abbo ụlọikpe n'izu a maka akantị ọ mara nwaanyị kụ nwa n'aka.
Ụlọomeiwu ukwu hibere kọmiti ga-enyọnye anya n'akparamagwa ya bụ nwoke nke Sam egwu nọ n'isi ya
Afcon, ndị n'ọchị ndị n'akwa

Ebe foto si, European Photopress Agency
N'egwuregwu, Naịjirịa enwerela ọkpụ atọ asatara abụọ merie kamerun n'iko Afcon agbara n'Ijipt ụbọchị Satọde.
N'otu aka ahụ Saọt Afrika ji otu ọkpụ chụpụ mba Ijipt na ya bụ asọmpi.











