Lesley Nneka Arimah: Nwaafọ Naịjirịa eritela ntuurugo Caine nke 2019

Lesley Nneka Arimah

Ebe foto si, Lesley Nneka Arimah

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Lesley Nneka Arimah abụrụla onye Naịjirịa nke isii ga-erite nturuugo Caine maka ide akwụkwọ nke Afrịka.

Akwụkwọ ya a kpọrọ "Skinned" mere ka ọ bụrụ onye meriri n'ime mmadụ ise a họpụtara maka nke afọ 2019, gụnyere nwaafọ Igbo ọzọ bụ Tochukwu Emmanuel Okafor.

Aha onyonyo, Chimamanda akọwapụtala onye "feministị" bụ

Maka mmeri ya, o ritere puku paụnd iri (£10,000).

E biputara akụkọ ya n'akwụkwọ mgbasaozi a kpọrọ "McSweeney's Quarterly Concern (Issue 53)".

Ndị Caine gosiri foto ya ka o merichara n'elu Twitter ha.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Onye bụkwanụ Lesley Nneka Arimah?

Arimah bụ nwaafọ Igbo a mụrụ na mba Briten ma nọrọ na Naịjiria nakwa mba ndị ọzọ nna ya rụrụ ọrụ tolite.

Aha onyonyo, Mkparịta ụka BBC Igbo na Ikeogu Oke

A mụrụ ya n'afọ 1983, nke bụ na ọ dị afọ iri atọ na isii (36) mgbe o ritere ihe nturuugo Caine a.

O bi na Las Vegas dị n'Amerịka ugbua.

Aha onyonyo, Ihe Okey Ndibe kwuru maka Biafra

Dịka o tinyere n'elu websaịtị ya, akụkọ ya agbaala n'elu akwụkwọ ndị mgbasaozi dịka New Yorker, Harper's, nakwa GRANTA.

Ihe ndị ọzọ o riterela bụ ihe nrite "National Magazine" na otu nke si n'aka O.Henry.

Ndị Naịjirịa ọzọ riterela nturuugo Caine

  • Tope Folarin - afọ 2013
  • Rotimi Babatunde - 2012
  • E.C Osondu - 2009
  • Segun Afolabi - 2005
  • Helon Habila - 2001

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Toni Kan bụ onye ode akwụkwọ ọnụ na-eru n'okwu