Nigeria vs Cameroon: Naijiria egosila kameroon na Surugede abụghị egwu ụmụaka

Ebe foto si, Getty Images
Super Eagles nke Naịjirịa ezila ndị Indomitable Lions nke Kameroon ihe ọkụ ji ntị oke e me site n'iji ọkpụ goolu atọ asatara abụọ merie ha n'asọmpi Iko Afrịca.
Kameroon gbara mbọ ha niile mana Naịjirịa kwechiri ka ajọ ọnwụ rue mgbe asọmpi a gwụrụ.
N'ime nkeji 20 Odion Ighalo nke Naịjirịa wụnyere otu ọkpụ goolu iji sị ndị Kameroon 'unu abịala?'
Agbanyeghi nke a, Kameroon na-akwanye Naịjirịa ọkụ n'ike nke mere ha ji saa goolu a site na goolu Stephane Bahoken nyere na nkeji 41.
N'ime nkeji atọ nke a mechara, Kameroon sụnyere ọkpụ goolu ọzọ site n'aka Clinton N'Jie na nkeji 44.
N'ọkara nke abụọ n'ime asọmpi a, Kameroon malitekwara ịcha Naịjirịa ọkụ di egwu dịka ha ka jiri bọọlụ n'ụkwụ karịa Naịjirịa.

Ebe foto si, Getty Images
N'ime nke 64 Naịjirịa biliri n'ụra site na goolu Odion Ighalo nyere nke mere ya ọkpụ abụọ abụọ.
N'erughi nkeji atọ, Naịjirịa mezuru ọkpụ atọ ha site n'aka Alex Iwuobi na nkeji 66.
Naịjirịa etozuo oke n'agba anọ nke ikpeazụ asọmpi Total AFCON 2019.
Onyeisiala Muhammadu Buhari e keelala ndị Super Eagle na mmeri ha meriri Kameroon.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
N'otu aka ahụ Atiku Abubakar kelekwara ha:
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2











