Women's World Cup 2019: Ụmụnwaanyị Amerịka ebuliela iko Mbaụwa nke ugboro anọ

Ebe foto si, Getty Images
Ndị egwu bọọlụ ụmụnwanyị nke mba Amerịka emeela ndị ogbo ha nke mba Netherlands taa kpuchie ọnụ n'asọmpi nke ikpeazụ Iko Mbaụwa taa.
Amerịka ji ọkpụ goolu abụọ asataghị asata wee menyụọ ndị Netherlands anya ma maburu ya bụ iko.
Ọkpụ goolu gaara akarị akarị ma ewepu onye oche goolu ndị Netherlands onye gosiri na ọ bụ agụ nwanyị n'ezie.
Mana na nkeji 61, ndị Amerịka nwetara penariti nke onye ndu ha bu Megan Rapinoe gbakpuru wee kọwaara ndị Netherlands na-egwu apụọla na nke achị ụtaba n'aka agba.

Ebe foto si, Getty Images
Rapinoe onye gbara afọ iri atọ na anọ bụ nwanyị kacha bụrụ okenye nke nyerela goolu n'asọmpi Iko Mbaụwa ụmunwanyị
Na nkeji 69, Rose Lavelle mezuru ya ọkpụ abụọ, nke bụ goolu nke atọ ọ na-enye n'asọmpi nke afo a.

Ebe foto si, Getty Images
Mmeri a egosila na mba Amerịka bụ ọkaibe ma a bịa n'egwuregwu bọọlụ ụmụnwanyị.
Nke a bụ ya ugboro anọ ha na-eturu ugo na ya bụ asọmpi kemgbe amalitere ya n'afọ 1991.
Nke gụnyere 1991, 1999, 2015 na 2019.
Akụkọ ga-amasị gị:










