Women's World Cup 2019: Afrịka, ka emesia

Ebe foto si, Getty Images
Ndị mba Inglandị e jiri la okpụ gool atọ asataghị ma otu were memilaa olileanya ndi Afrịka nwere mgbe ha na Cameroon zutere n'ubochị taa.
Kamerun ji nkata kporo goolu a n'aka Houghton na nkeji 14, White na nkeji 45+4 nakwa Greenwood na nkeji 58.
Kamerun nwara ike ha ịsata goolu ndị a mana ọ mịtaghị mkpụrụ.
Otu abụọ a zutere onwe ha na Valenciennes i ji mara ndị ga abanye agba nke atọ na asọmpị a.
Cheta kwa na ndị otu egwuregwu Cameroon nyere otu gool ma VAR kagburu ya si na ọ bụ 'Off side' .
Mmmeri mba Ingland meriri Cameroon agbapụla mba Afrịka niile kpọm kwem n'asọmpị iko Mbaụwa ụmụnwaanyị.









